Taoufik Makhloufi, 33
Taoufik Makhloufi bụ ọgbaọsọ (ọsọ mịta 800 na 1,500 ).
O ritere ọla edo n'Olympik mbụ ya nke Lọndọn n'ọsọ 1,500m ya na ọla ọcha abụọ n'Olympik Rio 2016.

Ebe foto si, Getty Images
A malitela emume mmepe asọmpi Olympics 2020 nke na-eme na Tokyo dị na mba Japan taa bụ Fraide abalị 23 nke ọnwa Julai afọ 2021.
Ọtụtụ mba ruru iri ise na otu bịara ya bụ asọmpi ji ọkọlọtọ ha dị iche iche na-efe dịka ha na-egosi ụwa onwe ha.
Mba ndị dịka Greece bụ ndị bu ụzọ gosi onwe ha site n'ife ọkọlọtọ ha ebe mba Japan bụ ndị na-ahazi ga-abụ ndị ikpeazụ.

Ebe foto si, Getty Images
Mba Jamini nọkwa n'egwu

Ebe foto si, Getty Images
Mba Itali pụtakwara n'egwu igosi ụwa ihe ha jiri biri.

Ebe foto si, Getty Images
Mba Briten gosikwara na ha abụghị ndị ikpeazụ n'okwu banyere asọmpi Olympic

Ebe foto si, Getty Images
Ihe I kwesịrị ịma maka egwuregwu Olympics Tokyo 2020

Ebe foto si, Getty Images
Kamgbe a malitere egwuregwu a kpọrọ Olimpik n'afọ 1896 na mba Greece, onwebeghị nke dịka nke Tokyo 2020.
Otu okpụrụkpụ ihe kpatara nke a bụ n'ihi ọrịa ọjọọ coronavirus maọbụ covid19.
Taa bụ Fraịde, abalị 23 nke ọnwa Julaị 2021, ka asọmpi nke afọ a na-amalite n'uju.
Ndị Afrịka a bụ ndị ejiri nọchite anya mpaghara dị iche iche n'Afrịka. A họpụtara ha dịka etu asọmpị Olympik sirimetụta ha ya na ntụruugo ole ha nwetarala ma etu egwuregwu ha na-eme siri pụo iche.


Ebe foto si, Getty Images
Ndị Naịjirịa ga-eso n'asọmpi Olimpik 2020

Ebe foto si, friendsofnb/Instagram
Naịjirịa mmadụ iri isii (60) ga-anọchi anya Naịjirịa n'asọmpi 'Olympics' nke afọ a.
Asọmpi ha ga-esonye na ya gụnyere: 'Basketball' (ụmụnwoke na ụmụnwaanyị, 'Artistic Gymnastic', na 'Athletics' (Ọsọ, ịwụli elu, ịtụ ihe ọtụtụ).
Ndị ọzọ bụ: 'badminton', mgba, mgba takwando, ịkpa ụgbọ, ọsọ ụgbọ mmiri (canoe sprint), igwu mmiri, na tebulu tennis.

Ebe foto si, Getty Images
Onye bụ onye ndu (captain) otu Naịjirịa n'Olimpik afọ a bụ Aruna Quadri na-apịa tebulu tenis.
Nke a bụ 'Olimpik' nke atọ Aruna Quadri na-agara Naịjirịa
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post
Ndị otu basketball Naịjirịa enwetaghị akwa ha ga-eyi n'asọmpi a n'oge, dịka ndị 'custom' jichiri ya ogologo oge dịka e si mba Chaịna tụlata ya.
Ọ bụ ndị a na-akụ basketball ji aka ha zụtara onwe ha akwa dịka ha na-eme nkwado ha.
A na-akwụ mmadụ ụgwọ maka i turu ugo n'asọmpi Olimpik?

Ebe foto si, Getty Images
E nweghị ego ndị na-ahazi egwuregwu Olimpik na-akwụ onye ritere ọla ọcha, ọla edo maọbụ ọla nchara.
Mana mba dị icheiche mapụtara ego ha na-akwụ, maọbụ ihe ndị ọzọ ha na-emere ndị tuteere ha ugo na ya bụ asọmpi.
Iji maa atụ, mba Amerịka na-akwụ $37,500 maka ọla edo, $22,500 maka ọla ọcha, na $15,000 maka ọla nchara.
Mba dịka Singapore na-akwụ ndị be ha otu nde dọla maka ọla ọcha, ebe mba Indonesia na-enye ndị nke ha $750,000 maka ọla edo.
Odochabeghị anya ego ole gọọmentị Naịjirịa ga-eji tie onye ritere ọla ọbụla n'Olimpik nke afọ a aka n'obi.
Mana n'egwuregwu nke mba Afrịka (African Games) e mere na Morocco na 2019, gọọmentị Naịjirịa nyere ndị tuuru ugo $3000, $2000 na $1000 maka ọla edo, ọla ọcha na ọla nchara n'otu n'otu

