Ntuliaka 2027: E yigharịala oge pati dị iche iche ga-eji nye Inec ndekọ aha ndị ga-azọrọ ha ọkwa

Nchịkọta akụkọ ndị mere n'izu a

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chinonso Ugorji, Michael Ngene, Michael Ilediagu, Marvelous Obomanu, Ikechukwu Kalu, Uche Akolisa, Uzoamaka Ewuzie, Adline Okere

  1. Ọkụ agbaala ogige nchekwa ọgwụ mịnịstrị ahụike Ebonyi Steeti

    Ụlọ ahụ gbara ọkụ

    Ebe foto si, Lucy Anyim, PRO Ebonyi State Ministry of Health

    Akụkọ ekwuola na ọkụ agbaal ogige nchekwa ọgwụ mịnịstrị ahụike n’Ebonyi steeti ma mebie ọtụtụ ihe ego ọnụego ya ruru ọtụtụ nde naịra.

    Kọmishona na-ahụ maka ahụike na steeti ahụ bụ Dọkịnta Moses Ekuma kwuru na ogige nchekwa ọgwụ bụ ebe e dobere ọgwụ mgbochi ọrịa mmịwụ nakwa ọgwụ mgbochi ndị ọzọ.

    O kwuru na ihe ndị ọzọ dị n’ebe ahụ gbara ọkụ gụnyere igwe kọputa, akwụkwọ ihe ndekọ dị iche iche, igwe njụoyi, akwa ụlọọgwụ ha nwetara n’aka ụlọọrụ National Primary Health Care Development Authority (NPHCDA) nke e kwesiri ikesa n’okpuru ọchịchị dị iche iche nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ.

    Dọkịnta Ekuma kwuru na ọkụ ahụ dị ezi mwute ma kwuo na obi dị ya ụtọ n’ihi na enweghị onye ọbụla merụrụ ahụ n’ọkụ ahụ.

    Kọmishọna ahụ kọwara na ha amaghị ihe kpatara ọkụ ahụ ma kwuo na ọkụ latrik adịghị ebe ahụ kemgbe abalị ise gara aga.

    N’okwu ya “Ọkụ latrik adịghị ebe ahụ kemgbe abalị ise, ọzọ bụkwa na ọkụ solar anyị ji arụ ọrụ ebe ahụ adịghị mma. Anyị kpọrọ ndị ọrụ EEDC ka bịa dozie ọkụ ahụ n’abalị gara aga”.

    O mere ka o doo anya na a malitela ime nnyocha iji chọpụta ihe kpatara ọkụ ahụ ma kwuo na o nyela iwu ka e nye ụlọọrụ ndị ọkụ ahụ metụtara ogige ebe ọzọ ha ga-anọ na-arụ ọrụ dịka nnyocha ahụ na-aga n’ihu.

    N’aka nke ọzọ onyeisi ụlọọrụ na-agbayụ ọkụ na steeti ahụ bụ Frank Oka kwuru na ọkụ ahụ agbariela ọtụtụ ihe tupu ndị ọrụ erute ebe ahụ.

    Akụkọ ndị ọzọ ị ga-agụ:

    Ụgbọala ndị ọrụ na-agbayụ ọkụ bịara ebe ahụ

    Ebe foto si, Lucy Anyim, PRO Ebonyi State Ministry of Health

  2. Ntuliaka 2027: E yigharịala oge pati dị iche iche ga-eji nye Inec ndekọ aha ndị ga-azọrọ ha ọkwa

    Onye ọrụ Inec

    Ebe foto si, Getty Images

    Ụlọọrụ Independent National Electoral Commission (Inec) eyigharịala ụbọchị ikpeazụ pati dị iche iche na Naịjirịa ga-enye ha ndekọ aha ndị ọtụ ha niile dịka a na-akwado ntuliaka afọ 2027.

    Onyeisi komiiti Inec na-ahụ maka mgbasaozi bụ Mohammed Haruna kwuru nke a n’Abuja n’ozi o wepụtara n’ụbcọhị Fraịde 27 Maachị, 2026.

    O kwuru na iwu kwuru na pati niile ga-enye Inec ndekọ aha ndị otu ha niile n’ime abalị iri abụọ n’otu tupu ha mee ntuliaka ime ụlọ ha.

    Ọ gara n’ihu kwuo na Inec yigharịa ụbọchi ikpeazụ ha nyere pati dị iche iche inye ha ndekọ aha ndị otu pati n’ụbọchị Tuzde 24 Maachị 2026 dịka ha na ndịisi pati nwere mkparịtaụka n’Abuja.

