Nke bụ eziokwu maka ndị Ekperima na-abata Anambara - Gọọmentị Anambara
Ebe foto si, Chioma Obianinwa
"O nweghị ndị ntorobịa si mpaghara Ugwu Naịjirịa na-awụbata n'Anambara steeti, ya bụ akụkọ bụ okpotokpo asị"
Onye kwuru nke a bụ Don Adinuba, kọmishọna mgbasaozi Anambra steeti.
Adinuba gwara BBC na ndị ọrụ nchekwa niile, ma ndị uweojii, ndị DSS, ndị ọrụ nchekwa okporoụzọ (road safety), kwuru na o nweghị ihe dị otu ahụ.
Ọ dọrọ aka na ntị ka ndị mmadụ zeere akụkọ ụgha na-enweghị isi na ọdụ.
Adinuba kwuru na ọ bụ ndị Igbo ka nọrọ na mpaghara Ugwu Naịjirịa karịa ndị Awụsa nọ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ.
O kwukwara na ndị Igbo bi Ugwu Awụsa ka nwee akaọrụ dị mma, karakwa baa ọgaranya karịa ndị Awụsa bi n'ala Igbo.
Nke a pụtara na ọ bụ ndị Igbo ka ọ ga-aka metụta ma ọgbaaghara daa.
Ndị uweojii sị na ha na-eme nnyocha banyere okwu a
Ebe foto si, Youtube screengrab
Oge BBC kpọtụụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambara steeti bụ Haruna Mohammed, o kwuru na ya bụ okwu erijuchghị afọ, mana ha na-enyocha ya.
Cheta na onyeisi otu nche 'Anambra Vigilante Group', Ikechukwu Aduba, kwuru na ndị mmadụ wetara mkpesa na si "ndị awụsa na-enubata n'Amawbia, Neni, Nise, Agulu, Ekwulobịa nakwa obodo ndị ọzọ n'Anambra".
Aduba onye jibu ọkwa Kọmishọna ndị uweojii, kpọkuru ndị ọrụ nchekwa dị icheiche ka ha saa anya mmiri iji gbochie ọdachi ọbụla.
Mana Haruna Mohammed kwuru na o nweghị ihe akaebe ọbụla gosiri na ndị ekperima si mpaghara Ugwu awụbata n'Anambra.
N'agbanyeghị nke a, Haruna kwuru na nnyocha amalitela dịka Aduba si rịọ, iji mata nke bụ eziokwu.
Ọ gara n'ihu rịọ ndị mmadụ ka ya bụ akụkọ ghara ichu ha ụra chaachaa.
Ihe ndị bi ebe ahụ kwuru
Ebe foto si, Facebook/Amawbia City
Otu onye bi n'Agulu aha ya bụ Emmanuel Offor gwara BBC na onwebeghị ihe dị iche ya hụrụ n'okirikiri ebe ahụ.
O kwuru sị: "O nwebeghị ihe dị otu a m hụrụ maọbụ nụ na ntị"
"Ana m aga Awka, Nwaagu na Ekwulobia oge ọbụla, mana onwebeghi ihe m hụrụ. Egwu ọbụla anaghịkwanụ atụ ndị mmadụ ebe a."
Onye ọzọ anyị na ya kpara nkata kwuru na ọ bụ na redio ka ya nụrụ ebe otu ụkọchukwu ndị ụka Anglican na-ekwu ihe gbasara ya.
Mana ya ahụbeghi ihe dị otu ahụ n'okirikiri ebe o bi.
Ebe okwu a si malite
Ebe foto si, Twitter screengrab
Akụkọ gbasara mbata ndị Ugwu n'Anambara malitere ifesa oge otu onye tinyere ihe onyonyo na soshal midia.
O kwuru na ya hụrụ ndị Awụsa ruru narị anọ ka ha gbakọrọ n'otu ebe a kpọrọ 'Ama Awụsa' n'Amawbia, si ebe ahụ na-abanye obodo ndị ọzọ dị iche iche.
O gosikwara ndị nọ n'elu ọgbatumtum, bụ ndị ọ sị na ha bụ ndị Awụsa na-abanye obodo dị icheiche.
Onyeisi ndị otu 'Indigenous People of Biafra' bụ Nnamdi Kanu, ji ya bụ ihe onyonyo mee mgbasaozi ya na Facebook na-ekwu na ndị Fulani na-akwado ịwakpo ala Igbo.
Mana Don Adinuba kwuru na ya bụ ihe onyonyoo enweghị isi.
Akụkọ ga-amasị gị:
Isi akụkọ
Kọwaara m isi akụkọ
Akụkọ akachasị gụọ
Content is not available