United Nations akwadola ka a hụta "ire ohu n'Afrịka" dị ka mpụ kachasị njọ e mere mmadụ

Ihe gosiri etu ọnọdụ dị n'oge ochie mgbe a na-eme ndị Afrịka ohu.

Ebe foto si, Universal Images Group via Getty Images

Nkọwa foto, Ndị Afrịka ruru nde 12 ruo nde15 ka e jidere ma mee ha ohu, ree ha ere.
    • Onye dere ya, Wedaeli Chibelushi
    • Onye dere ya, Thomas Naadi
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Africa
    • Ebeg o si, Accra
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Ọgbakọ otu mbaụwa bụ 'United Nations General Assembly' atụọla vootu kwadoo ka a hụta ire ohu e rere ndị Afrịka dịka "mpụ kacha e mere mmadụ'. Ọtụtụ ga-ahụta nke a dịka ihe ga-enyereaka ka udo chịa ma kwado ikike dịrị mmadụ.

Nkwekọrịta vootu a sonyere mkpesa mba Gana wetere ma na-arịọ ka UN rịọ ndị Afrịka biko maka ire ha ohu, ma nye ha ego itiaka n'obi, mana ha ekwughị ego ole a ga-enye ndị Afrịka.

Mba kwetere ma kwado atụmatụ ahụ dị otu narị iri abụọ na atọ (123) mana mba na-akwadoghị ya dị naanị atọ nke gunyere mba Amerịka, Izrel na Ajentịna.

Mba na-achọghị ikwu ihe ọbụla banyere nke a dị iri ise na abụọ nke gunyere Briten na mba dị na Yurop.

Briten adịla na mbụ jụụ oku ahụ a na-akpọ ka e nye Afrịka ego itiaka n'obi ma na-ekwu na ndị ndu mba ha ugbua ekwesighị inweta ụta maọbụ ahụhụ maka ihe ndị ndu ha n'oge gara aga mere.

Nkwekọrịta "UN General Assembly" adịghị a bụ iwu mba niile ga-erube isi dịka nkwekọrịta nke "UN Security Council". Mana ọ ka bụ nkwekọrịta gbara ọkpụrụkpụ.

Onyeisiala mba Gana bụ John Mahama gwara ọgbakọ mba ụwa sị "ya bụrụ na mgbe a ga-akọ ihe mere, ka o doo anya na anyị niile mere ihe dị mma, anyị kwesiri ime maka ndị e mere ohu, nakwa ndị ka na-ata ahụhụ ịkpa oke agbụrụ".

"Nkekọrịta bụ ihe ga-enyereaka ka e chefuo ya ma na-arụtụaka na etu e si edi ihe na-eme".

Mịnịsta mba ofesi na Gana bụ Samuel Okudzeto gwara BBC Newsday na "anyị na-ekwu ka e tie Afrịka aka n'obi - mana ka o doo anya, ndị ndụ Afrịka adịghị ekwu ka e nye ha ego ha ga-enwere gbaa n'akpa ha".

"Anyị chọrọ ka ndị o metụtara nweta mkwado ikike dịrị ha, nakwa ego nkwado agụmuakwụkwọ, na nzulite n'ọrụ aka".

Oku a na-akpọ ka e tie Afrịka aka n'obi maka ihe mere n'oge garaaga abụrụla nnukwu ihe na nsonso a dịka otu jịkọtara mba Afrịka mere ka "itiaka n'obi maka ikike dịrị mmadụ" bụrụ isi okwu ha n'afọ 2025, ebe ndị ndu na otu 'Commonweaith' na-akpọ oku ka e nwee mkparịtaụka banyere ya.

Ablakwa kwuru na mba Gana adịghị akpọ onye ọbụla aha ọjọọ kama na ha na-eme ka e nwee ndekọ banyere ihe mere etu o si mee n'oge ochie.

N'agbata afọ 1500 ruo afọ 1800 mmadụ ruru nde iri na abụọ ruo nde iri na ise ka e jidere n'Afrịka mee ha ohu, manye ha n'ike ka ha na-arụ ọrụ. A na-ekwu na mmadụ karịrị nde abụọ nwụrụ anwụ n'oge ahụ.