    O kwuru na ụbọchị ikpeazụ ha nyere bụ Ọnwa Eprel 1 ruo Eprel 21 mana ka ọ dị ugbua, Inec yigharịrị ụbọchị ikpeazụ ka ọ bụrụ Eprel 23 ruo Mee 30, 2026 ma kwuo ka pati dị iche iche jiri ohere a mee ntuliaka ime ụlọ ha ma nye ha aha ndị ga-azọrọ ha ọkwa na ntuliaka 2027.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  3. Ụtụtụ ọma Igbo ndị ọma

    Anyị ji obi aṅụrị anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Satọde 28 Maachị, 2026 ahịa Nkwọ.

    Biko sọnyere anyị maka akụkọ mere n'ala Igbo, na Naịjirịa, n'Afrịka nakwa n'ụwa dum gbaa gburugburu.

    Sonyekwara anyị na Facebook, Instagram nakwa WhatsApp chanelụ maka akụkọ vidio na foto anyị ji bịa taa..

    Ndewo!

  4. Ụtalị Soludo adaala n’isi ndị ọrụ oyibo n’Anambra Steeti

    Mgbe Gọvanọ Soludo gara njem nleta n'isiụlọọrụ ndị ọrụ Bekee n'Anambra Steeti

    Ebe foto si, Anambra Broadcasting Service

    Kata kata adala n’Anambra Steeti díka Gọvanọ Chukwuma Soludo enyela iwu ka ọtụtụ ndị ọrụ Bekee na steeti ahụ kwụsịtụ ọrụ maka abịaghị ọrụ maọbụ abịaghị ọsịsọ.

    Ihe kpatara nke a bụ n’ụbọchị Tọzde 26 Maachị 2026 mgbe Gọvanọ Soludo gara njem nleta mberede n’isiụlọọrụ ndị ọrụ Bekee a kpọrọ ‘Secretariat’ dị n’Awka, ka ọ mara etu ndị a si arụ ọrụ ha.

    Ọ tụrụ Gọvanọ n’anya na mgbe o ruteren’ihe dịka elekere iri nke ụtụtụ mana ọtụtụ ndị ọrụ abịaghị ọrụ.

    Ọ gagharịrị n’ọtụtụ ebe n’ụlọọrụ ahụ wee chọpụta na ụfọdụ ndị ọrụ a ejighị ọrụ ha kpọrọ ihe.

    O nyere ndị isi ebe niile ọ gara ntuziaka ka ha depụta aha ndị niile na-abịaghị ọrụ na ndị na-abịaghị n’oge ma kwụsịtụ ha ọrụ.

    Ọtụtụ n’ime ndị ọrụ gọọmenti ahụ a gbachibidoro ụzọ, nọ n’ihu ụlọọrụ ha na-arịọ Gọvanọ ka o gee ha nti ka hakọwaa ihe mere ha ejighị bia ọrụ n’oge.

    Gọvanọ Soludo kwuru hoohaa na onye ọrụ Bekee ọbụla anọghị n’oche ya n’elekere iri kwa ụbọchị abaghị ọrụ n’Anambra Steeti..

    Dịka ọ dị ugbua a mabeghi oge ole e nyere ndị a ịkwụsịtụ ọrụ.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  5. ASUU enyela gọọmenti etiti abalị anọ iji mezuo nkwekọrịta banyere ụgwọ ọnwa ọhụrụ ha

    Foto onyeisi ASUU na njirimara otu ASUU

    Ebe foto si, ASUU/Facebook

    Otu jikọrọ ndị nkụzị mahadum na Naịjirịa bụ Academic Staff Union of Universities (ASUU) enyela gọọmenti etiti Naịjirịa abalị anọ ka jiri mezuo nkwekọrịta ụgwọ ọnwa ọhụrụ ndị otu ha na Naịjirịa niile gbaa gburugburu.

    Onyeisi ASUU bụ Ọkammụta Christopher Piwuna kwuru nke a n’ụbọchị Tọzde 26 Maachị, 2026na mmemme e mere na mahadum Sa’adu Zungur University, Yuli, Bauchi steeti.

    Ọkammụta Piwuna kwuru na ha na gọọmenti etiti nwere nkwekọrịta ụgwọ ọnwa ọhụrụ ahụ na Dismeba 2025 ma kwuo na gọọmenti kwesiri ịmalite ịkwụ ha ụgwọ ahụ n’ọnwa Jenụwarị, 2026.