Ebe foto si, friendsofnb/Instagram
Otu onye kwesịrị ka a kwanyere ya ugwu n'ụzọ pụrụ iche n'Olimpik nke afọ a bụ Mike Brown.
Otu 'basketball' Naịjirịa na-emezi nnọọ nke ọma ugbua n'ihi nwa amadi a bụ onye nkuzi ha.
Mike Brown anaghị eri ụgwọ ọnwa ọbụla dịka ọ na-akuziri ndị Naịjirịa ugbua, kama o kwuru ka e were ụgwọ ọnwa ya na-akwalite egwuregwu 'basketball' na Naịjirịa.
Ọ bụkwa ya mere ọtụtụ ụmụ Naịjirịa a mụrụ na mba ofesi jiri kweta ịkụrụ Naịjirịa bọọlụ.
Ihe i kwesịrị ịma maka Mike Brown

Ebe foto si, Getty Images
Taoufik Makhloufi bụ ọgbaọsọ (ọsọ mịta 800 na 1,500 ).
O ritere ọla edo n'Olympik mbụ ya nke Lọndọn n'ọsọ 1,500m ya na ọla ọcha abụọ n'Olympik Rio 2016.
Wali Bidani bụ onye ọkpụ ụzụ mba Ọljiria onye gara egwuregwu Olympik mbụ ya na London 2012 ma nke abụọ ya na Rio 2016
Azenaide Carlos bụ onye ọkụụ haanbọọlụ ma bụrụ kwa onye otu ụmụ nwaanyị na-akụrụ mba Angola haanbọọlụ ndị a na-akpọ The Pearls
O sorola n'egwuruegwu asọmpị OLympik atọ kemgbe 2008
Nijel Amos bụ onye ọsọ mba Botswana nke ritegoro ọlaọcha n'ọsọ ụmụ nwoke nke 800 Mitas n'egwuregwu Olympik London 2012
Aswọmpi egwuruegwu Tokyo 2020 ga-abụ asọmpị Olympik atọ ya.
Hugues Fabrice bụ onye egwuruegwu nwụlị elụ nke mba Borkina Faso, nke ritegoro ọla nchara na egwuruegwu asọmpị ụwa nke afọ 2019
Francine Niyonsaba bụ onye oso mba Burundi nke ritere ọlaọcha ole na ole n'egwuruegwu asọmpị Rio 2016 nakwa egwuruegwu ọsọ ụmụ nwaanyị mba ụwa nke 800 mitas.
Cheick Cisse ritere nturu ugo pụrụ ịche na egwuruegwu asọmpị Riyo 2016 ebe o ritere ndị mba ya ọlaedo mbu
Ọ bụ kwa onye mba Afịrịka nke mbụ ritere nturu ugo ọlaedo na mgba Takwando mba ụwa
Marie-Josée Ta Lou bụ onye ọsọ mba Côte D’Ivoire nke ọsọ 100 Mitas na kwa 200 Mitas
Ọ ritere ọla nchara n'ọsọ 100 mitas n'asọmpị ndị ọsọ ụwa niile nke afọ 2019 ma gbata onye nke anọ n'asọmpị Olympik Rio 2016 n'asọmpị 100m na 200m
Hardy Morsy bụ onye egwuregwu Pentathlon agba ọhụrụ ma bụrụ kwa ọkaibe n'ịgwu mmiri na ịnya ịnyinya
Tokyo Olympik 2020 bụ egwuregwu Olympik nke abụọ ya
Azmy Mehelba bụ onye ọgbaa egbe mba Ijipt na-abịa asọmpị OLympik nke atọ ya na Tokyo 2020
O rityere ọla edo n'asọmpị ịgba egbe nke ISSF n'ọnwa Mei, 2021
Giana Farouk bụ onye mba Ijipt na-agba Karate ma Olympik nke Tokyo 2020 bụ nke mbụ ya
O ritere ọla edo na asọmpị Karate afọ 2016 ma rite kwa ọla nchara n'asọmpị Karate nke ụwaniile 'afọ 2018
Merhawi Kudus bụ onye Eritrean dị afọ 27 gbara onye nke atọ n'asọmpị ịnya ịnyinya igwe nke otu onye e mere na mba Turkey n'afọ 2019.
O meriri nwale otu onye nke afọ 2021 nke mba Eritrea ma gbaa kwa onye nke abụọ na nchịkọta ya bụ nwale. Tokyo 2020 bụ asọmpị Olympik nke mbụ ya
