Nnamdi Kanu: Nkata anyị na ya kpara mgbe anyị gara hụụ ya - Ejiofor

Ifeanyi Ejiofor bụ ọkaiwu Nnamdi Kanu onye ndu otu Indigenous People of Biafra (Ipob) ekwupụtala maka nleta ha gara leta ya n'ụlọmkpọrọ DSS na Mọnde.

Ọ sị na ọ bụ ọkaiwu ukwu Mike Ozekhome du ha ndị ọkaiwu ndị ọzọ mee njem a dịka ụlọikpe si nye n'ihu.

Ejiofor sị ha na Kanu kpara nkata banyere ọtụtụ ihe dị mkpa metụtara ikpe ya na-aga n'ihu.

Kedụ ihe ha kpara?

Ihe ndị ha kpara gụnyere;

Atụmatụ ọhụrụ a ga-eji gbaa gọọmentị Naịjirịa akwụkwọ maka imetọ ikike dịịrị Kanu nakwa ịtọrọ ma kpọlata ya na Naịjirịa.

Onye ndu ndị ọkaiwu ya bụ Mike Ozekhome ga-akpọpụta akwụkwọ ha gbara gọọmentị maka nke ahụ.

Ọ sị ha ga-agba gọọmenti etiti ọtụtụ akwụkwọ dịka ha na-akwado ịwuchi n'ụlọikpe n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Eprelụ, 2022 maka mkpebi ikpe n'ebubo gọọmentị boro Kanu.

Na nzaghachị, Kanu kwusiri ike na ntụkwasịobi o nwere n'ebe ndị ọkaiwu ya nọ n'ikpepụta ya n'aka gọọmentị etiti.

O kelekwara ndị na-eso ya na ndị nkwado maka ntụkwasịobi ha nwere n'ebe ọ nọ nakwa ekpere ha na-ekpere ya.

Kanu dọkwara aka na ntị nye ndị ọ sị na-achọ imebi aha Ipob ka ha chọọ ebe ọzọ ha ga-akparụ na ọ bụghị otu Ipob nke o hiwere.

Onye bụ Nnamdi Kanu?

Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu na-achọ nwereonwe Biafra a kpọrọ Indigenous People of Biafra (Ipob), o hiwere n'afọ 2012.

A makwa na ọ bụ onye ndị mmadụ na-akpụkarị n'ọnụ n'ihi etu o si ama ndị nọ n'ọchịchị aka dịka ọ na-achọ nnwereonwe n'aka Naịjirịa.

Ndị Department of State Services (DSS) nwuchiri ya mbụ n'Ọktoba 19, 2015.

Ọ gara ụlọikpe na Nọvemba 18, 2015. Na Septemba 2017, ọ gbafuru n'ụlọ ya dị n'Afara Ukwu, Umuahia, mgbe ndị agha wakporo be ya, dịka akụkọ siri kwuo.

Kamgbe ahụ o nweghi onye ma ebe ọ nọ, ma nwunye ya bụ Uchechị anyị jụrụ ajụjụ n'afọ 2018 sị na ọ maghị ebe Kanu nọ.

N'afọ 2018, ka gọọmentị Naịjiria nke Muhammadu Buhari bụ onyeisi ha, kpọrọ Ipob ndị oyi ndụ egwu.

N'ọnwa Juun 27 afọ 2021, a nwuchiri Kanu na mba Kenya ma kpọlata ya na Naịjirịa mana mana onyeisi ụlọrụ nnọchiteanya Kenya na Naịjirịa kwuru na aka ha adịghị na nwuchi ya.

Gọọmentị Naịjirịa kpọpụrụ Kanu n'ụlọikpe maka ọtụtụ ebubo gụnyere ibuagha megide gọọmentị nọ n'ọchịchị.

Kanu site n'ọnụ ndị ọkaiwu ya agọọla ọtụtụ oge na aka ya dị ọcha n'ebubo ndị ahụ.

A na-atụ anya na ọkaikpe Binta Nyako ji ikpe ahụ ga-ekpebi okwu n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Eprelụ, 2022 n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja.