Uefa: A ga-ama mbe ndị bụ oke n'asọmpi Uefa na Europa
Ebe foto si, Getty Images
Ndị na-ahazi asọmpi Uefa Champịọns ahọpụtala otu egwuregwu dị icheiche ga-ezute ibe ya n'agba kwọta faịnalụ nke asọmpi ahụ.
Iko Uefa Champịọns bụ ọkaibe nke na-esota iko mba ụwa n'iko niile gbasara asọmpi egwuregwu bọọlụ.
Anya otu egwuregwu niile a dị n'ebe iko Uefa Champịọns ahụ nọọ.
Na nhọpụta ahụ emere taa, FC Barcelona ga-ezute AS Roma, Sevilla FC na FC Bayern Munich ga-achịpụya.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:
Juventus na Real Madrid ga-amaaka, ebe Liverpool na Manchester City ga-agba.
Asọmpi ndị ga-abụ n'abalị atọ na anọ nke ọnwa Epurelu.
Ebe foto si, Getty Images
N'aka nke ọzọ ahọpụtakwara otu ga-ezute ibe ha n'asọmpi Europa.
Arsenal ga-ezute CSKA Moscow, RB Leipzig na Marseille, Athletico Madrid na Sporting Liabon ga-achịpụ ya, dịka Lazio ga-anabata Red Bull Salzburg.
Isi akụkọ
Kọwaara m isi akụkọ
Akụkọ akachasị gụọ
Content is not available