Tokyo 2020 bụ Olympik mbụ Amanuel Gebreigzabhier. Onye a sịọ mba Eritrịa na-anya ịnyịnya igwe meriri asọmpị nke African Road Championship n'afọ 2018
Mosana Debesay bụ nwaanyị mba Eritrịa na-anya ịnyịnya igwe ma merie kwa asọmpi African Road Championship nke afọ 2019 ya na ntuli nke otu onye asọmpị African Road Champiosnhip n'afọ 2018
Ọ bụ nwanne Mekseb Debesay na-anya kwa ịnyịnya igwe
Letesenbet Gidey bụ onye ọsọ maratọn mba Itiopịa ma bụrụ kwa ọkaibe kachasị. Gidey bụ ọkaibe kachasị na 5,000m ma nsonso a ka ọ mekwara onwe ya ọkaibe kachasị na 10,000m.
O ritere ọla ọcha n'aọmpị 10,000m nke ụmụ nwaanyị n'afọ 2019 n'asọmpi World Athletics Championship.
Selemon Barega bụ onye mba Itiopịa na-agba ọsọ tereaka ritere ọla ọcha n'ọzọ ụmụ nwoke nke 5,000m n'afọ 2019 n'asọmpi World Athletics Championship.
Tokyo Olympik bụ nke mbụ ya
Yomif Kejelcha bụ onye mba Ithiopịa na-agba ọsọ tereaka, Tokyo Olympik bụ nke mbụ ya.
Kejelcha nwetara ọla edo nọsọ ụmụ nwoke nke 3,000m n'afọ 2018 nke asọmpị World Indoor Championship
O ritekwara ọla ọcha n'asọmpị 10,000m n'asọmpị World Athletics Championships nke afọ 2019.
Lelisa Desisa bụ onye ọso Maratọn sị mba Ithiopịa ma bụrụ kwa onye ritere ọlaedo n'asọmpị World Athletics Championship n'afọ 2019
Shura Kitata bụ onye Itiopịa na-agba ọsọ Maratọn
O meiri ọkaibe ọsọ si mba Kenya bụ Eliud Kipchoge were bụrụ onye mbụ n'asọmpị London Marathon n'afọ 2020. Cheta na ọ gbara onye nke abụọ ebe Eluid gbara onye nke mbụ n'afọ 2018.
Gudaf Tsegay bụ onye na-agba ọsọ na etechaghị anya nke 1,500 ma bụrụ ọkaibe kachasị n'asọmpị a nke ime ụlọ na Lievin, Mba Fransị n'afọ 2021.
O ritere ọla nchara n'asọmpị mba ụwa nke afọ 2019
Gina Bass bụ onye ọsọ mba Gambịa meriri ọla edo n'ọsọ 200m n'asọmpị Afrịka niile n'afọ 2019
Egwuregwu Tokyo ga-abụ Olympik abụọ ya
Julius Yego bụ onye mba Kenya na-atụ Javalịn nwetara ọla ọcha n'asọmpi Olympik nke Rio 2016
A na-akpọ kwa ya Mazi Youtube n'ihi na ọ bụ na ihe onyonyo a ka o si mụta etu esi atụ Javalịn nke ọma.
Brigid Kosgei bụ onye mba Kenya na-agba ọsọ Maratọ ma merie Maratọ obodo Chikago n'afọ 2018 na 2019 ma meriekwa Maratọn nke Lọndọn n'afọ 2019 na 2020.
BKosgei bụ ọkaibe kachasị dịka o ji oge 2:14:04 gbachaa ọsọ Chikago Maratọn n'afọ 2019. Egwuregwu Tokyo Olympik bụ nke mbụ ya.
Beatrice Chepkoech bụ ọkaibe n'egwuregwu Steeplechase
Onye a na-agba ọsọ tereaka ji ọla edo n'egwuregwu 3,000m steeplechase n'afọ 2019 n'asọmpị ụwa niile
Faith Kipyegon bụ onye na-agba ọsọ tereaka ritere ọla edo n'asọmpị Olympik nke Rio 2016 n'egwuregwu 1,500m.
O ritere ọla ọcha n'asọmpị ụwa niile n'afọ 2017 ma ritekwa ọla ọcha ọzọ n'asọmpi World Athletics Championship n'afọ 2019.
Khadija Mardi bụ nwaanyị si mba Moroko na-akụ okpọ. O soro n'asọmpi Olympik nke afọ 2016 na Rio kama emeriri ya n'asọmpị osote nke ikpeazu (69-75kg).