    O kwuru na abalị anọ ahụ ya nyere gọọmenti malitere n’ụbọchị Tọzde 26 Maachị, 2026. Ọ kọwara na ọ bụrụ na gọọmenti ghara ịmalite ịkwụ ha ụgwọ ọnwa ọhụrụ n’ime abalị anọ ahụ ha nyere, ha ga-azaghachi gọọmenti n’ụzọ ha atụghị anya.

    Ọ gara n’ihu katọọ etu gọọmenti ji ghara imezu ihe dị n’ọtụtụ nkwekọrịta ha abụọ nwere n’oge gara aga nke mere ka ndị out ASUU gbaa abụbọọrụ ugboro ugboro.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị:

  6. Ndị be anyị, ụnụ asaala chi

    Anyị ji obi aṅụrị anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Fraịde 27 Maachị, 2026 ahịa Afọr.

    Gaa n'ihu sọnyere anyị maka akụkọ mere n'ala Igbo, na Naịjirịa, n'Afrịka nakwa n'ụwa dum gbaa gburugburu.

    Sonyekwara anyị na Facebook, Instagram nakwa WhatsApp chanelụ maka akụkọ ndị ahụ na-amasị gị.

    Ndewo!

  7. Ịran enyela ugbọmmiri anyi ikike isi n'ụzọ mmiri 'Strait of Hormuz' gafee - Praịm Minista Maleshịa

    Ịran enyela ugbọmmiri anyi ikike isi n'ụzọ mmiri 'Strait of Hormuz' gafee - Praịm Minista Maleshịa

    Ebe foto si, Getty Images

    Praịm Minista mba Maleshia bụ Anwar Ibrahim ekwuola na ndị ọrụ gọọmentị Ịran enyela ụgbọmmiri obodo ya ikike isi n'ụzọ mmiri 'Strait of Hormuz' gafee.

    O kwuru nke a na Tọzde ma sị na ya na mba Ịran, Egypt, Turkey na mba ndị ọzọ nọ na mpaghara ahụ nwere nzukọ iji nweeike inweta nkwekọrịta.

    Maleshịa esorola obodo ndi kwupụtara na ụgbọmmiri ha ga na-agafe n’ọnụụzọ mmiri a.

    South Korea, India, China na Japan bu obodo ndị ọzọ nwetara ikike isi n'ụzọ mmiri a dị mkpa gafee.

  8. Ụlọikpe enyela ikike ka a nwuchie Onyeisi otu ngalaba PDP bụ Turaki

    Ụlọikpe enyela ikike ka a nwuchie Onyeisi otu ngalaba PDP bụ Turaki

    Ebe foto si, Tanimu Turaki/X

    Ọkaikpe Peter Kekemeke nke Ụlọikpe Ukwu nke Isi Obodo enyela ikike ka a nwuchie Onyeisi otu ngalaba pati PDP bụ Tanimu Turaki.

    Ọkaikpe a wepụtara akwụkwọ ikike ahụ mgbe Turaki jụrụ ịbia n’ụlọikpe ka a gụọrọ ya ebubo ya.

    Onyeisi ndị uweojii Naịjirịa boro Turaki ebubo inye ndị uweojii ozi ụgha.

    N'ụbọchị ikpe ahụ, onye Ọkaiwu na-ekpe ikpe, bụ Usman Rabiu, sịrị na ihe a bịara n’ụlọikpe n'ụbọchị ahụ bụ ka Turaki zaa ebubo a boro ya.

    Rabiu kwuru na Turaki abịaghị n’ụlọikpe n’agbanyeghị na e nyere ya akwụkwọ ebubo nakwa akwụkwọ ọkwa ikpe, nke na-agwa ya maka usoro ikpe nke ụbọchị ahụ.

    O wee jiri ikike dị na Nkebi nke narị atọ na iri itoolu na isii, nkewa okwu nke abụọ (396(2)) nke Iwu Na-ahụ Maka Ikpe Mpụ (ACJA) nke afọ 2015 mee ihe.

    Ọkaikpe Kekemeke kwuru na dịka ọ dị n’ihe e dere n’iwu ACJA nke afọ 2015, mgbe onye a na-ebo ebubo maara na o nwere ikpe, ma jiri aka ya jụ ịbịa, iwu kwesịrị ekwesị a ga-ewepụta bụ ikike nnwuchi iji hụ na a kpọtara onye ahụ ka ọ zaa ebubo a boro ya.

    Ọkaikpe ahụ kwuru na akwụkwọ onye a na-ebo ebubo gbara iji rịọ ka a kagbuo ebubo ahụ erubeghị oge a ga-atụle ya.

    O kwukwara na a ga-atụle arịrịọ ahụ naanị mgbe onye a na-ebo ebubo zachara ebubo e boro ya.

