Ihe m ma mere mgbe ndị 'City Boys' nwere ọgbakọ n'Owere - Obi Cubana

Aha onyonyo, Ihe m ma mere mgbe ndị 'City Boys' nwere ọgbakọ n'Owere - Obi Cubana
Ihe m ma mere mgbe ndị 'City Boys' nwere ọgbakọ n'Owere - Obi Cubana
    • Onye dere ya, Chinonso Ugorji
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
    • Onye dere ya, Donald Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist

Obinna Iyiegbu a maara nke ọma dịka 'Obi Cubana' akọwaala ihe mere o ji akwado gọọmenti Bola Tinubu nakwa ihe kpaliri mmụọ ya iwere ọkwa onye nchịkọta otu 'City Boys Movement'.

Oge ya na BBC Igbo nwere mkparịtaụka pụrụiche, Obi Cubana kọwakwara ihe mere n'Owere dị n'Imo Steeti oge ndị 'City Boys Movement' nwere ọgbakọ na steeti ahụ.

"Taa mụ na gị nọ, ana m akwado onye na-achị anyị bụ Ahmed Bola Tinubu. Ọ dịkwaara gị onwe gị ịkwado onye masịrị gị. O nweghị onye na-atụwa mmadụ egbe, o nweghị onye a na-atụwa mma n'isi".

"Mana ihe m na-achọghị bụ ibuso mmadụ agha, nke ahụ abụghị ọchịchị onye kwuo uche ya. Ọ bụghị iwu na mụ na gị ga-emekọrịta otu ihe. Ma ndị "Village Boy" ma ndị "City Boy"."

Maazị Iyiegbu kwuru na ya enweghị ihe ọbụla megide ndị otu 'Village Boys' n'ihi na ha niile bụ ụmụnne.

"Ọ bụ ndị "Village Boys" ga-elekọtara ndị "City Boys" obodo ka ha nwee ebe ha ga-anọ ma ha lọta. Ọ bụkwa ndị "City Boys" ga-asị ndị "Village Boys" bịa lekọtara ha ihe ha anya n'obodo mepere emepe, nke ahụ abụrụ mmekọrịta nke ụmụnne," ka Obi Cubana gwara anyị.

"Taa mụ na gị nọ, ana m akwado onye na-achị anyị bụ Ahmed Bola Tinubu."

Ebe foto si, Obi Cubana/Instagram