SASA anwụchiela onye oziọma n'Anambara Steeti maka idina nwata nwaanyị n'ike

SASA anwụchiela onye oziọma n’Anambara Steeti maka idina nwata nwaanyị n’ike

Ebe foto si, ABS

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Otu pụrụiche na-ebu agha megide omume ọjọọ a kpọrọ Special Anti-Touting Squad Anambra State (SASA) anwụchiela onye hiwere ụlọ ekpere Jesus Is Ontop Ministry dị n'Amichi bụ Dozie Favour Ezeani.

Ndị ọrụ SASA nwuchiri Dozie Ezeani maka ebubo idina nwata nwaanyị dị afọ iri na isii (16) n'ike.

Oge ọ na-egosi ndị ntaakụkọ onye oziọma ahụ a na-enyo enyo n'isi ụlọọrụ otu SASA dị n'Ọnịcha, Nnukwu Onyeisi otu ahụ bụ Monday Nwokoye kwuru na ọ bụ onye ọrụ nchekwa si Igboukwu mere ka ha mata nke a.

Maazị Nwokoye kwuru na site na mkpesa ahụ ndị otu ya nwetara, a gara nwuchie Ezeani ma nyefee ya n'aka ndị uweojii maka ime nnyocha.

Ọ kọwara na onye nlekọta nwata nwaanyị ahụ nyefere ya n'aka Dozie Ezeani maka ihe ọ kọwara dịka "nnapụta pụrụiche", mana onye oziọma ahụ hapụrụ ọrụ e dunyere ya, dinaa nwata nwaanyị ahụ ugboro ugboro, ma tụwa ya ime.

Dịka nwata nwaanyị ahụ siri kwuo, Dozie Ezeani metọrọ ya ọtụtụ oge, kemgbe a kpọgara ya n'ụlọ nwoke ahụ n'ọnwa Nọvemba 2025 maka ekpere nnapụta, bụ nke onye nlekọta ya mere n'ike aka ya na-ebughị ụzọ nata nkwado n'aka nne ya.

O kwuru na e metọrọ ya ọtụtụ oge nakwa n'ebe dị iche iche, gụnyere n'ime ụlọụka, n'ime ọhịa nakwa n'ime ụlọ, ruo mgbe ndị ọrụ SASA napụtara ya.

Nwata nwaanyị ahụ kwukwara na o nwere ihe onye oziọma ahụ nyere ya iji tepụ afọ ime, bụ nke na-ebutere ya ihe mgbu na ịgba ọbara.

Oge ọ na-ekele ndị SASA maka ịnapụta ya, ọ rịọrọ ka a gbatara ya ọsọ enyemaka iji nweta ezi nlekọta ahụike, n'ihi na o nweghị ka ọ ha ndị ezinaụlọ ya.

Na nzaghachi, onye ahụ a na-enyo enyo bụ Maazị Ezeani kwetara na ya dinara nwata nwaanyị ahụ ọtụtụ oge n'ihi na ọ bụghị ya na nwunye ya bi.