    O wee nye iwu ka a nwuchie Turaki iji manye ya ịbịa n'ụlọikpe ma zaa ebubo ndị e boro ya.

    Ọkaikpe Peter Kekemeke mechara yigharịa ikpe ahụ ruo n'ụbọchị 22 nke ọnwa Eprel maka ịgụrụ Turaki ebubo ya.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  9. Mmadụ isii anwụọla n'ọgụ mmegwara ndị na-achị ehị lụrụ na Nasarawa Steeti

    Ọtụtụ ihe ndị a lara n'ihi mgbe ndị na-achị ehi mere mwakpo

    Ebe foto si, Maryam

    Nkọwa foto, Ọtụtụ ihe ndị a lara n'ihi mgbe ndị na-achị ehi mere mwakpo

    Ọgụ mmegwara ndi na-achị ehi lụrụ na Mararaba dị na Nasarawa Steeti egbuola mmadụ isii ma merụọ ọtụtụ ndị mmadụ ahụ

    Mwakpo ndị na-achị ehi mere n’ụbọchị Wenezde 25 Maachị 2026 na mpaghara ‘Aso di na Area A’ nọ na gburugburu ‘Jummai Estate’ bụ iji megwara maka ogbugbu e gburu otu onye na-achị ehi dị afọ iri na asaa.

    Akụkọ kwuru na onye ahụ na-achị ehi e gburu bara n’ọrụ ugbo otu nwoke aha ya bụ Sunday Adoye na-ebughị ụzọ nata ikike.

    Akụkọ kwuru na otu onye akaebe bi ebe ihe ahụ mere kọwara na nsogbu kawanyere njọ mgbe ndị bị gburugburu ebe ahụ ihe mere gbochiri ndị na-achị ehi ibuso nwoke nwe ọrụ ugbo ahụ gburu onye otu ha agha.

    Gụọ akụkọ ndị ọzọ ebe a:

    ụgbọala a kpọrọ ọkụ mgbe ndị na-achị ehị bịara ọgwụ mmegwara

    Ebe foto si, Maryam

    Nkọwa foto, ụgbọala a kpọrọ ọkụ mgbe ndị na-achị ehị bịara ọgwụ mmegwara

    Na mkparịtaụka ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Nasarawa Steeti bụ Ramhan Nansel nwere, o kwuru na akụkọ a bụ eziokwu.

    Ọ gara n’ihu kwuo na ha anwụchiela Sunday Adoye bụ onye nwe ọrụ ụgbo ahụ nakwa ndị ọzọ dịka nnyocha na-aga n’ihu.

    “Ndị uweoji natara mkpesa na aka onye ndụ ndị Fulani bụ Hardo Gidado dị n'ihe mere nụ. Nwoke ha bara n’ọrụ ugbọ ya dịka ha na ndị na-achị ehi nwere obere esomokwu, bara n’ụlọ ya, bute egbe ma gbaa otu onye n’ime ha aha ya bụ Ado Yau”

    “Ndị na-achị ehi ji iwe bịa ọgụ ma mụnye ụlọ anọ, ụgbọala abụọ, ọgbatumtum atọ ọkụ, ebe mmadụ anọ merụrụ ahụ”

    “Ọ bụ ndịagha na-eme mkpagharị bịara bịa weta udo ebe ahụ.”

  10. Ndị ọrụ ahụike emeela ngagharịiwe n'Abuja

    Ndị na-eme ngagharịiwe

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ndị na-eme ngagharịiwe

    Iwu a na-atụle ọhụrụ n’Ụlọomeiwu Naịjirịa iji kagbuo iwu hibere otu ndị ọrụ ahụike na ndị na-ahụ maka ahụike eze, nke a makwaara dịka HB 2695, enwetala mmegide siri ike site n'aka ndị ọrụ ahụike, bụ ndị mere ngagharịiwe n'Abuja n’ụbọchị Tọzde 26 Maachị 2026.

    Ndị ọrụ ahụike ji aha ‘Joint Health Sectors Unions nakwa Aseembly of Healthcare Professional Associations mere ngagharịiwe ma na-arụ aka megide iwu ọhụrụ a, na-ekwu na ya bụrụ na a hapụ ya ka ọ gaa, ọ ga-eme ka ndị ọrụ ahụike ndị ọzọ nọrọ n’okpuru otu ‘Medical and Dental Council of Nigeria’.

    Ha mere ngagharịiwe na mpaghara ‘Unity Fountain’ dịka ha ji akwụkwọ dị iche iche ha dere ihe n’ime ha.

