Otu nwoke na-akwado Chelsea awụọla na Ghana
Ebe foto si, Getty Images
Otu nwoke aha ya bụ Emmanuel Offin bụ onye ala Ghana dara n'ala, nwụọ oge Barcelona meriri Chelsea n'asọmpị iko Champions League agbara n'ụbọchị Wenezdee 14 Maachị.
Akụkọ kwuru na mkpamkpa a mere n'obodo Kumasi, oge Offin sị ebe ọ gara ikiri asọmpị a na-alaghachị bee ya.
Ndị ezinaụlọ ya kwuru na Offin dị afọ 24 bụ onye na-akwado Chelsea ọfụma ọfụma.
Ha kwukwara na ọnwụ Offin tụrụ ha niile na-anya nke ukwu.
Chelsea apụọla n'asọmpị iko Champions League n'agba nke 16.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:
Isi akụkọ
Kọwaara m isi akụkọ
Akụkọ akachasị gụọ
Content is not available
{{rankTranslation}}