O ritere ọla nchara n'asọmpị World Boxing Championship nke afọ 2019.
Rababe Arafi ritere ọla edo n'asọmpị ọsọ nke 1500m n'asọmpi IAAF Diamond League n'afọ 2019.
Olympik Tokyo 2020 ga-abụ nke abụọ ya
Ramzi Boukhiam bụ ọkaibe ịnya ebili mmiri
Ọ ga-anọchịte anya Moroko n'asọmpị mpụ Olympik nke ebili mmiri
Soufiane El Bakkali bụ onye mba Moroko jị ọla edo ọcha n'egwuregwu 3,000m nke steeplechase n'asọmpị IAAF nke mba ụwa niile n'afọ 2017.
Egwuregwu Olympik Rio 2016 bụ nke mbụ ya.
Maria Machav bụ onye mba Mozambik na-anya ụgbọ mmiri ga-anọchịte anya mba ya n'Olympik mbụ ya n'egwuregwu ịnya ụgbọ mmiri na Tokyo Olympik.
Deisy Nhaquile bụ onye si mba Mozambik na-anya ụgbọ mmiri ma asọmpi Toky 2020 ga-abụ nke mbụ ya
O meriri asọmpị African Sailing Championship nke agba 420 Radial Laser.
Denise Parruque bụ onye mba Mozambik ma Tokyo 2020 ga-abụ Olympik mbụ ya.
Ya na Maria meriri asọmpị 2019 nke agba 470 Regatta.
Maike Diekmann bụ onye mba Namibịa ga-asọ asọmpị Tokyo 2020 nke mbụ
Beatrice Masilingi bụ onye ọsọ si mba Namibịa nke ọsọ 400m, Ọ bụ onye nke atọ kachasị agba ọsọ n'ụwa niile n'ime ọge 20.
Kama ọ gaghị eso na asọmpị a maka etu testosterone dị ya n'ahụ siri dị elu kama ọ ga-agba n'asọmpị nke 200m.
Christine Mboma bụ onye mba Namibịa bụ ọkaibe kachasị n'ọsọ 400m n'ụwa niile nke ndị na-erubeghị afọ 20 n'afọ 2021
Kama ọ gaghị eso na asọmpị a maka etu testosterone dị ya n'ahụ siri dị elu kama ọ ga-agba n'asọmpị nke 200m.
Aminatou Seyni bụ onye ọsọ si mba Nijee zọrọ asọmpị World Championship n'afọ 2019.
Blessing Okagbare bụ onye mba Naijirịa na-agba ọsọ ma na eme kwa Lọọnụ Jụmpụ.
Ọ ya bụ ọkaibe kachasị ji oge timkom timkom 10.75 n'ọsọ 100Mita kama ọ gbara karịa ya n'oge 10.63 mgbe a na-eme nhọpụta ndị ga-aga Tokyo 2020
Oge a bụ mbụ onye si Naijirịa maọbụ Afrịka na-enweta ma oge ya na nke Shelly-Ann Frasers-Prce bụ zị nhata nha ugbua.
Elizabeth Anyanacho bụ nwaanyị nke abụọ tozuru ịga asọmpị Olympik ma bụrụ kwa nwaanyị nke mbụ n'ime afọ 16 ịga Olympik n'egwuregwu Teikwando
Asọmpị Tokyo 2020 ga-abụ Olympik mbụ ya.
Ọ ya bụ nanị onye Naijirịa ruru agba na-esote nke ikpeazụ n'asọmpị ọsọ ụmụ nwoke
Tobi Amusan bụ onye Naijirịa na-agba ọsọ nkịtị na nke họdụlụ ritere ọla edo n'asọmpị 100m họdụlụ nke ụmụ nwaanyị n'asọmpị Commonwealth nke Goldcoast 2018 na mba Australia.
Ọ zọro asọmpị Olympik nke Rio 2016 ma ruo agba na-esote nke ikpeazụ, ọ bụ obere ihe mere ka ọ hapụ iso n'agba nke ikpeazụ dịka o ji 12.91 timkom timkomgbaa onye nke atọ
Ese Brume sọ n'ụmụ nwanyị atọ wụfere 7m maọbụ karịa.
Asọmpị Rio 2016 bụ Olympik mbụ ya ebe ọ gbara onye nke atọ.
O ritere ọla nchara n'asọmpị World Athletics Championship n'afọ 2019.