    Gụọ akụkọ ndị ọzọ ebe a:

  11. Nnyocha mbụ anyị mere gosiri na Ikenna Onuoha gburu onwe ya - Ndị Uweojii Abia

    Nwoke yi uweọcha e ji ihe ojii kaa n'ihu ya.

    Ebe foto si, Ikenna Onuoha

    Ndị uweojii Abia Steeti ekwuola na ha na-eme nnyocha maka ọnwụ otu nwoke bụ Ikenna Onuoha bụ onye ọrụ ụlọọgwụ Federal Medical Center dị n’Umuahia, a hụrụ ozu ya n’okporoụzọ Umueziagu dị n’Amaeke Umuahia.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii a bụ Maureen Chinaka kwuru na ha ka na-eme nnyocha iji mata kpọmkwem etu ihe a si mee.

    “Nnyocha mbụ anyị mere gosiri na nwoke ahụ gburu onwe ya mana anyị ka na-eme nnyọcha ịchọpụta etu na ihe mere o jiri gbuo onwe ya.”

    Akụkọ kwuru na ihe ahụ mere n’ụbọchị Tuzde 24 Maachị, 2026.

    Chinaka kwuru na mgbe ha hụrụ ozu nwamadị ahụ, na ọfụfụ si ya n’ọnụ na-apụta kama na ha ahụghị mmerụ ahụ ọbụla n’ahụ ya.

    Ọ bụ onye ọrụ na ngalaba ebe a na-amụ nwa nakwa ịwa ahụ n’ụlọọgwụ FMC dị n’Umuahia.

    Nwamadị a lụrụ nwaanyị ma nwee obere ụmụaka, tupu ọnwụ ya.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

  12. Ụlọomeiwu Anambra Steeti akwadola akwụkwọ iwu azụmahịa iji megide ọnọdụ Sit-at-Home ma kwalite akụnaụba steeti

    Foto Onyeisi ụlọomeiwu Anambra Steeti bụ Somtochukwu Udeze

    Ebe foto si, Ministry of Information Anambra State

    Ụlọomeiwu Anambra akwadola akwụkwọ iwu ‘Market Bill 2026’ nke kwalite ọnọdụ akụnaụba steeti ahụ ma megide ọnọdụ onye apụtala ezi ‘sit-at-home’ na steeti ahụ gbaa gburugburu.

    Akwụkwọ iwu ahụ bụ nke a kwadoro n’ọgbakọ plenary ụlọomeiwu ahụ nke onyeisi ya bụ Somtochukwu Udeze nọ n’isi ya dịka ọ gafere ọgụgụ nke mbụ, nke abụọ nakwa nke atọ.

    Otu onyeomeiwu bụ Ikenna Ofodeme kwuru na akwụkwọ iwu azụmahịa ahụ bụ nke dị oke mkpa n’ihi na Anambra steeti steeti maara ihe ekwe na-akụ n’ihe banyere azụmahịa ma kwuo na e kwesiri ichekwa ya.

    O kwuru na iwu ahụ ga-echekwa ma gbochie ihe ọbụla ga-emetụta azụmahịa ọkachasị ihe dịka ọnọdụ ‘sit-at-home’ nke o kwuru na o metụtara azụmahịa na steeti ahụ nke ukwuu.

    Ọ gara n’ihu kọwaa na akwụkwọ iwu ga-ahụ na e mepụtara atụmatụ a ga-eji na-elekọta ahịa niile dị na steeti ahụ ma kwupụta ahịa ruru iri anọ na steeti ahụ bụ nke nwere nnukwu uru nye Anambra steeti.

    Ahịa ndị ahụ gụnyere Ọnịcha main market, Arịarịa, Agba Edo, Nnewi na Nkwo Umunze.

    Iwu a kwuru ka onye ahịa ọbụla n’ahịa ndị a gbapee ụlọ ahịa ụbọchị niile belusọ ụbọchị ezumike ‘public holiday’.

    Iwu ahụ nyekwara iwu ka ndịisi ụlọahịa nwee ndekọ ụlọahịa niile dị n’ogige ahịa ọbụla ma na-eme nnyocha iji hụ na ha niile na-erube isi nye iwu e nyere ma nyerekwa aka gbochie mpụ dị iche iche.

