Ihe mere ndị Otu 'Village Boys Movement' jiri zọọ njem n'Anambara Steeti

Ebe foto si, Village Boys Movement
Ngalaba otu 'Village Boys Movement' n'Anambara Steeti azọọla njem okporoụzọ n'isi obodo steeti ahụ bụ Ọka.
Ha kwuru na nke a bụ iji gosipụta nkwado ha nye Maazị Peter Obi dịka a na-eche maka ntuliaka a ga-ahazi na Naịjirịa n'afọ 2027.
Dịka ha siri kwuo, e hiwere otu ahụ iji kpọkọta ndị nkwado nakwa ndị ga-atụnyere Peter Obi vootu n'oge ntuliaka.
Ndị otu 'Village Boys Movement' zọrọ njem site n'okporoụzọ Amawbia banye n'Eke Awka, UNIZIK Junction ma pụta n'Aroma.
Onye nchịkọta otu 'Village Boys Movement' n'Anambara Steeti bụ Pedro Ofodile kwuru na ebumnobi ihe omume ahụ bụ iji kwupụta na ndị otu ahụ kwụ chịm n'Anambra Steeti, ma jirikwa ya kwupụta nkwado ha nye Peter Obi.
Dịka Maazị Ofodile siri kwuo, ndị otu ahụ lekwasịrị anya n'ịkpọkọta ndị nọ n'ime ime obodo, iji mee ka ha mata nke ekwe na-akụ gbasara ntuliaka.
Ọ gbakwunyere na ndị 'Village Boys Movement' nwere olileanya n'ohere Peter Obi nwere na ntuliaka afọ 2027.























