Charles Soludo: Ka o si gaa dịka e duru Soludo iyi ọrụ agba nke abụọ

Ebe foto si, Charles Soludo/Facebook
Ubọchị taa ka a na-edu aka na-achi Anambara steeti bụ Charles Soludo n'iyi ọrụ nke ugboro abụọ n'emume a na-eme n'ogige 'Alex Ekwueme Square' dị n'Ọka, isiobodo steeti ahụ.
A họpụtara Soludo ọzọ maka oge nke abụọ na ntuliaka Gọvanọ nke e mere na abalị asatọ nke ọnwa Nọvemba afọ 2025.
Soludo, onye ji pati 'All Progressives Grand Alliance (APGA) nwetara vootu narị puku anọ na iri abụọ na abụọ, narị isii na iri isii na anọ ji merie Nicholas Ukachukwu, pati 'All Progressives Congress' (APC) wetara vootu Puku iri itoolu na itoolu, narị anọ na iri anọ na ise.


Ndị a na-atụ anya ga-abịa emume a gunyere: osote onyeisiala Kashim Shettima onye a na-atụ anya ga-anọchite Onyeisiala Bola Tinubu, ndị bụbu onyeisiala Olusegun Obasanjo na Goodluck Jonathan.
Edemede a nwere ihe ndị si na Facebook. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Facebook iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Facebook post
Emume a nwereike ịdọta ndị ama ama, gụnyere ndị okenye dịka onye bụbu odeakwụkwọ ukwu nke 'Commonwealth', Emeka Anyaoku, ndị eze ọdịnala sitere na obodo 179 dị na steeti ahụ, tinyere ndị eze si n'akụkụ obodo ndị ọzọ dị na Naịjirịa.

Cheta na esemokwu dapụtara n'etiti nwunye aka chịburu Anambara steeti bụ Ebele Obiano na nwunye Emeka Ọdumegwu Ojukwu bụ Bianca Ojukwu bụ ihe chakporo emume idu iyi ọrụ Soludo n'agba nke mbụ ya.





