    Akwụkwọ iwu ahụ nwere ntaramahụhụ dịka ịkwụ ụgwọ maọbụ ịga ụlọ mkpọrọ nye onye ahịa ọbụla rubere isi nye iwu ọbụla na-abụghị nke gọọmenti nyere banyere azụmahịa.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị:

  13. Ndị uweojii anwụchiela otu nwoke gburu nne ya n’Ebonyi Steeti

    Foto nwoke ahụ gburu nne ya na njirmara ndị uweojii Naịjirịa

    Ebe foto si, Ebonyi State Police Command

    Ndị uweojii n’Ebonyi Steeti ekwuola na ha anwụchiela otu nwoke aha ya bụ Damian Oforbuike onye kwuru nna ya maka ntakịrị esemokwu ha abụọ nwere.

    Ọnụ na-ekwu ndị uweojii steeti ahụ Joshua Ukandu kwuru na ọdachi ahụ mere n’obodo Ohatekwe Ukawu dị n’okpuru ọchịchị Ọnịcha nke steeti ahụ.

    Ukandu kwuru na ngwangwa ndị uweojii nwetere ozi maka njinji ahụ, ha gara n’ihu ma nwụchie Damian. Ọ gbakwụnyere na a ga-akpụpụ ya n’ụlọikpe ngwangwa e mechara nnyocha.

    Ọ kọwara na nwaamadị ahụ gwara ndị uweojii ndị uweojii okwu ma kwuo na e ji ya n’ụlọọrụ ndị uweojii CID Ebonyi Steeti.

    Ndị obodo hụrụ oge ihe ahụ mere kwuru na Damian gwara nne ka ọ ga ree akpụ n’ahịa mana oge nne ya resịrị akpụ ahụ, o nyere Damian ego o retere mana o chezọrọ inye Damian akpa o ji gaa ree akpụ ahụ.

    Oge Damian jụrụ nne ya ebe akpa ahụ dị, nne ya gwara ya na o chezọrọ ya n’ahịa. Ọ bụ oge a ka Damian ji nwere mma wakpo nne ya ma gbuo ya.

    Damian gbapụrụ ọsọ ma banye n’ime ọhịa mana ndị ntorobịa obodo nwụchiri ya.

    Mana tupu ha enyefee ya n’aka ndị uweojii, ndị obodo ahụ jụrụ ya ma chụpụ ya n’obodo ha. Ha kwuru na ha achọghịzi ka ọ laghachita n’obodo ọzọ.

    Akụndị ọzọ ga-amasị gị:

  14. Trump kwuru na ọ bụ oke egwu mere mba Ịran ji achọghị ka ha na Amerịka nwee mkparịtaụka

    Foto Onyeisiala Donald Trump oge ọ na-ekwu okwu ma nwelie aka ya elu

    Ebe foto si, Getty Images

    Onyeisiala Donald Trump na-achị Amerịka ekwuola na ndịisi mba Ịran na-atụ egwu ikwu na ha na mba Amerịka chọrọ inwe mkparịtaụka udo.

    Nke a na-abịa dịka Ịran gọnarịrị na ha na Amerịka na-enwe mkparịtaụka dịka Trump kwuru na “ndị be ha ga-egbu ha ma ọ bụrụ na ha kweta”.

    N’ụbọchị Wenezde, onye ọrụ ọchịchị Ịran kwuru ihe ise a ga-eme iji kwụsị agha ahụ - nke a na-abịa dịka mba Amerịka nyere ha atụmatụ iri na ise (15) ha ji.

    Obi ọchịchị mba Amerịka kwuru na ọ bụ udo ka Onyeisiala Trump chọrọ mana ọ dịkwa njikere ịkụkasị ma ọ bụrụ na ọ daa nke ahụ.

    Mwakpo Iran na Lebanọn na-aga n’ihu dịka uruuru ogbunigwe a gbaturu n’Abu Dhabi e chere na ọ bụ Ịran tụrụ ya, gburu mmadụ abụọ.

    Nke a na-abịa dịka odeakwụkwọ nchekwa mba UK bụ John Healey kwuru na mba Rọshịa na-enye ndịagha mba Ịran ọzụzụ tupu agha ahụ amalite.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  15. E gbuola ndịagha 11 na otu onye uweojii na mwakpo ndị ojiegbe mere na Kebbi Steeti

    Ụgbọala ndịagha a gbara ọkụ na mwakpo ahụ

    Ebe foto si, Kebbi State Government House

    Akụkọ kwuru ndị ojiegbe awakpola obodo Giro Masa dị n’okpuru ọchịchị, Shanga Kebbi Steeti ma gbuo ndịagha iri na otu na otu onye uweojii.

    Gọvanọ Nasir Idris na-achị steeti ahụ kwuru na ndị omekome ahụ wakporo ndị ọrụ nchekwa nọ ọrụ n’obodo ahụ ma kwuo na nnyocha e mere chọpụtara na ndị ojiegbe ahụ n’otu ebe a na-arụ ọrụ.

