Akụkọ dị mkpa - Eprel 17, 2026
Akụkọ dị mkpa - Eprel 17, 2026
Gee ihe na-eme n'ụwa taa n'otu nkeji:
- Ọkaikpe Rita Ofili-Ajumogobia nke ụlọikpe ukwu dị n'Abuja enyela iwu ka a tọhapụ Linus Williams Ifejirika e ji Blord maara n'ọnọdụ mgbapụta a kpọrọ 'bail' n'olu bekee.
- Nke a na-abịa dịka Blord wuchiri n'ụlọikpe make ikpe dị n'etiti ya na Martins Vincent Otse e ji VeryDarkMan maara maka ebubo imetọ aha ya.
- Ndị ọkaiwu Blord debatara akwụkwọ n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Eprelụ na-arịọ ụlọikpe ka ọ tọhapụ Blord ka o si n'ụlọ na-abịa n'ụlọikpe azara ọnụ ya.
- Izrel na Lebanọn enweela nkwekọrịta ịkwụsị ịkwa mgbọ ga-anọ abalị iri.
- Nke a na-abịa dịka agha dị n'etiti Ịran na Lebanọn gburu mmadụ puku abụọ kemgbe ọ malitere n'izuụka isii gara aga.
- Onyeisiala Trump kọwara nkwekọrịta a dịka nke dị oke mkpa ma kwuo na mba Amerịka na Ịran na-agba mbọ inwe nkwekọrịta udo iji weta agha na njedebe.
Soyere anyị na websaịtị, Instagram, Facebook na WhatsApp chanelụ maka akụkọ niile na-eme n'ụwa.






