Idina mmadụ tupu e nye ya ohere ime ejije bụ arụ - Uzor Arukwe

Aha onyonyo,
Idina mmadụ tupu e nye ya ohere ime ejije bụ arụ - Uzor Arukwe
    • Onye dere ya, Chinonso Ugorji
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
    • Onye dere ya, Donald Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist

Uzor Arukwe ekwuola na ihe gbasara idina mmadụ maka inye ya ohere isonye n'ejije bụ ihe ọjọọ gbara ọkpụrụkpụ a na-ahụta na Nollywood.

Oge ya na BBC Igbo nwere mkparịtaụka pụrụiche, Arukwe kwuru na ọ bụghị naanị ụmụnwoke na-edina ụmụnwaanyị maka inye ha ohere iji sonye n'ejije, kama ụmụnwaanyị na-emekwa ya ndị nke nwoke.

Maazị Arukwe sịrị: "Ọ na-eme ụmụnwoke nke ukwuu. Ị ma na ọtụtụ ndị a na-anụ aha ha na ngalaba ejije bụ ụmụnwaanyị. Ụfọdụ n'ime ha bụkwa ndị na-ahazi ejije. Nwata nwoke ha hụrụ n'anya gbara dimkpa ma maakwa mma, ha nwereike sị ya nyere ha aka."

Mana o kwuru na o nwebeghị onye kpọrọ ya ka ha mee ụdị ihe ahụ, ma kwuo na nwaanyị iji maka ọrụ ejije chọọ ka nwoke dinaa ya bụ ihe jọgburu onwe ya.

Gbasara imepụta ejije n'ụzọ ọgbara ọhụrụ, Uzor Arukwe kwuru na ime ihe n'ụzọ ọgbara ọhụrụ enyela aka ime ka ọtụtụ mmadụ na-ekiri ejije ndị Nollywood ugbua karịa etu ọ dị na mbụ.

"Iji maa atụ, oge anyị mere 'Love In Every Word', nke bụ ejije Odogwu Paranran, ọ bụrụ na ị mee nchọcha, ị ga-achọpụta na ejije ahụ nwereike ọ gaghị enweta ọnụọgụ mmadụ ndị lere ya ma ọ bụrụ na e tinyere ya na sịnịma".

"Ọ bụghịkwanụ onye niile nwere ego o ji azụta ohere kwa ọnwa na n'ọba ejije dị iche iche, mana onye niile nwere YouTube n'ekwentị ha. Onye niile nwere ego ha pụrụ iji zụta 10GB maọbụ 1GB maọbụ 2GB iji kirie ejije masịrị ha".

"Echere m na ebe anyị nọ ugbua n'ihe gbasara ime ihe ọgbara ọhụrụ bụ ụzọ ọganihu. Ọ dị ka Spotify nakwa akụrụngwa ndị ọzọ maka ndị na-eti egwu. Usoro imepụta ejije n'ụzọ ọgbara ọhụrụ bụ ihe ọma," ka Maazị Arukwe kwuru.

O kwukwara na ime ihe n'ụzọ ọgbara ọhụrụ enyela aka iji mee ka ụfọdụ mmadụ nweta ọrụ ma na-akpata ego site n'ime ihe nkiri na ihe ngosi dị iche iche.

Odogwu Paranran gbarụrụ ihu megide ikesa ihe onye ọzọ chepụtara ma mepụta na-ebughị ụzọ nweta nkwado, ma kọwaa nke ahụ dịka izu ohi.

"Ọ bụrụ na i nweghị akaraka ichepụta nke gị, ezula nke onye ọzọ. Ọ dịghị mma. Ihe ahụ bụ ohi, ezigbo ohi, ị bụ onye ohi. Ọ bụ ihe ọjọọ ma bụrụkwa nke iwu megidere, ọ bụ ya mere e ji nwee ntaramahụhụ maka ya. Onye ọbụla na-eme ya kwụsị ya," ka Maazị Arukwe kwuru.

Idina mmadụ tupu e nye ya ohere ime ejije bụ ihe ọjọọ - Uzor Arukwe

Ebe foto si, Uzor Arukwe/Instagram

Uzor Arukwe kọkwaara anyị na ya nwere akara YouTube mana ọ malitebeghị itinye ejije ọbụla n'ime ya.

O kwuru na ọtụtụ ndị otu ya nwere akara YouTube, nke ha mepere maka iji na-akpatara onwe ha ego ma ọ bụrụ na ha laa ezumike.

Uzor sịrị: "Ọtụtụ n'ime ndị otu m mepere ya maka mgbe ha ga-ala ezumike, nke ọ ga-abụ ha kwụsị ime ejije, e nwee ihe ga na-enye ha obere ego, mana achọghị m itinye ihe na nke m, maka dịka onye na-eme ejije, ana m echepụta ihe dị iche."

O kwuru na ya abụghị onye na-agbaso ihe ndị ọha na-eme, kama ebumnobi ya bụ ime ejije na ịkọ akụkọ ndị masịrị ya.

"Achọghị m ime ejije maka na ọ bụ ngwaahịa. Ọ bụ nkà. Iji zaa ajụjụ ị jụrụ m, ọ bụghị na achọghị m ime ya, kama achọrọ m ikepụta ọrụ nkà ma kọọkwa akụkọ m chọrọ ịkọ."