    O kwuru na ndịagha nwetere ozi banyere mwakpo ndị ojiegbe chọrọ ime n'obodo ahụ nke mere ka e ziga ndịagha n'ebe ahụ mana ndịagha mechara chọpụta na ozi ahụ ha nwetere abụghị eziokwu.

    Gọvanọ Idris katọrọ mawakpo ma kwuo na ọ gara ebe mwakpo ahụ mere ma gakwaa leta ndịagha merụrụ ahụ na mwakpo ahụ.

    Akụkọ kwuru na a gbara ụgbọala ndịagha abụọ ọkụ na mwakpo ahụ, ebe ndị obodo hụrụ oge ihe mere kọwara mwute ha nke tinyere obodo ha n’oke ọgbaghara.

    Gọvanọ Idris gara n'ihu kwe nkwa inye ezinaụlọ ndị mwakpo ahụ metụtara nkwado zuru oke, kwụọ ụgwọ ụlọọgwụ ndị merụrụ ahụ ma zụtara ndịagha ụgbọala ọzọ. O mere ka o doo anya na ọ ga-arịọ ka isiụlọọrụ ndịagha Naịjirịa dị n'Abuja nye ndịagha ahụ nkwado.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti kwuru na ya agaghị ekwu ihe ọbụla banyere mwakpo ahụ maka na ọ bụ ihe metụtara ndịagha.

    Ka ọ dị ugbua, ndịagha Naịjirịa ekwubeghị ihe ọbụla banyere mwakpo ahụ.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

    Foto Gọvanọ Nasir Idris na-achị Kebbi Steeti oge ọ gara n'ebe mwakpo ahụ mere

    Ebe foto si, Kebbi State Government House

  16. Ọtụtụ ọma ndị be anyị

    Anyị ji obi aṅụrị anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Tọzde 26 Maachị, 2026 ahịa Orie.

    Gaa n'ihu sọnyere anyị maka akụkọ mere n'ala Igbo, na Naịjirịa, n'Afrịka nakwa n'ụwa dum gbaa gburugburu.

    Sonyekwara anyị na Facebook, Instagram nakwa WhatsApp chanelụ maka akụkọ ndị ahụ na-amasị gị.

    Ndewo!

  17. Trump si na ya enyela Tehran atụmatụ 15 maka ikpe udo, mana Ịran sị na Trump na-ekwuru onwe ya

    Trump si na ya enyela Tehran atụmatụ 15 maka ikpe udo, mana Ịran sị na Trump na-ekwuru onwe ya

    Kedụ ihe dị n'ime atụmatụ 15 Trump si na ya ji ekpe udo?Anyị ejibeghị anya hụ atụmatụ 15 mba Amerịka si na ha zigaara mba Ịran. O nwebeghị onye pụtara kwuo kpọmkwem ihe dị ya n'ime. Mana ndị ntaakụkọ ụfọdụ na mba Izrel na Amerịka na-ekwu maka atụmatụ a.

    Channel 12 sị na atụmatụ a gụnyere ihe ndị a ha chọrọ:

    • Ụlọọrụ ndị nuklịa dị na Natanz, Isfahan, na Fordow so na ndị ga-akwụsị ọrụ ma mebie.
    • Nnyocha na ileba anya n'ọrụ International Atomic Energy Agency (IAEA) maka ihe ndị na-eme n'Ịran
    • Ịran ga-agbahapụ iji ngwaagha eme ihe na mpaghara ahụ, ma kwụsịkwa iji ego na-akwado ndị ha na ha na-emekọrịta ihe na mpaghara ahụ
    • Ikpochapụ ikike nuklịa niile ha nwere bụ ndị mụbarala ka ọ dị ugbua
    • Ịkwụdosiike na ha agaghị agbalị imepụta ngwaagha nuklia ọzọ
    • O nweghị akụrụngwa nuklịa ọbụla a ga-amụbanye n'ala Ịran, ebe a ga-enyefe ndị nke amụbanyere n'aka IAEA.
    • Okporo Strait of Hormuz ga-eghe oghe oge niile ma mejupụta okporo mmiri anaghị akwụ ụgwọ
    • Ogbunigwe mba Ịran ga-adabere na mkpebi ndị a ga-eme n'ọdịnihu, mana ha agaghị ebu ibu, ma bụrụkwa naanị maka nchekwa onwe.

