Anambra Sit at Home: Onitsha 'Main Market' o mepere taa bụ Mọnde? Lee ihe anyị hụrụ

Nkọwa foto, Ahia Main Market dị n'Onitsha ụbọchị March 28, 2022

Onitsha Main Market dịka ebe agbara ọsọ n'ụtụtụ taa bụ Monde, March 28, 2022.

Ndị ahịa apụtaghị maọlị belụsọ ndị mmadụ na-agara onwe na nke nke n'okporoụzọ.

Ọdọ ụgbọala ebe ndị ọkwọ ụgbọala na-eme njem aga-ebe dị iche iche n'ala Igbo mechichara emechi.

Okporoụzọ Upper Iweka na-ekwokarị ekwo dịka ebe ndị mmụọ chụsasiri ndị mmadụ ọsọ makana ị ga-agụtalị mmadụ olemole nọ ebe ahụ n'ụtụtụ taa.

Nke a na-abịa agbanyeghị nzukọ ndị isi ahịa na aka na-achị anambra steeti bụ Charles Soludo nwere n'izu ụka gara aga.

Na nzukọ ahụ, ha kwekọrịtara na ndị ahịa ga-emepe ahịa ụbọchị Mọnde ọbụla agbanyeghị na ndị mmadụ na-anọbụ n'ụlọ ụbọchị ahụ.

Lee ụfọdụ foto anyị setere ebe ahụ.

Nkọwa foto, Ahia Main Market dị n'Onitsha
Nkọwa foto, Ahia Main Market dị n'Onitsha

Ọdọ ụgbọelu dịketere Upper Iweka dị n'Onitsha tọgbọọ chakoo

Nkọwa foto, Ọdọ ụgbọelu ebe ndị mmadụ na-eje eme njem dịketere Upper Iweka tọgbọọ chakoo
Nkọwa foto, Okporoụzọ Upper Iweka dị n'Onitsha

N'Awka

Na Jerome Udorji ebe Secretariat nke Anambra steeti dị , onye ntakụkọ anyi hụrụ ndị ọrụ ka na-abịa edenye aha ma tụgharịa azụ lawa.

Lee ka ihu na anya dị ụfọdụ ebe n'Awka dị n'Anambra steeti.

Ndị na-akwọ ụgbọala ndị ọrụ ji aga ọrụ na secretariat apụtaghị bia buru ụgbọala kwọga ndị ọrụ n'ụtụtụ a.

Nkọwa foto, Ọdọ ụgbọala dị na Secretariat nke Anambra

Ọtụtụ ọdọ ụgbọala tọgbọkwa chakoo agbanyeghị na ndị ọkwọ ụgbọala biara ya bụ nzụkọ gọvanọ Soludo na ndị ahịa mere.

Anambra steeti Judiciary dị n'Awka tọgbọọ chakoo.

Nkọwa foto, Ihụ ụlọ ọrụ Anambra steeti Judiciary

A hụghị kama otu onye ebe ahụ.

Nkọwa foto, Ogige Anambra Judiciary

A hụtụrụ mmadụ n'Aroma junction.

Ndị mmadụ apụtaghị etu ha si apụtabu n'Eke Awka n'ụbọchị ndị ọzọ.

Nkọwa foto, Lee ka Eke Awka dị n'ụtụtụ a
Nkọwa foto, Eke Awka n'ụtụtụ Mọnde, March 28, 2022

Unizik Junction Awka

N'Abakaliki dị n'Ebonyi steeti,

Ndị ọgbatum tum na-agagharị mana ahụghị ndị na-eme njem tere aka na-agba n'ụzọ taa.

Nkọwa foto, Ndị uweojii na-agara onwe ha n'okporoụzọ dị n'Ebonyi

N'Enugu,

Ọtụtụ okporoụzọ dị n'Enugu tọgbọọ chakoo dịka ndị mmadụ nọ n'ụlọ taa bụ Mọnde March 28, 2022.

Nkọwa foto, Okporoụzọ Enugu
Nkọwa foto, Okporoụzọ Enugu

N'Umuahia, okporoụzọ Akara - Uturu n'okpuru ọchịchị Ovim Isuikwuato dị n'Abia steeti.

Nkọwa foto, Okporoụzọ Akara - Uturu n'okpuru ọchịchị Ovim Isuikwuato dị n'Abia steeti.

Okporoụzọ Osusu a na-esi aga Faults, ahia Ariaria nakwa ebe a na-esi amapụta okporoụzọ Port Harcourt na Enugu tọgbọọ chakoo.

Ebe foto si, BBC

Nkọwa foto, Okporoụzọ Osusu dị n'Umuahia

N'Owerri dị n'Imo steeti,

Nkọwa foto, Okporoụzọ Wethral dị n'Owerri, Imo steeti

Ụlọahịa ndị dị n'okporoụzọ Wethral dị n'Owerri mechichara emechi.

Nkọwa foto, Okporoụzọ dị n'Owerri, Imo steeti

Gịnị butere 'sit at home' ndị Ipob hibere?

Ndị otu Ipob malitere ịnọ n'ụlọ ha kpọrọ 'sit at home' mgbe gọọmentị etiti Naịjiria nwụchiri Kanu bụ onyendu ha, n'afọ 2021.

Ha tinyere ya bụ ịnọ n'ụlọ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjiria iji gosi nkwado ha maka ikpe Kanu.

N'afọ 2021, ha tinyere ya bụ ịnọ n'ụlọ kwa Mọnde ọbụla, mana ha mechara na-eme ya mgbe ọbụla Kanu kwesịrị ịpụta n'ụlọikpe.

Cheta na gọọmetị Naịjirịa nwụchiri Nnamdi Kanu bụ onye ndụ otu Ipob na na mba Kenya n'afọ 2021 ebe ọ gbara ọsọ n'afọ 2017 mgbe ndị agha Naịjirịa wakporo ụlọ ya n'Afaraukwu Abia steeti.

Kamgbe e si mba Kenya kpọlata ya Naịjirịa, a na-ekpe ya ikpe maka ebubo iyi ndụ egwu nke gọọmentị Naịjirịa na-ebo ya.