Amaghị m na m ga-edinwu ọnwụ nwunye m - Cosmas Maduka

Aha onyonyo, "Amaghị m na m ga-edi ọnwụ nwunye m" Cosmos Maduka
Amaghị m na m ga-edinwu ọnwụ nwunye m - Cosmas Maduka
    • Onye dere ya, Uzoamaka Ewuzie
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
    • Ebeg o si, Legọs
    • Onye dere ya, Donald Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
    • Ebeg o si, Legọs

Cosmas Maduka bụ onye oji ego achụ nta ego a ma ama na Naịjirịa nwee ụlọọrụ na-azụ ahịa ụgbọala na bụ nke a mara dịka Coscharis Motors.

Maduka bụ onye nwunye ya hapụgoro ụwa kwuru na ngwụcha afọ a ga-eme ya afọ ise nwunye nwụrụ mana ọ lụbeghị nwaanyị ọzọ.

O kwuru na ndị mmadụ ga na-ekwu na ọ gịnị mere na ọ lụbeghị nwaanyị ọzọ.

Cosmas Maduka bụ onye oji ego achụ nta ego a ma ama na Naịjirịa nwee ụlọọrụ Coscharis e ji ịzụ ahịa ụgbọala mara.

Ebe foto si, Cosmas Maduka/Instagram

Nkọwa foto, Cosmas Maduka yi kootu anụnụ
Cosmas Maduka bụ onye oji ego achụ nta ego a ma ama na Naịjirịa nwee ụlọọrụ Coscharis e ji ịzụ ahịa ụgbọala mara

Ebe foto si, Cosmas Maduka/Instagram

Dịka o siri kwuo: "Alụrụ m nwunye m mgbe m dị afọ iri na itoolu na ọnwa itoolu. Aga m eme afọ iri abụọ n'ọnwa Desimba 1978 mana mụ na nwunye m gbara akwụkwọ n'ọnwa Sepụtemba 1978."

Ọ gara n'ihu kwuo na ya: "A matara nwunye m n'ụlọụka. Ọ bụ nwaagbọghọ mara ihe nke ukwuu ma nwee ọgụgụisi. Ọ bụ nwaanyị anaghị atụ egwu. Ị ga-ahụ na obi siri ya ike dịka ọdụm. Mana ọ chịa ọchị, anya ya na-egbuke egbuke. Ị ga-ahụ kpakpando n'anya ya."

Ọ kọwara ihe mere na ọ lụbeghị nwaanyị ọzọ kemgbe nwunye ya nwụrụ.