Miyetti Allah: 'Ndị Ọwụwa-Anyanwụ anaghị eme anyị ọfụma, Naijiria bụkwanụ otu'
Onyeisi Miyetti Allah n'Ọwụwa Anyanwụ bụ Gidado Siddiki agọọla na si o nweghị eziokwu dị na kepukepu na ndị ọchiehi na-awụbata Ọka, Nise nakwa mpaghara dị iche iche n'Anambara steeti dịka a na-ebo n'ebubo na nsonso a.
Na mkparịtaụka BBC Igbo na onyeisi Miyetti Allah n'Ọwụwa Anyanwụ bụ Gidado Siddiki nwere ụbọchị Tuzde a, ọ tụrụ arịrị na ndị mpaghara ahụ na-akpọ ndị otu ha 'ndị ekperima' na ndị ntọ n'agbanyeghị na ihe ha na-achụ bụ ihe afọ ga-eri.
Okwu a na-abịa dịka ha nwechara ọgbakọ n'Enugwu na nsonso a ebe ha kwuru na ha agaghị ele anya n'azụ inyefe n'aka gọọmenti onye ọbụla n'ime ndị otu ha mere mpụ.
Siddiki sị, "Anyi na-ahụ ọtụtụ nsogbu n'Ọwụwa-Anyanwụ, ọtụtụ ndị mmadụ na-ele anyị ajọ anya na-anyị na-akpa arụ anyị amaghị maka ya."
"Ụfọdụ na-ekwu na anyị bịara ịnara ha ala ha. Ụfọdụ na-akpọ anyị ndị ekperima na ndị ntọ."
Ọ dịghị mma ị na-akpọ ndị niile na-achị ehi ndị omekome."
"Naijiria bụ otu, onye ọbụla nwere ikike ịnọ ebe ọbụla masịrị ha ọkachasị ma ọ bụrụ na onye ahụ na-akwụwa aka ya ọtọ."
N'akụkọ na ndị 'ekperima' si Ugwu na-awụbata n'Anambara steeti, Siddiki kwuru na o nweghị eziokwu dị na kepukepu ahụ na-efegharị.
N'okwu nwoke e gburu n'ugbo ya n'Ojii River, Enugwu steeti n'ọnwa ole na ole gara aga nke ụfọdụ ndị mmadụ na-arụ aka na ọ bụ ndị ọchịehi, Gidado gwara BBC na " ebubo ahụ abụghị eziokwu."
" "ebe ihe ahụ mere bụ n'ime ọhịa. O nweghi ụkwụ ehi gosiri na ehi maọbụ ndị Fulani bi n'Ọhịa ahụ. Gịnị mere e ji ebo ya ndị Fulani?"
" Ọ dịghịkwa mma. O kwesili ka e nyocha ihe ahụ nke ọma hapụ ile naanị ndị Fulani, si etu ahụ hapụ ndị mere ya bụ ihe kpọmkwem ka ha gbalaga."
Ọ kwuru na ihe onyonyo ahụ na-efegharị e jiri bo ebubo ahụ gosiri naanị mmadụ atọ nọ n'elu ọgbatumtum. ma jụọ ma o nwere ihe ọjọọ dị na mmadụ ibi na mpaghara ọzọ na-achụ nta ego.
Ọ gara n'ihu kwuo na ha na ndị gọvanọ Ọwụwa-Anyanwụ na-etikọta isi iji nye ha ozi banyere ọnọdụ nchekwa n'ala Igbo.
Anya ọjọọ a na-ele anyị n'Ọwụwa-Anyanwụ akarịala - Miyetti Allah

Ebe foto si, Getty Images
Otu jịkọrọ ndị ọchiehi bụ Miyetti Allah nke mpaghara Ọwụwa-Anyanwụ etiela mkpu maka ajọ anya a na-ele ha n'Ọwụwa-Anyanwụ Naijiria.
Ha kwuru na ndị Ọwụwa-Anyanwụ na-ebozi ha ji na ede ma na-enyo ha enyo dịka ndị ọjọọ n'agbanyeghị na ihe ha na-eme n'ala Igbo bụ ịchụnta ego.
Okwu a so na mkpebi asatọ pụtara n'ọgbakọ Miyetti Allah mere n'ụbọchị Mọnde n'Enugwu.
Mkpebi si na nzuko ha mere n'Enugwu

Mkpebi ọzọ ha nwere na ọgbakọ ahụ gụnyere
1. "Ihe butere ọgbakọ ahụ bụ nghọtahie nakwa nsogbu nchekwa metụtara ndị otu anyị n'ebe dị iche iche n'Ọwụwayananwụ."
2. " Ndị otu anyị anọkwataghịzị n'ihi anya ọjọọ ọtụtụ ndị mmadụ nọ n'Ọwụwa Anyanwụ na-ele ha"South East.
3. "Ajọ anya ahụ gbadoro ụkwụ n' echiche na ndị ọchiehi bụ ndị Fuulani bịara ịkpara ala"
4. "Ịkpọ Ọgbakọ a abụghị iji kwuo na nsogbu n=dị na etiti ndị nke anyị na ndị ha bi be ha akarịala
5. "Ndị ndu otu MACBAN ga-aga n'ihu na anyị na gọọmenti n'steeti ise dị n'ọwụwa anyanwụ inwe mkparịtaụka"
6. "Anyị agaghị ele anya n'azụ ikpe n'aka gọọmenti onye ọbụla n'ime anyị mere mpụ".
7. " Ndị omekome mee ihe, gọọmenti kpọọ ha aha,jide ha maa taa ha ahụhụ dịka ọ dị n'iwu onye ọ masịị ya bụrụ.
8. "Mkparịtaụka ahụ bụ maka iweta nghọta n'etiti anyị na ndị anyị nọ na be ha,"































