Abụ m osiite na-eme ihe ọchị - Cruise With Joe

Aha onyonyo, Abụ m osiite na-eme ihe ọchị - Cruise With Joe
Abụ m osiite na-eme ihe ọchị - Cruise With Joe
    • Onye dere ya, Chinonso Ugorji
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
    • Onye dere ya, Donald Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist

Joseph Obasi a maara dịka Cruise With Joe bụ nwaafọ Imo Steeti a maara nke ọma maka ime ihe ọchị ma bụrụkwa onye nwere ụlọ oriri a ma ama bụ 'Joseph's Pot'.

Oge ya na BBC Igbo nwere mkparịtaụka pụrụiche, Cruise With Joe kọọrọ anyị na ya malitere ụlọ oriri Joseph's Pot n'oge ọrịa covid-19 tiwapụrụ n'afọ 2020.

Ọ sịrị na ndị mmadụ malitere ịkpọtụrụ ya maka erimeri, oge e tinyere iwu ka onye niile nọrọ n'ime ụlọ maka ọrịa covid-19.

"Ọ malitere n'oge ọrịa covid-19, mgbe m bụ onyenkụzi. Anyị si n'ụlọ akụzi ihe oge ahụ. Otu ụbọchị mmadụ chọtara m, m siere ya nri, ọ gwa m na m maara esi nri, nke ahụ atọọ m ụtọ. O tinyere nri m n'ọbaozi WhatsApp ya, m jirikwa egwuruegwu tinye nke m iji gwa ndị mmadụ na amaara m esi nri".

"N'ihi iwu e tinyere ka onye niile nọrọ n'ụlọ oge ahụ, ndị mmadụ anaghị enwe ọgbakọ, nke mere otu onye jiri gwa m siere ya nri. Oge o richara nri m, o tinyere ya n'ọbaozi iji kọwaa etu ọ dị. Tupu m mara ihe na-eme, ndị ọzọ amalite ịbịa. Ọ bụ etu ahụ ka m siri malite isi nri ruo n'ogogo m nọ taa," ka Maazị Obasi kọọrọ anyị.

Gbasara olu asụsụ Owere o ji emepụta ihe nkiri na soshal midịa, Cruise With Joe kwuru na ọ bụghị ihe ọ ma ụma na-eme kama ọ bụ ihe na-adapụtara onwe ya ma ọ na-ekwu okwu.

O kwuru na olu asụsụ ndị Owere na-amasị ndị mmadụ nke ukwuu n'ihi na oge mbụ ọ sụrụ ya, ọtụtụ ndị mmadụ sịrị ya gaa n'ihu na-asụ ya.

N'okwu ya: "Ọ bụghị ihe m haziri ahazi, kama ọ na-abịara onwe ya ma m na-ekwu okwu oge m na-eme ihe nkiri, ma tupu m mara nke na-eme, ọ pụtala n'akara Tunde Ednut. Oge m sụrụ ya, ọ masịrị ndị mmadụ, ndị enyi m asị m gaa n'ihu na-asụ ya."

Dịka Joseph Obasi si kọọrọ anyị, ọ malitela ụlọ oriri Joseph's Pot tupu ọ banye n'imepụta ihe nkiri na-atọ ọchị, nke aha e ji mara ya bụ 'Cruise With Joe'.

Oge anyị jụrụ ya ebumnobi o jiri malite ime ihe ọchị na soshal midịa, Joe siri: "Ana m agbalị ịkwalite Joseph's Pot oge ahụ, ọ masị ndị mmadụ etu m si eme ya, nke mere ha jiri gwa m mepee akara ọbaozi ebe m ga na-etinye ihe nkiri ndị ahụ na-abụghị gbasara nri m, ọ bụ etu ahụ ka m siri kepụta Cruise with Joe."

Joseph Obasi kwuru na ihe kachasị enye ya afọ ojuju bụ na ọ naghị etinye aka n'ihe ọjọọ iji kpata ego, tinyekwara na ọ bụ ya na ndị ntoroọbịa ibe ya na-arụkọ ọrụ.

"Anaghị m ekpu okpu mmeemmee iji metọọ omenala, kama ana m ekpu ya n'ihi na nke a bụ naanị omenala m maara ma bụrụkwa naanị omenala m na-asọpụrụ."

Ebe foto si, Cruise With Joe/Instagram

Cruise With Joe sịrị na ụfọdụ mmadụ na-ebugharị akụkọ ndị na-abụghị eziokwu gbasara ya, mana obiụtọ ya bụ na ngalaba iwu na-elebara okwu ndị ahụ anya.

"O nwere ndị na-agaghị ekwu okwu ọbụla gbasara gị ma ọ bụrụ na ọ bụghị ihe ọjọọ. Anyị ewunyela ọtụtụ ihe ma gbapeekwa ọtụtụ ihe. Anyị emeela ọtụtụ ihe kwesịrị ime ka ndị mmadụ buru Joseph's Pot n'isi, mana nke ahụ agaghị ewu ewu dịka mgbe a kpọrọ gị onye ohi".

"Mana otu ihe na-enye m obi aṅụrị bụ na iwu na-ekpuchite mmadụ ndị a na-anụ aha ha dịka anyị. Ọ bụrụ na anyị gba nkịtị, anyị agaa n'ụzọ iwu. Onye fesaa okwu asị, anyị agaa ụlọikpe. Ya merie, ọ bụrụ ya, m merie, ọ bụrụkwa ya," ka o kwuru.

Cruise With Joe mere ka anyị mara na okpu mmeemmee bụ njirimara ya ma kwuo na ọ naghị ekpu ya iji metọọ omenala Igbo, kama ọ bụ iji kwalite ya.

"Anaghị m ekpu ya iji metọọ omenala, kama ana m ekpu ya n'ihi na nke a bụ naanị omenala m maara ma bụrụkwa naanị omenala m na-asọpụrụ."

O kwuru na ya echibeghị echichi ọbụla, mana nke ahụ ga-emezu n'oge na-adịghị anya.