Ọkụ agbaala ogige nchekwa ọgwụ mịnịstrị ahụike Ebonyi Steeti

Ebe foto si, Lucy Anyim, PRO Ebonyi State Ministry of Health
Akụkọ ekwuola na ọkụ agbaal ogige nchekwa ọgwụ mịnịstrị ahụike n’Ebonyi steeti ma mebie ọtụtụ ihe ego ọnụego ya ruru ọtụtụ nde naịra.
Kọmishona na-ahụ maka ahụike na steeti ahụ bụ Dọkịnta Moses Ekuma kwuru na ogige nchekwa ọgwụ bụ ebe e dobere ọgwụ mgbochi ọrịa mmịwụ nakwa ọgwụ mgbochi ndị ọzọ.
O kwuru na ihe ndị ọzọ dị n’ebe ahụ gbara ọkụ gụnyere igwe kọputa, akwụkwọ ihe ndekọ dị iche iche, igwe njụoyi, akwa ụlọọgwụ ha nwetara n’aka ụlọọrụ National Primary Health Care Development Authority (NPHCDA) nke e kwesiri ikesa n’okpuru ọchịchị dị iche iche nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ.
Dọkịnta Ekuma kwuru na ọkụ ahụ dị ezi mwute ma kwuo na obi dị ya ụtọ n’ihi na enweghị onye ọbụla merụrụ ahụ n’ọkụ ahụ.
Kọmishọna ahụ kọwara na ha amaghị ihe kpatara ọkụ ahụ ma kwuo na ọkụ latrik adịghị ebe ahụ kemgbe abalị ise gara aga.
N’okwu ya “Ọkụ latrik adịghị ebe ahụ kemgbe abalị ise, ọzọ bụkwa na ọkụ solar anyị ji arụ ọrụ ebe ahụ adịghị mma. Anyị kpọrọ ndị ọrụ EEDC ka bịa dozie ọkụ ahụ n’abalị gara aga”.
O mere ka o doo anya na a malitela ime nnyocha iji chọpụta ihe kpatara ọkụ ahụ ma kwuo na o nyela iwu ka e nye ụlọọrụ ndị ọkụ ahụ metụtara ogige ebe ọzọ ha ga-anọ na-arụ ọrụ dịka nnyocha ahụ na-aga n’ihu.
N’aka nke ọzọ onyeisi ụlọọrụ na-agbayụ ọkụ na steeti ahụ bụ Frank Oka kwuru na ọkụ ahụ agbariela ọtụtụ ihe tupu ndị ọrụ erute ebe ahụ.
Akụkọ ndị ọzọ ị ga-agụ:

Ebe foto si, Lucy Anyim, PRO Ebonyi State Ministry of Health

















