Lagos City Marathon: Abraham Kiprotich emeriela

Nkọwa foto, Ma onye ukwu, ma onye nta so gbaa ọsọ a
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ka ọ kwadoro inye ndị meriri n'ọsọ a ihe nrite, Gọvanọ Lagos bụ Akinwunmi Ambode kwuru sị "ike agwụla anyị inye ndị si n'ọwụwa-anyanwụ Afrịka ihe nrite a.

"Anyị ga-ebido itinye uju n'ịzụ ndị Naịjirịa ka ha nwee ike imerinwu maratọn."

Kemgbe ebidoro ịgba ọsọ Lagos City Marathon afọ atọ gara aga, ọ bụ ndị sị ọwụwa-anyanwụ Afrịka na-emeri.

Ihe ruru mmadụ puku otu narị sonyere na-ịgba ọsọ Lagos City Marathon nke 2018 nke bidoro ụzọ ụtụtụ taa.

Ndị mmadụ bidoro ịhapụwa ụlọ ha ebe elekere ise nke ụtụtụ, ebe ụfọdụ pụtara ka ndị ọsọ na-agbafe n'agbataobi ha.

Lekwa ihe ndị pụrụiche BBC hụrụ:

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Nkọwa foto, Nwaanyị yi uwe ndị Hausa a na-akpọ Hijab sokwa gba ọsọ a
Nkọwa foto, Ụfọdụ na-achọghị ịgba ọsọ ji ịnyịnya igwe ha sonye
Nkọwa foto, Ụfọdụ ndị nwere ọlụsị sonyekwara
Nkọwa foto, Ụfọdụ ndị ọcha sokwa gbaa ya bụ ọsọ
Nkọwa foto, Ụfọdụ ndị wepụtara onwe ha maka inyere ndị ihe merụrụ ahụ aka
Nkọwa foto, Otu onye so agba ọsọ kwụsịrị izu ike
Nkọwa foto, Okocha gbaburu Naịjirịa bọọlụ sokwa gbaa ya bụ ọsọ