Chukwuebuka Enekwechi bụ onye Naijirịa na-atụ shọtụ Putu ma rite kwa ọla ọcha n'asọmpị Commonwealth nke afọ 2018.
Ọ gbara onye nke asatọ n'asọmpị mba ụwa niile nke afọ 2019 ma bụrụ nanị onye sitere Naijirịa rụterela agba a.
Usheoritse Itsekiri bụ onye Naijirịa na-agba ọsọ ma rite kwa ọla nchara n'asọmpị ụmụnwoke nke 100m na Rabat n'asọmpị African Games n'oge timkom timkom10.02.
Esther Toko bụ onye Naijirịa riterela ọla nchara na ọla edo na Cape Verde n'asọmpị African Beach Games n'afọ 2019.
Tokyo ga-abụ Olympik mbụ Toko ma bụrụkwa onye mbụ sitere Naijirịa ga-anọchịte ha n'asọmpị ịkpa ụgbọ nke Olympik.
Ayomide Emmanuel Bello ga-aga asọmpị Olympik mbụ ya ma bụrụkwa nwaanyị mbụ sị Naijirịa ga-eso n'asọmpi ụgbọ epeepe.
Bello riteburu ọla edo anọ n'asọmpi Rabat 2019 nke African Games na nke c-1 200m, C-1 500m, C-2 200m na C2 500m.
Rodney Govinden ga-anọchite anya mba Sechels n'asọmpi Olympik Tokyo 2020.
Nke a bụ Olympik abụọ ya dịka o so n'asọmpi Rio 2016. Ọ bụ ya bụ onye egwuregwu kachasị na mba ya n'afọ 2019
Wayde Van Nierkerk bụ onye ọgba ọsọ mba Saụt Afrịka ritere ọla edo n'asọmpị Rio 2016 n'ọsọ nke 400m
Ya bụ ọkaibe kachasị dịka o ji oge timkom timkom 43.03 were kụpụ Michael Johnson nke mba Amerịka dịka ọkaibe.
Chad le Clos bụ onye mba Saụt Afrịka na-egwu mmiri ma rite kwa ọtụtụ ihe nrite nke gụnyere otu ọla edo na London 2012 ọlympịk ma ọla ọccha abụo na Olympik Rio afọ 2016.
Akani Simbine bụ onye mba Saụt Afrịka na-gba ọsọ ma rite kwa ọla edo n'ọsọ 100m nke ụmụ nwoke n'asọmpị Commonwealth Games nke afọ 2018.
Ọ gbara onye nke anọ n'asọmpị mba ụwa niile nke afọ 2019
Tokyo 2020 bụ Olympik mbụ Caitlin Rooskrantz .
Onye a meiri n'asọmpị African Artistic Gymnastic Championship n'afọ 2018 ya na Artistic Gymnastic World Cup Challenge e mere na mba HUngary n'afọ 2019.
Tokyo 2020 bụ Olympik mbụ Caitlin Rooskrantz .
Erin Sterkenburg bụ onye mba Saụt Afrịka ma bụrụ kwa naanị onye Afrịka na-eri elu ga-eso n'otu n'ime asọmpị ise ọhụrụ etinyere n'Olympik nke Tokyo 2020
Nwaanyị a meriri asọmpị IFSC nke Afrịka.
Henri Schoeman bụ onye mba Saụt Afrịka ritere ọla edo n'asọmpị ụmu nwoke nke Tritalọn nke Commonwealth games nke Gold Coast.
O ritere ọla nchara n'egwuregwu Trịtalọn nke Olympik Rio 2016
Boipelo Awuah bụ onye mbụ ga-anọchite anya mba saụt Afrịka na Sket Bọdịn n'Olympik ma bụrụ kwa onye kachasị bụrụ nwata ga-anọchite anya Afrịka.
Otu egwuregwu Rụgụbi nke asaa nke mba Saụt Afrịka eji Blitzboks mara ritere ọla nchara n'Olympik Rio 2016.
Ha gbara ndị nke abụọ n'asọmpị Iko Rugby Sevens n'afọ 1997.
Oussama Mellouli bụ onye mba Tunishịa na-egwu mmiri tereaka ma rite kwa ọla edo n'asọmpị 1500m nke ụmu nwoke n'asọmpị Olympik nke Beijing 2008 ya na Maratọn ịgwụ mmiri nke ụmụ nwoke nke 10km na egwuregwu Olympik London 2012.
