Nsị gị nwereike inye gị ọkụ latrik - Ikechukwu Obioma

Aha onyonyo, Nsị gị nwereike inye gị ọkụ latrik - Ikechukwu Obioma
Nsị gị nwereike inye gị ọkụ latrik - Ikechukwu Obioma
    • Onye dere ya, Chinonso Ugorji
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
    • Onye dere ya, Donald Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist

Onye ọkachamara na-ahụ maka iji ureghure emepụta gaasị, a kpọrọ biogas n'asụsụ Bekee bụ Prince Ikechukwu Obioma, akọwaala etu mmadụ nwereike isi mepụta ọkụ latrik site na nsị nakwa ureghure dị iche iche.

Na mkparịtaụka pụrụiche ya na BBC Igbo nwere, Ikechukwu Obioma kwuru na ọ bụghị naanị gaasị e ji esi nri ka a na-enweta site na biogas, kama ọ na-enyekwa ọkụ latrik.

Dịka nwaafọ Imo Steeti ahụ siri kwuo, a na-etinye gaasị si n'ureghure pụta n'igwe ọkụ ka o nweeike na-enye ọkụ n'ụlọ, ma na-enyekwa ọkụ n'ihe ndị ọzọ e ji eme ihe n'ụlọ.

"Anyị na-agbanwe igwe ọkụ nke ị maara, ma tinye ya ihe ga-eme ka o jiri biogas na-enye ọkụ," ka Obioma kwuru.

Prince Ikechukwu Obioma kwuru na ya na-arụ biogas n'ogogo dị iche iche. O kwuru na nke obere nwereike inye ụlọ mmadụ ọkụ latrik ihe ruru awa itoolu maọbụ iri kwa ụbọchị, mana ọ bụrụ maka isi nri, ọ ga-enye gaasị oge ọbụla a chọrọ ya.

Maazị Obioma kwuru na ihe kpaliri mmụọ ya ịga mụọ ọrụ biogas bụ ihe ọ hụrụ na soshal midịa, ebe ndị mmadụ na-eme ya na mba Kenya.

"Agara m mba Kenya mụọ ya, ma lọghachi na mba anyị na-arụrụ ya ndị mmadụ. Biogas abụghị ihe e jiri ike mara, maka na ndị obodo anyị ka na-ahụta ya dịka ihe ọgbara ọhụrụ".

O kwuru na ya ka na-agbasa ozi gbasara ya, dịka o nwere olileanya na ndị mmadụ ga-amata gbasara ya n'ime obere oge.

Obioma sị na ya azụpụtala ọtụtụ mmadụ, dịka ha niile na-eme nke ọma n'ebe ha nọ.

"Anyị agaala ọtụtụ mba, ọkachasị n'Afrịka. Anyị agaala mba dịka Ghana, Kenya, Ethiopia, Cameroon, Togo".

"Ọ bụ ha na-ahụta ọrụ anyị dịka ihe bara uru, maka na o teela aka ọ malitere na mba ha, mba dị ka Kenya. Ebe ọ dị ọtụtụ bụ na mba a na-arụ ọrụ ugbo ma na-azụ anụmanụ nke ukwuu. Ọ bụ ya mere ha jiri gbasapụ aka wee nabata anyị ka anyị na-arụrụ ha ihe dị etu ahụ," ka ọ kọọrọ anyị.

Maazị Obioma kwuru na ndị gọọmenti abịala ka ha kwalite ọrụ ya, mana otu ihe ọ chọpụtara n'ebe ndị gọọmenti ahụ nọ bụ na ha ji aghụghọ bịa.

Dịka o siri kwuo, gọọmentị achọghị ịbịa kwadoo ya n'ụzọ ziri ezi, kama ha chọrọ iji amamihe ya rụọ ọrụ n'aha ha, iji mee ka a ga-asị na ọ bụ ha nyere ya ọzụzụ o jiri mụta ya.