Ndị ọgbaa bọọlụ na Yurop na-enyeghi goolu ọbụla n'afọ a

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Yaya bụ nwafọ Ivory Coast mabuterela ihe nrite ọkacha agba n'Afrịka

Egwuregwu bọọlụ nke afọ a akwakọrọla ọnụ na mba Yurop mana enwere ụfọdụ ndị ama ama na-enyetaghị goolu ọbụla n'otu ha dị icheiche.

Ndị nke na-agba bọọlụ n'Ịngland gụnyere Yaya Toure nke Manchester City, Michael Carrick nke Manchester United, Yohan Cabaye nke Crystal Palace.

Na Spen ha bụ Andres Gomes nke Barcelona, Mateo Kovacic nke Real Madrid, Sulley Muntari nke Deportivo La Coruna.

Ndị nke na-agba na Fransị bụ Lassana Diarra nke PSG.

Nwafọ Naịjirịa na-agba bọọlụ na Malaysia bụ Okechukwu Azuibuike so na ndị a.

Akụkọ ga-amasị gị: