'Atara m ahụhụ' - nsogbu otu nwaakwụkwọ nwere iji nweta agụmakwụkwọ na Naịjirịa

Ebe foto si, Todah Opeyemi / BBC
- Onye dere ya, Todah Opeyemi
- Ndị mere akụkọ a, BBC Africa
- Ebeg o si, Lagos
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6
Mgbe ọ dị afọ iri na atọ, nwunye nna ya boro Ovey Friday ebubo na ọ bụ amoosu, e wee kpọga ya n'ebe a na-eme omenala n'ime steeti Nasarawa nke etiti Naịjirịa, ebe a tara ya ahụhụ.
Mgbe otu onye agbata obi kọkuru ndị uweojii e jiri buru ya gaa ụlọọgwụ, ihe ọjọọ ahụ e mere ya ekweghị a gbanwe.
"Onye dibịa ahụ wetara ọkụ, tinye ihe n'aka m, kee aka m [na] ụkwụ m, tinye ose n'ime ọkụ ahụ, wee kpuchie m ákwà mkpịcha," ka Friday, onye dị afọ iri na itoolu ugbu a, na-echeta.
Ndị dọkịta gbara m ọgwụ ka m daa jụụ tupu ha wee waa m ahụ. Friday tetara wee hụ na e bepụrụ aka ekpe ya, ebe mkpịsị aka dị n'aka nri bụ ndị e bepụrụ maọbụ nwere mmerụ ahụ kpamkpam.
"Ebere m akwa nke ukwuu," ka Friday gwara BBC.
N'afọ ndị sochirinụ, ndị mmadụ lere ya anya n'okporoama maọbụ chịa ya ọchị.
"Ọ ga-amasị m ma a sị na ha maara m, dịka mgbe a mụrụ m," ka o kwuru.
N'agbanyeghị ọnọdụ ya obi siri ya ike iji na-agba mbọ.
Ma ọ fọrọ nke nta ka ọchịchọ agụmakwụkwọ ya kwụsị afọ abụọ gara aga, mgbe ọ gbalịrị ide ule nnabata na mahadum nke Naịjirịa, nke bụ 'Joint Admissions and Matriculation Board' (Jamb).
Usoro iji mkpịsịaka amata mmadụ bụ 'system biometric fingerprint' enweghị ike ịnabata onye dịka ya, n'ihi na ọ nweghị mkpịsị aka.
Mana o nwere ihu ọma dịka otu n'ime ndị na-elekọta ya, yana ndị na-akwado ikike ndị nwere nkwarụ, gbara mbọ ka ndị ọrụ nabata akara mkpịsị ụkwụ ya dịka ihe e ji achọpụta njirimara ya.
Ugbua, Friday na-agụ 'English and Literay Studies' na mahadum dị na Nasarawa, steeti dị n'akụkụ isi obodo, Abuja.
Ọ bụ ya bụ onye mbụ n'ezinụlọ ya banyere na mahadum.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a

Ebe foto si, Scarlett Eduoku
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Scarlett Eduoku, onye na-eme ihe ngosi n'ụlọọrụ redio na Kano Steeti nke dị n'ebe ugwu, ezutela ihe mgbochi ndị yiri nke ahụ ma kwuo na ọtụtụ ngwa nnyocha njirimara anaghị enyocha ihu ya. O tufuru anya aka ekpe ya mgbe ọ dị ọnwa iri na asatọ.
Nke a bụ nsogbu nyere ya n'ihi na o nweghị ike ịgbanwe kaadị ekwentị ya bụ 'SIM' site na 3G gaa na 5G site na agaghị ebe ahụ.
Kama, ọ ga-aga njem ruo isi ụlọọrụ nke ndị na-ahụ maka netwọk ya n'etiti obodo Kano.
Dịka odeakwụkwọ ukwu nke National Commission for Persons with Disabilities (NCPWD), Ayuba Burki-Gufwan si kwuo, ihe karịrị nde mmadụ iri atọ na ise nke ndị Naịjirịa, ihe dịka pasent iri na ise nke ndị mmadụ, ka e kwuru na ha nwere ụdị nkwarụ ụfọdụ.
Cheta na ndị omeiwu kwadoro iwu pụrụ iche n'afọ 2019, nke machibidoro ịkpa oke megide ndị nwere nkwarụ ma na-ekwe nkwa na ha ga-enweta ọrụ ọha.
Iwu ahụ mere ka e guzobe ụlọọrụ NCPWD iji kwado ikike ha, mana mgbanwe a ji nwayọ nwayọ agbanwe," ka Burki-Gufwan gwara BBC.
Burki-Gufwan kwuru na e nweela uru ụfọdụ - Jamb ewepụla ụgwọ ule maka ndị nwere nkwarụ ma mepụta ebe pụrụ iche maka ụmụakwụkwọ nwere mkpa dị iche iche.
Otu mahadum dị na Nasarawa, 'Federal University of Lafia', ahapụkwala ihe ruru pasent 75 nke ụgwọ niile maka ụmụakwụkwọ nwere nkwarụ.
"Nkea mwere ka mahadum ahụ hụrụ mmụba dị ukwuu [n'ime ndebanye aha]," ka Burki-Gufwan na-ekwu, "n'ihi na onye ọ bụla nwere nkwarụ chọrọ irite uru."
Ọkammụta pụrụ iche nke bi na Legọs, Chukwuemeka Chimdiebere, kwuru na Naịjirịa ga-agba mbọ iji gboo mkpa ndị nwere nkwarụ.
"Inye onye ọbụla ohere abụghị amara. Ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị," ka ọ gwara BBC.
"Ọtụtụ ndị nwere nkwarụ anaghị enwe oke nsogbu ha maka ọnọdụ ha. Ọ bụ usoro e ji eme ihe nke e bughị ha n'uche wee emee," Chimdiebere kwuru.

