Ihe anyị ma maka mwakpo e mere na Plateau steeti dịka gọọmenti tinyere mmachi abalị abụọ

Ebe foto si, Caleb Mutfwang, Alex Babir/Facebook
Gọọmenti Plateau steeti entinyela mmachi abalị abụọ na mpaghara ọchịchị ime obodo Jos north dịka e mere mwakpo ọjọọ n'ụbọchị Sọnde abalị iri abụọ na itoolu nke ọnwa Maachị 2026 ma gbuo ọtụtụ mmadụ, ebe ụfọdụ merụrụ ahụ n'obodo Gari Ya Waye dị na Anguwan Rukuba.
Kọmishọna na-ahụ maka mgbasaozi na steeti ahụ bụ Joyce Lohya Ramnap sị na gọọmenti katọrọ mwakpo ahụ.
O kwuru na mmachi gọọmenti tinyere malitere n'ime abalị Sọnde ma gaa n'ihu ruo n'abalị mbụ nke ọnwa Eprel.
Ramnap kọwara na mmachi a bụ iji gbochie mmebi iwu ọzọ ebe ndị ọrụ nchekwa na-arụ ọrụ ịchọta ndị aka ha dị na mkpa mkpa ahụ.
Aka na-achi Plateau Steeti bụ Caleb Mutfwang nyere ndị bi ebe ahụ obisiike na e zigaala ndị nchekwa iji chekwaa ndụ ndị mmadụ na ihe onwunwe ha.
Gọọmenti steeti ahụ rịọrịọ ndị mmadụ arịrịọ ka ha nyere ndị nchekwa aka site n'inye ha ozi ga-enyere ha aka na nnyocha ha na-eme
N'ụbọchị Sọnde, ndị ojiegbe nọ n'elu ọgbaatumtum mere mwakpo ma gbaa egbe aghara aghara n'obodo Anguwan Rukuba nke gburu ọtụtụ ndị mmadụ
Dịka e mechara mwakpo a, ndị ntoroọbịa ji iwe mechie okporoụzọ ndị a ma ama na mpaghara ahụ ihe mere nke mere ụfọdụ ndị mmadụ jiri nọrọ n'ụjọ na nke ahụ nwereike ịkpalite nsogbu.
Lee kwa ugboro ole na ole e mere mwakpo na Plateau steeti
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Nkọwaa oge ole na ole e nwere mwakpo na steeti ahụ
Maachị 2025 - Na ngwụcha ọnwa Maachị, mmadụ iri ise na abụọ nwụrụ na mwakpo e mere na mpaghara ọchịchị ime obodo Bokkos
Nkea mere ka onye ndụmọdụ nchekwa Naịjirịa bụ Nuhu Ribadu ji mee njem nleta ebe ahụ ma kwuo ka ogbugbu ahụ kwụsị mana ogbugbu akwụsịbeghị ruo ugbua.
Eprel 2025 - E mere mwakpo ọzọ na mpaghara ọchịchị ime obodo Bassa. Dịka ndị hụrụ ihe mere si kwuo, mwakpo ahụ mere n'ọtụtụ Mọnde.
Akụkọ kwuru na ihe ruru mmadụ iri ise nwụrụ nke gunyere ụmụ nwannyị nakwa ụmụaka.
May 2025 - Ihe ruru mmadụ iri nwụrụ nyere nsogbu dapụtara n'etiti ndị na-achị ehi nakwa ndị ọrụ ugbo.
Ndị ntaakụkọ mpaghara kwuru sị n'ihe malitere dịka ibibi ọrụ ugbo na ịpụnarị ehi, ndị Fulani na ndị Berom mwakporo onwe ha na obodo Dayan dị na Riyom
Ndị na-achị ehi mere mmegwara mwakpo ahụ na obodo Danchindo ma gbuo mmadụ anọ nke mere ndị obodo ji jiri iwe gbuo ehi ruru iri abụọ na isii
Mgbe onye ọbụla chere na ọgwụ ebiela, ndị na-achị ehi mwakporo obodo Wereng Kam ma gbuo ihe ruru isii.
Ọgwụ n'etiti ndị ọrụ ugbo na Fulani bụ nke a na-ahụkọma na mpaghara Plateau na Benue
Julaị 2025 - Ndị ojiegbe gburu mmadụ rụrụ iri abụọ na asaa na Bindi obodo Jebu nke nọ na mpaghara Tahoss ọchịchị ime obodo Riyom.
Otu onye ndu ndị ntorobịa ebe ihe ahụ mere Solomon Dalyop kwuru n'ihe na-eme akpalitela nchekasị obi gbasara nchekwa na obodo ndị dị na Plateau steeti
_______________________________________________________________________________________
Soro BBC News Igbo na Facebook, Instagram, websait na WhatsApp Channel ka i nweta akụkọ niile na-eme na mba ụwa niile.



























