Ndị ụka ámá Jehovah agbanweela iwu ha banyere mmịnye ọbara

Ebe foto si, EPA
Ndị ụka ámá Jehovah, agbanweela iwu ha banyere mmịnye ọbara iji nye ndị otu ha ohere ka ha mịpụta ọbara ha, dobe ya maka oge ọbụla ha nwere nsogbu ahụike ọbụla.
Mgbanwe a bụ nke ga-enye ndị otu ha niile ohere ka a gbanyere ha ọbara ha, - n'oge ịwa ahụ n'ụlọọgwụ, iwu ha gbochiri ndị otu ịnara ọbara onye ọzọ.
Gerrit Losch, s na ndịisi ụlọụka ahụ, kwuputara nke a ma mee ka o doo anya na "onye ụka ọbụla ga-eji aka ya kpebie etu a ga-eji jiri ọbara mee ihe n'ụlọọgwụ".
Ụka ámá Jehovah bụ otu ụka Kraịst a maara n'ụwa niile maka etu ha si eme emume ịgbasa oziọma n'ụlọ n'ụlọ. Ihe ruru mmadụ 144,000 n'UK bụ ndị ụka àmà Jehova ebe ha nwere mmadụ ruru nde itoolu n'ụwa niile.
Otu a kpebiri na ndị otu ha agaghị anabata ọbara onye ọzọ dịka ozi dị na webụsaịt siri kwu - akwụkwọ nsọ ochie na nke ọhụrụ "nyere anyị iwu ka anyị ghara ịnabata maọbụ gbanwee ọbara".
"Nkwenye anyị banyere nsọ ọbara dị agbanwebeghị", otu onye na-ekwuru otu ha kwuru nke a.
Mana ụfọdụ ndị bụbu ndị otu ahụ katọrọ nke a ma kwuo na o weghị isi ọbụla.
Mitch Melon gwara ụlọọrụ mgbasaozi LA Times: "Ọ bụrụ na otu onye ụka àmà Jehovah nwere ihe mberede ọrịa maọbụ nwatakịrị nwere ọrịa kansa kwesiri ka a gbanwee ya ọbara, mgbanwe iwu a enyeghị ya ikike ịnabata usoro ọgwụgwọ ọbụla nke gụnyere ịgbanwe ọbara".
N'ọnwa Disemba 2025, ụlọikpe dị na Edinburgh kpebiri ka ndị dọkịnta gbanwee ọbara onye ụka ámá Jehova na-eto eto ma ọ bụrụ na a ga-awa ya ahụ.
Nwatanwaanyị ahụ gwara ndị ọrụ ahụike na ọ nabataghị ka a gbanwee ọbara ya maka nkwenye ụka ya, mana ndị ọkaiwu ụlọọrụ ahụike Scotland wetere nkwado ụlọikpe iji gaa n'ihu ma ọ bụrụ na nsogbu ahụ dị oke njọ iji zọọ nwatakịrị ahụ ndụ.
Ụlọikpe nyere nkwado ahụ dịka Ọkaikpe Lady Tait kwuru na obi dị ya aṅụrị maka na nke a bụ iji zọọ ndụ nwa ahụ ma maa ọtụtụ atụ iji kwado nkwenye ya.




