Ebe foto si, Todah Opeyemi/BBC
Abiose Falade, dị afọ iri anọ na asatọ bụ onye edemede n'obodo Ibadan dị na ndịda ọdịda anyanwụ, na-eji oche nkwagharị aga ije, kwuru na nkwarụ "bụ ihe a na-ahụ na ndụ".
"Ọ nwereike ime gị n'oge, o nwekwara ike ime gị ma emechaa. Mgbe ụfọdụ, ọ nwere ike ịdịgide adịgide, mgbe ụfọdụ nwa oge. Mana nkwarụ bụ akụkụ nke usoro ihe dị iche iche nke otu Chineke si kee anyị."
Falade ahụghị onwe ya dịka onye dị iche n'ebe ndị ọzọ ruo mgbe o debanyere aha n'ụlọakwụkwọ mgbe ọ dị afọ iri.
"E mere ka m mata ụwa na ihe ndị dị mgbagwoju anya ya," ka o kwuru. "Ndị nwere nkwarụ abụghị kpọmkwem ihe ụwa chọrọ."
Ọ bụ etu o si ahụta nke a ruo taa: "E nwere ndepụta ebe m nwere ike ịga na ndepụta nke m na-agaghị aga."
"Mgbe m chọrọ ịpụ apụ, m na-akpọrọ mmadụ ka m wee ghara ịhụ ya mgbe ndị mmadụ malitere ile m anya, malite ịtụ m aka. Ọ na-adị mfe karịa naanị m iso."
Ebe obibi anyị na-eme ka ihe ịma aka ahụ sie ike.
N'ọtụtụ obodo ndị dị na Naịjirịa, ụzọ ndị adịghị mma maọbụ ụzọ ndị nwere ihe ndị dị ka oghere sara mbara dị n'ọwa mmiri mepere emepe nke e mere maka ịrụzi ya arụzi, ebe ụzọ ndị dara ada dị ole na ole, nke na-eme ka ha sie ike maọbụ ghara ikwe ndị nwere nkwarụ ịga gharị agagharị.
N'ime ime obodo, enweghị ụzọ ndị a na-eji ige nkwagharị 'wheelchair' agafe pụtara na ndị na-eji oche nkwagharị ga-aga n'okporoụzọ ndị a na-anaghị akọwapụta maọbụ ndị na-adịghị mma.
Ụlọ ọha na eze anaghị enwe ebe esi adọbata ndị na-eji oche nkwagharị na-aga nke mere ka na-enwe nsogbu ịbanye n'ụlọakụ, ụlọọgwụ maọbụ ụlọọrụ gọọmenti na-enweghị enyemaka.
Ihe na-eme ka ọnọdụ akawanye njọ bụ na Naịjirịa na-ebubata oche nkwagharị niile, ihe enyemaka ntị na ngwaọrụ ngagharị.
"Ọ bụrụ na mmadụ itoolu n'ime mmadụ iri ọ bụla nwere nkwarụ chọrọ ụdị akụrụngwa enyemaka mana ọ dịghị nke e mepụtara n'obodo, mgbe ahụ anyị nwere nnukwu ihe ịma aka," ka Burki-Gufwan na-ekwu.
Ndị na-akwado iwu na-akpọ oku ka e debe otu pasent nke mmefu ego maka ndị nwere nkwarụ n'ọkwa gọọmentị ọ bụla.
Ha na-ekwu na obere ego ọha na eze na ihe ndị kacha mkpa na-emetụta otu e si eme ngwa ngwa itinye usoro nnweta, ọbụlagodi ebe enwere njikere.

Ebe foto si, Opeyemi Ademola
Opeyemi Ademola, dị afọ iri abụọ na asatọ, onye njikwa ọrụ na Legọs, nwere nkwarụ nke a na-anaghị ahụ anya.
O nwere ụdị ntị chiri dị iche. Ya mere, nzukọ ọ bụla chọrọ nlebara anya siri ike, ebe mkpọtụ na-emekwa ka uche ya ghara ịdị ike.
"Ndị mmadụ chere na ọ bụrụ na ị nwere ike ikwu okwu nke ọma, ị gaghị enwe nsogbu nkwurịta okwu," ka o kwuru.
"Mana ịnweta ohere abụghị maka ikike. Ọ bụ maka nkwado."
O kwuru na mgbanwe dị mfe, dịka ederede chịkọtara ihe e mere na nzukọ na nkọwa okwu n'oku vidiyo, nwere ike ime nnukwu mgbanwe.
Burki-Gufwan nwere olileanya na otu ụbọchị a ga-enwe "ezi ohere" maka ndị nwere nkwarụ.
"Ọ pụtara na ọ dịghị onye a hapụrụ n'azụ - n'ọrụ, n'agụmakwụkwọ, na n'ịbanye na ndọrọ ndọrọ ọchịchị," ka o kwuru.
Mana n'ụlọakwụkwọ mahadum, Friday na-amalite isonye n'ihe a na-eme dịka nwaakwụkwọ.
N'etiti nkụzi na ọrụ ndị ọzọ, ọ na-amụta ụzọ ọhụrụ isi dee ihe ọzọ, ibi ndụ n'adabereghị na mmadụ ọzọ na imeta ndị enyi ọhụrụ.
Ọ na-egosi ndị Naịjirịa na enwere ike imeri ihe mgbochi na ajọ mbunobi, na ndị nwere nkwarụ nwere ike ịga nke ọma dịka onye ọ bụla ọzọ maọbụrụ na e nye ha ohere.



























