Lee ihe ndị ọzọ gọọmentị kwụsịrị inye ego maka ịtụbata na Naịjirịa

Ebe foto si, Facebook/Femi Adesina and Getty
Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ekwuola na ụloakụ etiti bụ "Central Bank of Nigeria" agaghị enye ndị na atụbata ihe oriri maọbụ fetịlịza ego ofesi.
Buhari kwuru nke a n'oge ya na ndị otu "National Food Security Council" nwere ọgbakọ n'Obi Gọọmentị dị n'Abuja.
Dịka ọnụ na-ekwuru Buhari bụ Garba Shehu siri kwuo, Onyeisiala Naịjirịa sị ka CBN ghara ịnye ndị na-atụbata fetịlịza na nrị "ma otu kobo" site n'ego ofesi dị n'akpa ego Naịjirịa.
Ọbụghị ugbua bụ mbụ Onyeisiala Buhari kwuru ụdịri ihe a. N'ọnwa Ọgụstụ 2019, o kwukwara ya.
N'uche Buhari, inye ego ga-enye ndị na-ebubata ihe ndị a ohere ịkpagbu ndị na-emepụta ya na Naịjirịa.
Mana, Chidi Ike bụ onye si ofesi atụbata ihe sị na okwu Onyeisiala Buhari adịghị iche n'ihe Naịjirịa na-emebu.

Ebe foto si, BBC Good Food
Ọ sị: "Onweghi ihe ọhụrụ dị n'ihe a Onyeisiala Buhari kwuru. Anaghịbu enye ndị na-ebubata nrị na fetịlịza dọla."
Ọ gakwara n'ihu kwuo na ọ bụ sọsọ puku dọla iri abụọ ka a na-eresi ndị chọrọ ibubata akụrụngwa ọbụla.
"Ọ puku naira iri abụọ ka a na-eresi ndị mmadụ n'ime ọnwa atọ. Kedụ ihe ego a ga-ezuru onye na-atụ mgbere nde kwa nde?"
Kedụ ihe gọọmentị Naịjirịa machiri?
BBC hụrụ akwụkwọ ebe e depụtara ihe gọọmentị Naịjirịa kwuru na ha agaghị enye ego maka ya.
Ngwa ahịa ndị a gụnyere osikapa, mmanụ nri, tomato, anụ na ndị ọzọ.
Ọ bụ ihe iri anọ na otu (41) dịbụ na mmachi a oge gọọmentị Naịjirịa wepụtara ya n'afọ 2015, mana o ruola iri anọ na anọ (44) ugbua.
Ihe ndị o metụtara kwuru

Ebe foto si, AFP
Otu na-ahụ maka ndị na-emepụte akụrụngwa na Naịjirịa bụ "Manufacturers Association of Nigeria" sị na atụmatụ ọhụrụ a ga-eme ka ọnụahịa ihe dị icheiche gbalie elu.
Ha sị na nke a bụ makana Naịjirịa agaghị akọpụtanwu nri ga-ezuru ndị nọ bi n'ime ya.
Ndị MAN kwukwara na ha ka ga-achọkwa dọla ha ga-eji bubata akwụrụngwa ha ji arụ ọrụ.
Ihe Onyeisiala Buhari jiri tinye Fetịlịza n'ihe ha agaghị ịkwado mbubata ya?

Ebe foto si, AFDB
Ebumnobi Onyeisiala Buhari, dịka o si dị n'ihe o kwuru, bụ na Naịjirịa nwere ala ma nwee ndị ike di ịkọ nri.
Ọzọ bụkwa na ụlọ ọrụ na-arụpụta fetịlịza na Naịjirịa eruola iri atọ na atọ (33), site na mkpụrụ atọ ọ dịbu.




























