Atụmatụ ịkwụsị inye ụmụ a mụrụ n'Amerịka ikike ịbụ nwaafọ: Kedụ iwu dị na mba ndị ọzọ?

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Akụkọ kwuru na mba Amerịka na-enye onye ọ bụla a mụrụ na mba ahụ ikike ịbụ nwaafọ ozugbo, mana iwu a abụghị ihe a na-ahụkarị n'ụwa niile.
    • Onye dere ya, Luis Barrucho
    • Ndị mere akụkọ a, BBC World Service
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Ụlọikpe mba Amerịka ga-ekpebi ikpe banyere atụmatụ Onyeisiala Donald Trump nwere ịkwụsị inye ụmụaka a mụrụ na mba ahụ ikike ịbụ nwaafọ site n'ọmụmụ.

Cheta na Onyeisiala mba Amerịka bụ Trump binyere aka n'iwu ndị a n'ọnwa Jenụwarị 20, 2025 - ụbọchị mbụ ọ banyere n'ọchịchị nke ugboro abụọ ya - nke butere nsogbu iwu zuru ebe niile ma mee ka ọtụtụ ezinụlọ ndị si mba ọzọ kwabata n'Amerịka nọrọ n'ọnọdụ obi abụọ.

Chetakwa na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 160, Ndezigharị nke 14 nke Iwu mba Amerịka emeela ka onye ọ bụla a mụrụ n'ala Amerịka bụrụ nwaafọ ozugbo.

Mana iwu Trump na-achọ ịkọwaghachi nkwa ahụ, na-anapụ ụmụaka amụrụ ndị nne na nna ha si mba ọzọ maọbụ ndị batara na mba ahụ n'ụzọ iwu na-akwadoghị maọbụ ndị nwere akwụkwọ njem 'visa' nwa oge ịbụ nwaafọ.

Ikike ịbụ nwaafọ site n'ọmụmụ bụ otu n'ime ụzọ kacha mkpa mmadụ ga-eji erite uru na nchekwa obodo na-enye.

Kedụ ka nke a si atụnyere iwu mba ndị ọzọ dị gburugburu ụwa?

Kedụ etu mba dị iche iche si enye ikike ịbụ nwaafọ?

Ịbụ nwaafọ site n'ọmụmụ, abụghị ihe a na-ahụkarị n'ụwa niile.

N'agbanyeghị, mba dị iche iche nwere iwu na usoro dị iche maka nke a; ụfọdụ na-enye ya onye ọ bụla a mụrụ n'ala ha, ebe ndị ọzọ na-eleba anya n'ebe nne na nna onye ahụ si.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Amerịka bụ otu n'ime ihe dịka mba iri atọ ndị na-enye onye ọ bụla a mụrụ na mba ha ikike ịbụ nwaafọ ozugbo. Mba ndị ọzọ na-eme otu a gụnyere Brazịl, Agentina, Chile, na Meziko.

N'aka nke ọzọ, ọtụtụ mba nọ na mpaghara Eshia, Yurop, na akụkụ ụfọdụ nke Afrịka na-agbaso usoro 'jus sanguinis' nke pụtara inwete ikike ịbụ nwaafọ site n'ọbara, nke pụtara na ụmụaka na-eketa nwaafọ ha site n'aka nne na nna ha, n'agbanyeghị ebe a mụrụ ha.

N'ọmụmatụ, Rọshịa, Indonishia, Japan, Chaịna, Taịland, Vietnam, Naịjirịa, na ọtụtụ mba dị na Middle East na Nọt Afrịka na-eji usoro a.

Indịa na-agbasokwa 'jus sanguinis', ebe Pakịstan bụ mba pụrụ iche n'Eshia nke na-enye onye ọ bụla a mụrụ n'ala ha ikike ịbụ nwaafọ ozugbo.

Mba ndị ọzọ na-eji usoro abụọ a, enye ụmụaka ndị nne na nna ha bi n'ala ha n'ụzọ iwu kwadoro ikike nwaafọ.

Mba ndị na-eji usoro dị iche iche enye ikike a gụnyere mba UK, Pọtụgal, Spen, Fransị, Jamini, Ọstralịa, na Saụt Afrịka.

Ọkammụta n'ihe gbasara mmekọrịta mmadụ na ibe ya na Mahadum California, San Diego bụ John Skrentny, kwenyere na, ọ bụ ezie na ikike ịbụ nwaafọ site n'ọmụmụ maọbụ site n'ebe nne na nna ha si bụ ihe a na-ahụkarị n'Amerịka niile, dịka "mba ọ bụla nwere ụzọ pụrụ iche isi ruo ya".

"Dịka ọmụmaatụ, ụfọdụ metụtara ndị ohu na ndị bụbu ndị ohu, ụfọdụ emeghị. Akụkọ ihe mere eme dị mgbagwoju anya," ka o kwuru. Na mba Amerịka, e tinyere Ndezigharị nke 14 iji lebara ọnọdụ iwu nke ndị ohu a tọhapụrụ anya.

Mgbanwe iwu na mmachi n'ọtụtụ mba

N'afọ ndị na-adịbeghị anya, ọtụtụ mba agbanweela iwu inye ikike ịbụ nwaafọ na mba ha, na-eme ka ikike ịbụ nwaafọ sikwuo ike ma ọ bụ kagbuo ikike ịbụ nwaafọ n'ihi nsogbu gbasara mbata na ọpụpụ, njirimara mba, na ihe a na-akpọ "njem nlegharị anya maka ọmụmụ" ebe ndị mmadụ na-eleta mba ndị ọzọ maka iji mụọ nwa.