Marwa Amri bụ nwaanyị Tunishia na-agba mgba ma rite ọla nchara na Rio 2016 na asọmpị nke ụmu nwaanyị ma bụrụkwa onye Afrịka mbụ bụ nwaanyị ritere ntụrụugo na mgba Olympik.
Ines Boubakri bụ nwaanyị si mba Tunishịa na-akpa mma ma rite kwa ọla nchara n'ịkpa mma nke Rio 2016.
Jacob Kiplimo bụ onye mba Yuganda so n'asọmpị ọsọ umu nwoke nke 3000m nke IAAF Diamond League Golden Gala afọ 2020.
Tokyo 2020 ga-abụ Olympik abụọ ya dịka o soro na nke Rio 2016.
Ronald Musagala bụ onye Yuganda na-agba ọsọ nke Rio 2016 bụ Olympki mbụ ya.
O ritere Ola edo n'asọmpị Diamond Leagues nke London na Paris.
Joshua Cheptegei bụ onye ọgba ọsọ tereaka ritere ọla edo n'ọso ụmụ nwoke nke 10,000m n'asọmpị World Athletics Championship n'afọ 2019 ma hiwe kwa oge ọhụrụ kachasị
Peruth Chemutai bụ onye mba Yuganda na-agba ọsọ Steeplechase. Ọ gbara asọmpị Rio 2016 nke ụmu nwaanyị nke 3,000m.
Ọ gbara onyw nke ise n'asọmpi 3000m nke ụmụ nwaanyị nke ikpeazụ na World Athletics Championships.
Otu egwuregwu mba Zambia nke ụmu nwaanyị a na-akpọ Copper Queens maọbụ She-Polopolo ga-agba asọmpịk OLympik mbụ ha na Tokyo 2020.
Scott Vincent ga-agba Olympik mbụ ya na Tokyo 2020. N'afọ 2019, onye Zimbabwe a na-akụ Gụlfụ n'asọmpị Japan Open Golf Championships.
Otu D'Tigers nke Naijirịa bu nanị otu ga-anọchite anya Afrịka n'Olympik Tokyo 2020 maka asọmpị FIBA nke ụwa niile.
Otu D'Tigers nke Naijirịa bu nanị otu ga-anọchite anya Afrịka n'Olympik Tokyo 2020 maka asọmpị FIBA nke ụwa niile.
Otu a bụ Okaine 'Afrịka meriri mba USA na Ostralịa n'ọnwa Juli afọ 2020 mgbe ha zutere n'asọmpi nkwado Olympik.
Otu ụmu nwanyị nke Bọọlụ aka mba Angola eji The Pearls mara bụ kwa ọkaibe n'Afrịka n'asọmpị African Women Handball Championship nke afọ 2021.
Ha gbara ndị nke asatọ n'asọmpị Rio 2016 dịka a gbapụrụ ha na osote osote agba nke Ikpeazụ.
Usoro
Ndị Afrịka a bụ ndị ejiri nọchite anya mpaghara dị iche iche n'Afrịka. Ahọpụtara ha dịka etu asọmpị Olympik sirimetụta ha ya na ntụruugo ole ha nwetarala ma etu egwuregwu ha na-eme siri pụo iche.
NDI MERE YA:
Editorial production by Nkechi Ogbonna, Princess Abumere and Muthoni Muchiri. Design by Olaniyi Adebimpe and Millicent Wachira. Web Developer: Purity Birir. Additional support by: Sally Morales and Celestine Karoney.
FOTO:
Getty Images, The International Basketball Federation, AFP, Nigerian News, Nigerian Rowing Canoeing and Sailing Federation, Nigerianews, Mekseb Debesay, Sailing Club of Mozambique, Giana Farouk, EPA, Press Focus/News Pix via PA, Erwythereyet via Twitter, Bruce Viaene via Olympics, ClimbZA, DW via Club of Mozambique.



