Mkpebi ahụ nke otu jịkọtara mba Afrịka na Caribbean kwadoro na ahụhụ sonyere ime ohu ka dị ugbua dịka ịkpa oke agbụrụ, enweghị ezi mmepe nke ndị Afrịka nakwa agbụrụ ha dị icheiche n'ụwa niile na-ataahụhụ ya ruo ugbua.

Ablakwa gwara BBC na "ọtụtụ ụmụ Afrịka site n'oge dị icheiche na-ataahụhụ ịkpaoke maka ikewapụ ha n'Afrịka site n'ohu ma mee ka ha nọrọ n'ihe ụkọ".

UN kwetere na ime Afrịka ohu nwere ihe nwute nakwa mkpagbu dị na ya, ma metụta nde pụrụ nde mmadụ.

Mana onye nnọchịtaanya na UN bụ James Kariuki kwuru na e nwere mpaghara mkpebi ahụ nwere nsogbu ị bụ iwu.

Ọ gara n'ihu kwuo na "enweghị ajọ ihe e kwesiri ikwu na ọ karịrị ibe ya".

Ụgbọmmiri dị icheiche n n'elu mmiri Elmina bụ ebe a na-ere ndi ohu na Gana.

Ebe foto si, Ullstein bild via Getty Images

Nkọwa foto, Elmina bụ ebe a maara dịka ebe a na-ere ohu kadị ugbua na mba Gana.
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Onye nnọchịtaanya mba Amerịka n'UN kwuru na ha agaghị anabata "ikike iwu kwadoro nkwụghachi maọbụ itiaka n'obi maka mmejọ e mejoro n'oge ochie nke na-adịghị n'iwu mba ụwa n'oge o mere".

Dan Negrea kwuru na mba Amerịka na-agbaụkwụ na "ị ji ihe mere n'oge ochie na-achọ ka e nye ndị mmadụ nakwa mba dị icheiche n'ọgbara ọhụrụ a nkwụghachi maọbụ itiaka n'obi maka na ihe mere abụghị ihe metụtara ha onwe ha kpọmkwem.

Mana mba Gana bụ otu n'ime mba e si ere ndị mmadụ n'ohu adịla na mbụ soro na-akpọ oku ka e nye ndị o metutara nkwụghachi maọbụ itiaka n'obi.

Forts bụ ebe e mere ndị Afrịka ohu tinye ha na mkpagbu dị icheiche ka dị ruo ugbua.

Onye nnọchịtaanya mba Amerịka na-ekwu na iwu maka nkwụghachi ahụ nwere nsogbu maka na o kwughị 'onye a ga-enye' nkwụghachi ahụ.

Negrea gara n'ihu tinye ọnụ na nkatọ Onyeisiala mba Gana katọrọ ọchịchị Donald Trump maka 'ime ka e hichaa akụkọ ndekọ banyere ndị isi ojii n'oge garaaga".

Kamgbe Trump bịaghachiri n'ọchịchị, ọ na-emekpa ọtụtụ ụlọọrụ nakwa otu dị icheiche ahụ bụ ndị ọ sị na ha na-agbasa ozi na-adịghị akwalite njirimara mba Amerịka.

Trump nyere iwu megidere ọgbakọ ngosipụta 'oge e mere ndị isi ojii ohu' na mpaghara Philadelphia.

Mahama kwuru na nke ahụ bụzị ihe ọtụtụ gọọmenti dị icheiche na-eme.

Mana Negrea kwuru na Onyeisiala Trump emeelana ndị isi ojii n'Amerịka ihe ọma karịa Onyeisiala ọbụla n'Amerịka.

"Ọ na-arụ ọrụ na-ehighị ụra, ka ọ mee ka mba anyị dị mma karịa etu ọ dị".

Mana mkpebi ahụ na-ekwu ka e nweghachita ihe ọdịnaala nakwa ihe a kpụrụ-akpụ dị icheiche e zuru n'ohi n'oge a na-ere ndị ohu.

Ablakwa kwuru sị na "anyị chọrọ ka e nweghachịta ihe niile e zupuru nakwa ihe omenaala e zuru n'oge ahụ".