Dịka ọmụmaatụ, India nwere mgbe ọ na-enye onye ọ bụla a mụrụ n'ala ya ikike ịbụ nwaafọ ozugbo. Mana ka oge na-aga, nsogbu gbasara mbata na ọpụpụ n'ụzọ iwu na-akwadoghị, ọkachasị site na Bangladesh, butere mmachibido iwu ahụ.

Kemgbe Disemba 2004, nwa a mụrụ n'Ịndia bụ naanị nwaafọ ma ọ bụrụ na nne na nna abụọ ahụ bụ onye Ịndia, ma ọ bụ ma ọ bụrụ na otu nne ma ọ bụ nna bụ nwaafọ ma a naghị ewere nke ọzọ dịka onye kwagara mba ọzọ n'ụzọ iwu na-akwadoghị.

Ọtụtụ mba Afrịka, bụụ ndị sochiri 'Jus Soli' n'oge ọchịchị ndị ọcha, mechara hapụ ya mgbe ha nwetasịrị nnwere onwe.

Taa, ọtụtụ kwuru na ihe dịka otu nne ma ọ bụ nna ịbụ nwaafọ ma ọ bụ onye bi na mba ọzọ tupu ụmụ ha abụrụ nwaafọ.

Ịbụ nwaafọ na-esike karịa n'ọtụtụ mba Eshịa, ebe a na-ekpebikarị ya site n'agbụrụ, dịka a na-ahụ na mba dịka Chaịna, Maleysịa, na Singapore.

Yuropu ahụkwala mgbanwe dị ukwuu n'ebe inye ikike ịbụ nwaafọ nọ.

Ireland bụ mba ikpeazụ n'ogbe ahụ nke kwere ka 'Jus Soli' na-enweghị mmachi bụrụ etu esi enweta ikike nwaafọ.

O wepụrụ iwu ahụ mgbe ntuliaka nke Juun 2004 gasịrị, mgbe pasent 79 nke ndị ntuliaka kwadoro mgbanwe iwu nke chọrọ ka ọ bụrụ na nne maọbụ nna bụrụ nwaafọ, onye bi na mba ahụ n'ụzọ na-adịgide adịgide, maọbụ onye bi nwa oge iwu kwadoro.

Gọọmenti kwuru na ọ dị mkpa ka a gbanwee ya n'ihi na ụmụnwaanyị si mba ọzọ na-aga Ireland ịmụ nwa iji nweta paspọtụ Yurop bụ 'EU' maka ụmụ ha.

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ndị otu ikike mmadụ tụrụ egwu na mkpebi ụlọikpe iwu kwadoro na Dominican Republic ga-anapụ ọtụtụ puku ụmụaafọ, ọkachasị ndị Haiti ikike ịbụ nwaafọ.

Otu n'ime mgbanwe kachasị njọ mere na Dominican Republic, n'afọ 2010, mgbanwe iwu obodo gbanwere ikike ịbụ nwaafọ iji napụ ụmụaka ndị si mba ọzọ kwabatara n'enweghị akwụkwọ ikike.

Mkpebi nke Ụlọikpe Kasị Elu nke 2013 mere ka nke a laghachi azụ na 1929, na-anapụ ọtụtụ puku mmadụ - ọkachasị ndị Haiti - mba Dominican. Ndị otu ikike dọrọ aka na ntị na nke a nwere ike ime ka ọtụtụ ndị ghara inwe mba, dịka ha enweghịkwa akwụkwọ Haiti.

Otu mba ụwa na-ahụ maka ọdịmma mmadụ na ụlọikpe na-ahụ maka Ihe ndị ruuru mmadụ n'Amerịka katọrọ mkpebi a nke ukwuu.

N'ihi mkpesa ọha na eze, Dominican Republic tinyere iwu n'afọ 2014 nke guzobere usoro inye ụmụ ndị si mba ọzọ amụrụ na Dominican ikike ịbụ nwaafọ, ọkachasị ndị si Haiti.

Ihe ịma aka chere iwu a

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Iwu onyeisiala Trump ahụtawo ọtụtụ nsogbu

N'ime awa ole na ole ka Onyeisiala Trump nyere iwu ahụ na Jenụwarị 20, 2025, steeti iri abụọ na abụọ nke ndị otu Democratic na-edu, obodo San Francisco, District nke Columbia, na otu ndị otu ikike mmadụ gbara gọọmenti etiti akwụkwọ, na-ama iwu ahụ aka.

Nke sochiri bụ n'ọtụtụ ndị ọkaikpe ụlọikpe gọọmenti etiti ndị ọzọ kpebiri na atụmatụ Trump mebiri Iwu, ụlọikpe mkpegharị abụọ nke mpaghara gọọmenti etiti kwadoro iwu ndị na-egbochi iwu ahụ ịmalite ịrụ ọrụ.

Ka ọ dị ugbu a, ọchịchị Trump agbaala iri akwara, na-arụ ụka n'akwụkwọ ha na Ndezigharị nke iwu 14 abụghị maka inye ụmụ ndị mbịarambịara akwụkwọ ikike maọbụ ndị na-akwaga mba ọzọ nwa oge ikike ịbụ nwaafọ - echiche nke ndị ọkammụta iwu jụrụ nke ukwuu.