Echichi 'Igwe Ndigbo' e chiri Solomon Ogbonna Eziko na Saụt Afrịka ebutela ngagharịiwe megide ndị mbịarambịa

Ụmụafọ Saụt Afrịka na-eme ngagharịiwe megide 'Igwe Ndigbo' na East Lọndọn echichi e chiri nwafọ Naịjirịa.

Ebe foto si, SABC Screenshot

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ọgbaghara na ngagharịiwe adapụtala na mpaghara East London dị na mba Saụt Afrịka megide echichi e chiri nwafọ Naịjirịa bụ Solomon Ogbonna Eziko dịka 'Igwe Ndigbo' na Saụt Afrịka.

Nke a na-abịa dịka ndị ndu ọdịnala na mba Saụt Afrịka were iwe ma katọọ echichi ahụ e chiri nwamadị a.

Ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia gosiri ka ọtụtụ ụmụafọ mba Saụt Afrịka na-eme ngagharịiwe na-awakpo ụfọdụ ụlọahịa ndị mbịarambịa na mba ha nwee.

Ụmụafọ Saụt Afrịka na-eme ngagharịiwe megide 'Igwe Ndigbo' na East Lọndọn echichi e chiri nwafọ Naịjirịa.

Ebe foto si, SABC Screenshot

Akụkụ kwuru na a gbaala ụgbọala ruru iri na atọ ọkụ, ọtụtụ ụlọahịa ndị mmadụ nakwa ihe ndị ọzọ ọkụ.

E chiri nwamadị a echichi ahụ na mpaghara KuGompo dị na mpaghara East Lọndọn mba Saụt Afrịka n'ụbọchị Satọde 14 Maachị 2026.

Ndị ndu ọdịnala mba ahụ a kpọrọ 'Eastern Cape House of Traditional and Khoi-San Leaders' kwuru na echichi ahụ megidere iwu na-achịkwa omenala ha.

"Agwa a bụ mkparị ma megide iwu na-achị mba Saụt Afrịka ma nwereike ọgbaghara n'etiti ndị ndu," ka ndị a kwuru ma sị na ọ bụ naanị ndị ndu ọdịnala ha nwere ikike ichi mmadụ echichi.

Ndị ndu a gara n'ihu kwuo na ụmụafọ Naịjirịa kpara agwa a ga-arịọ ha mgbaghara ma kposaa echichi ahụ e chiri nwamadị a.

Nkọwa otu Ohaneze Ndigbo na Saụt Afrịka yere

Ọhaneze Ndigbo bụ otu jikọtara ndị Igbo na mba Saụt Afrịka akọwaala ihe mere na East London, mba Saụt Afrịka ebe ọgbaaghara dapụtara ka e chichara echichi "Igwe Ndigbo" na mpaghara ahụ.

N'akwụkwọ ozi Odeakwụkwọ Ọhaneze Ndigbo bụ L.K Ashinze na Onyeisi ha bụ ABC Okokoh wepụtara ka ha kọwara ihe ha mere.

Ha kwuru na e nwere ihe dị iche n'echiche "ìgwè ndigbo' ahụ na-ese okwu na "echichi Igwe maọbụ "eze obodo".

N'okwu ha "echiche anyị chịrị abụghị eze obodo, kama ọ bụ onye nlekọta ndị Igbo bi na mpaghara ahụ na Saụt Afrịka.

"Enweghị oge anyị ji guzobe obodo, maọbụ wepụta ala ọbụla kpọọ ya nke anyị na mba Saụt Afrịka".

"Anyị bụ ndị ọbịa na Saụt Afrịka. Ala nna anyị bụ ala Igbo, na Naịjirịa".

"Ihe anyị mere bụ ịhọpụta onye ndu anyị ga-ahazi ma jikọta anyị ọnụ na na-ahụ maka ọdịnaala nakwa njirimara ndị Igbo".