Nigeria vs Tunisia: Super Eagles anacharala Tunisia ọlanchara

Ebe foto si, Reuters

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Naịjirịa abụrụla ndị ga-erite ọlanchara nke Africa Cup Of Nations (Afcon) nke afọ 2019 site n'otu goolu Odion Ighalo nyere.

Nke a mere ya ugboro asatọ Naịjirịa na-erite ọlanchara n'asọmpi Afcon.

Ighalo gbara aka ahịa dịka onye Tunishia nyere ya "nri chinyere".

Goolu a banyere na nkeji atọ e ji malite ọkara nke mbụ, ka Moez Ben Cherifia mara ụkwa n'ihu poostu ha.

Nke a emeela ka Ighalo bụrụ onye kacha nye goolu n'asọmpi a, nke bụ na ọ ga-enweta akpụkpọụkwụ ọlaedo ma ọ bụrụ na enweghi onye ọzọ nyekarịrị ya.

O nyela goolu ise n'asọmpi Afcon 2019 a.

Nke a bụ tinyere goolu asaa o nyere mgbe Naịjirịa ka na-agba asọmpi iji tozuo bịa asọmpi Afcon.

Ebe foto si, AFP

E ji Victor Osimhen tichie Odion Ighalo dịka ọ zọghiere ụkwụ ma merụọ ahụ.

Ka e bidoro ọkara nke abụọ, ndị Tunishia chị ọkụ bịa, na-agba Naịjirịa ihe a gbachatara.

Mana Firas Chaouat riwara agba ka o rutere n'ihu poostu Naịjiria na nkeji 48.

Ebe foto si, AFP

Ị kwadoro ndị Super Eagles nke Naịjirịa dịka ha zọrọ inweta ọlanchara n'asọmpi Afcon?

Ụfọdụ ndị chị obi n'aka na-ele ka ha mara ma Naịjirịa ọ ga-eme ha obere obi aṅụrị ka ha a ga-eji iru uju laba ụra, mana Naịjirịa nyere ha ihe mere ha obi ọma.

John Mikel Obi so na ndị mbụ gara nata ọlanchara nke ya, dịka ọ bụ ikpeazụ ọ ga-eso Naịjirịa gaa asọmpi.

Lee ihe ndị mmadụ kwuru na Twitter ka Naịjirịa merichara:

Ndị @CAF_Online bunyere ha ụkpa ekele.

@NGSuperEagles kelere ndị Naịjirịa maka ikwado ha ka a na-agba asọmpi a.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

@Omojuwa kọwapụtara ugboro ole Naịjirịa riterela ọlanchara n'asọmpi a.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

@oluwashina kwuru ugboro ole Naịjirịa natara ọlanchara a.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Lee etu e si gbaa egwuregwu a.

Akụkọ ga-amasị gị:

Aha onyonyo, 'Mgbe ihe dị mma anyị na-enweta N2000'