    Uru Ịran ga-erite n'atụmatụ a:

    • Enyemaka mba Amerịka n'iwulite atụmatụ nuklịa nke onwe na Bushehr maka imepụta ọkụ latrik.
    • Iwezuga ntaramahụhụ niile
    • Iwezuga ihe iyi egwu nke itighachị ntaramahụhụ

    E nwetakwara ozi na e nwereike ịkwụsị ịkwa mgbọ ga-eru otu ọnwa dịka a na-enwe mkparịtaụka, mana ihe ọzọ bụ na a chọpụtabeghị ma ozi a ọ bụ eziokwu, dịka a na-enwebeghị ozi ọbụla si n'obi ọchịchị White House.

  18. ‎Ndị uweojii Imo Steeti anwụchiela onye otu nzuzo a na-enyo enyo na Nekede, napụta ya egbe ‎

    ‎Ndị uweojii Imo Steeti anwụchiela onye otu nzuzo a na-enyo enyo na Nekede, napụta ya egbe ‎

    Ebe foto si, Imo State Police Command

    Ndị uweojii Imo Steeti na njikọaka ha na otu nchekwa Imo State Security Organization anwụchiela onye otu nzuzo a na-enyo enyo, ma napụta ya egbe.

    N’ozi o wepụtara n’ụbọchị Tuzde 24 Maachị 2026, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo Steeti bụ Henry Okoye sịrị na nke a mere na Nekede dị n’okpuru ọchịchị ime obodo Owerri West.

    Okoye kwuru na ha kpara ike ahụ site n’ozi dị ezigbo mkpa ha nwetara banyere njem ndị a na-enyo enyo na mpaghara Old Nekede Road n’ụzọ ụtụtụ Satọde 21 Maachị 2026.

    ‎Dịka o siri kwuo, ndị uweojii gbapụrụ ọsọ gaa na mpaghara ahụ ma nwuchie Bright Chidi dị afọ iri abụọ na isii (26), ma napụta ya egbe ‘single-barrel’ na otu mgbọ egbe, oge ha mara ya aka n’akpa.

    “Oge a gbara ya ajụjụ, nwaokroọbịa ahụ a na-enyo enyo kwupụtara na ya bụ onye otu nzuzo ‘Vikings’, ndị aka ha dị n’agwa mpụ dị iche iche,” ka ozi ahụ kwuru.

    Ozi ahụ kwuru na ka ọ dị ugbua, e nyefeela okwu ahụ n’aka ngalaba ndị uweojii State Criminal Investigation Department (SCID) maka ime nnyocha miri emi, dịkwa ka ndị uweojii na-agba mbọ inwuchi ndị ọzọ so n’otu ahụ.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  19. Minista na-ahụ maka ọkụ latrik arịọla ndị Naịjirịa mgbaghara, kwee nkwa ịkwalite ikike ọkụ

    Minista na-ahụ maka ọkụ latrik arịọla ndị Naịjirịa mgbaghara, kwee nkwa ịkwalite ikike ọkụ

    Ebe foto si, Getty Images

    Gọọmenti Naịjirịa arịọla ndị Naịjirịa mgbaghara maka ụkọ ọkụ latrik, ma kwee nkwa na a ga-akwalite ya n’ime ụbọchị ndị na-abịa abịa gburugburu Naịjirịa.

    Minista na-ahụ maka ikike ọkụ na Naịjirịa bụ Adebayo Adelabu kwere nkwa a n’ụbọchị Tuzde 24 Maachị 2026, oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu gbasara ịgba ndị o tiri n’ime afọ atọ gara aga.

    Adelabu kọwara na ọ bụ ụkọ gaasị a na-ebugara ụlọorụ ndị na-emepụta ọkụ butere ịmaaka a n’ihi nnukwu ego ha ji ndị na-ekesa gaasị.

    Ọ rụtụrụ aka na agha dị ugbua na mpaghara Middle East nwereike ime ka nsogbu a kawanye njọ.

    Cheta na ndị Naịjirịa na-ahụta ụkọ ọkụ latrik na nso nso a, nke mere ụmụ mmadụ ji akpọ oku ka ndị ọchịchị dozie nsogbu ahụ.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  20. Igbo bụ Igbo, ụnụ asaala chi?, Ka Eke taa ketara anyị ihe ọma ooo

    Anyị ji obi aṅụrị anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Wenezde Eke 25 Maachị, 2026.

    Gaa n'ihu sọnyere anyị maka akụkọ mere n'ala Igbo, na Naịjirịa, n'Afrịka nakwa n'ụwa dum gbaa gburugburu.

    Sonyekwara anyị na Facebook, Instagram nakwa WhatsApp chanelụ maka akụkọ ndị ahụ na-amasị gị.

    Ndewo!