2023 General Elections: Lee ndị ikuku 'Labour Party' kubara n'ọkwa Ụlọomeiwu Naịjirịa
Ebe foto si, Facebook/Twitter/Ireti Kingibe
Otu Labour Party nke Peter Gregory Obi ji azọ ọkwa onyeisiala bụ otu ebe anya ndị mmadụ dị na ntuliaka e mere n'ụbọchị 25 nke ọnwa Febụwarị.
Ọ bụghị naanị maka Peter Obi mana maka etu ndị ọzọ na-azọ ọkwa dị icheiche n'aha otu ahụ sị chụpụ ndị nọbu n'ọkwa ahụ ogologo oge.
Ụfọdụ n'ime ha bụ ndị mmadụ anụbeghị aha ha chaachaa n'ihe metụtara ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjirịa ebe ụfọdụ bụ ndị a ma ama.
Lee he niile ebe a.
Ireti Kingibe
Ebe foto si, Ireti Kingibe
Ireti Kingibe bụ nwunye onye bụbu Odeakwụkwọ ala Naịjirịa bụ Babagana Kingibe.
Mgbe a kpọpụtara mpụtara ntuliaka, o nwetara 202,175 o ji merie Phillip Aduda nke PDP nọ n'ọkwa ahụ kemgbe 2011.
Ọ malitere ndọrọndọrọ ọchịchị n'afọ 1990 mgbe o sonyere otu SDP. Ọ banyere PDP n'afọ 2006 ma banye APC n'afọ 2014.
Ọ banyere Labour Party n'ikpeazụ n'afọ 2022 ebe ọ nọ rite ọkwa a.
Thaddeus Achief Attah
Ebe foto si, JT Attah/Twitter
Thaddeus Attah bụ onye ọhụrụ n'ihe gbasara ntuliaka nke mere ya na Labour Party bụ ọkwa gọọmentị mbụ ọ banyere.
O ritere vootu 24,075 o ji merie Bankole Wellington nke PDP nakwa Musiliu Obanikoro nke APC.
Obanikoro bụ onye nọ n'ọkwa ịnọchi anya Eti Osa dị na Legọs n'ụlọomeiwu nta kemgbe 2019.
Attah sonyere na ya bụ otu naanị ọnwa atọ tupu e mee ntuliaka mana tupu ọ banye nke a, ọ bụ ojiegiachụego.
Victor Umeh
Victor Umeh bụ omeiwu nọbụ n’ọkwa n’Anambra Central rue afọ 2019 tupu Uche Ekwunife nke otu PDP emerie ya ma napụ ya ọkwa ahụ.
Umeh nọbụ n'otu APGA si ebe ahụ pụọ ma sonye otu Labour n'afọ 2022.
Ọ zọrọ ikike ịnọchị Labour Party nke mere ka ọ gbaa ụnụ n'ụlọikpe tupu o nweta ya bụ ikike ma merie na ntuliaka.
Chimaobi Sam Atu
Ebe foto si, Chimaobi Atu/Facebook
Ginger Onwusibe
Ebe foto si, Ginger Onwusibe/Facebook
Ekene Adams Abubakar
Ebe foto si, @Adamekene/Twitter
Oby Lilian Orogbu
Ebe foto si, Prof Oby Lilian Orogbu TV
Ibe Okwara Osonwa
Ebe foto si, Ibe Okwara
Tony Nwoye
Ebe foto si, Tony Nwoye/Facebook
Paul Nnamchi
Ebe foto si, Raymond Okechukwu Ugwu/Facebook
Afam Ogene
Ebe foto si, Afam Ogene/Facebook
Ezenwa Onyewuchi
Ebe foto si, Ezenwa Onyewuchi/Facebook
Neda Imasuen
Ebe foto si, Neda Imasuen/Facebook
Okechukwu 'Okey' Ezea
Ebe foto si, Okey Ezea/Facebook
Donatus Matthew
Ebe foto si, Hon_Donatus/Twitter
Isi akụkọ
Kọwaara m isi akụkọ
Akụkọ akachasị gụọ
Content is not available