Ihe mere m ji lụnye Aboy nwunye - Eze Chibuzor Gift Chinyere
- Onye dere ya, Chinonso Ugorji
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Onye dere ya, Ikechukwu Kalu
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
- Onye dere ya, Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
Onye ụkọchụkwu hiwere ụlọụka Omega Power Ministry bụ Eze Chibuzo Gift Chinyere akọwaala ihe mere o ji lụnye otu n'ime ụmụaka ndị ọ na-azụ nwunye na nso nso a.
Oge ya na BBC News Igbo nwere mkparịtaụka pụrụiche, Ụkọchukwu Chibuzo Gift Chinyere kọwara na nwa ahụ aha ya bụ Aboy Elijah Chibuzo nwere akwara ike, nke pụtara na aramara na-agụ ya mgbe niile.
Ọ kọwara na ọ bụ ọnọdụ a mere o jiri kpọpụta Aboy ebe ọ na-aga akwụkwọ, n'ihi na ọ na-eyija ụmụaka ndị nwaanyị ha na ya nọ n'ụlọakwụkwọ, ma na-egosi ha amụ ya mgbe niile.
"Dịka ọ na-etolite, amụ ya a na-eto ogologo. Oge ụfọdụ, ọ na-ewepụta amụ ya ma ọ kwụrụ ọtọ, ọkachasị oge m nwere ndị ọbịa. Aramara na-agụ ya nke ukwuu. Anyị ekpeela ekpere, mee ihe niile anyị pụrụ ime, wee sịzie na ọ dị ka anyị ga-alụtara ya nwaanyị," ka Pastor Chibuzo kọọrọ anyị.
Dịka o siri kwuo, onye ọ lụnyere Aboy bụ nwaanyị ajadu nwere ụmụ atọ, ma bụrụkwa onye ụkọchukwu.
"Ọ bụ n'ihi ya ka m jiri maa ọkwa ahụ n'ụlọụka sị onye ga-alụ [Aboy] ga-anata ụgwọọnwa ruo ụbọchị ọ ga-anwụ tinyekwara na m ga-azụtara onye ahụ ụlọ. Otu nwaanyị ajadu bụ ụkọchukwu, onye nwere ụmụ atọ sị na ya ga-alụ [Aboy]."
Ụkọchukwu Chibuzo Gift Chinyere kọwara na kemgbe Aboy lụrụ nwaanyị, ọ na-ejizi aka ya eri ihe, maka na oge mbụ, ọ naghị enyenwu onwe ya nri.
O kwukwara na aramara ahụ na-agụ Aboy n'oge mbụ akwụsịla dịka ọ na-anọziri onwe ya ugbua.
Ụkọchukwu Chibuzo Gift Chinyere kwuru na Aboy bụ nwa a gbahapụrụ n'ọnụụzọ ya oge ọ dị obere, onye o mechara kpọrọ ma zụọ.
"Aha ya bụ Aboy mana agbanweela m aha ya ka ọ bụrụzie Elijah Aboy Chibuzo, maka na amaghị m aha ya. Ya onwe ya na-arịa 'autism'. Ọ naghị ekwu okwu, ọ naghị ejikwa ike anụ ihe, ewezuga ma i ji aka tụziere ya".
"Oge a kpọọrọ ya gaa n'ụlọ ụmụ na-enweghị nne, ha jụrụ ịnabata ya, ndị uweojii akpọghachitere m ya, m nabata ya. Ọ na-anyụ onwe ya nsị n'ahụ, nke mere anyị ji kpọtaara ya onye nlekọta," ka Ụkọchukwu Chibuzo Kọwara.



