New Year's Eve: Ị nweghi ike ichefu ihe ndị a mere n'afọ 2019

Ebe foto si, Getty Images
Kedụ ihe ndị mere n'afọ 2019 ị ka chetara?
Lee nwa ule anyị a ka ị mara
Answers are below
#10yearschallenge wuru n'ọnwa Jenụwarị. Kedụ ihe ọ bụ maka ya?
1. Etu i si gbanwee n'ime afọ iri
2. Ego ole ị kpatara n'ime afọ iri
3. Ụmụ ole ị mụtara n'ime afọ iri
4. Ọrụ ole ị rụrụ n'ime afọ iri
E yigharịrị ụbọchị e kwesịburu ime ntuliaka onyeisiala nke Naịjirịa. Kedụ ụbọchị o kwesịburu ịbụ na ụbọchị e bugara ya?
1. O kwesịrị ịbụ Febrụwarị 9 e buga ya Febrụwarị 23
2. O kwesịrị ịbụ Febrụwarị 2 e buga ya Febrụwarị 9
3. O kwesịrị ịbụ Febrụwarị 16 e buga ya Febrụwarị 23
4. O kwesịrị ịbụ Febrụwarị 23 e buga ya Maachị 2
Kedụ onye ọnụọgụgụ ya so nke Chukwuemeka Ihedioha ka ọ zọtara oche gọvanọ Imo state?
1. Ifeanyi Araraume
2. Uche Nwosu
3. Hope Uzodimma
4. Ikedi Ohakim
Ọkụ gbara nnukwu ụlọụka Notre-Dame ọkụ. Kedụ mba ụlọụka a dị?
1. Spen
2. Amerịka
3. Frans
4. Jamini
Goolu ole ka Liverpool nyere iji chụpụ Barcelona?
1. Ise
2. Anọ
3. Atọ
4. Abụọ
Busola Dakolo bụ nwunye onye a ma ama na Naịjirịa boro Biodun Fatoyinbo ebubo mwakpo. Kedụ ihe e ji mara Timi di Busola?
1. Ime ejije
2. Ịgụ egwu
3. Ịma njakịrị
4. Onye ndọrọndọrọ ọchịchị
Kedụ mba Naịjirịa meriri iji rite nturuugo ọlanchara n'asọmpi Iko Mpaghara Afrịka n'egwuregwu bọọlụ?
1. Tunishia
2. Ọljiria
3. Ijipt
4. Burundi
Kedụ mba Ibrahim El-Zakzaky na nwunye ya gara ịleta ahụike ha ka ụlọikpe nyere ha ohere?
1. Lọndọn
2. Tọki
3. India
4. Indoneshia
Ụfọdụ ndị Naịjirịa gbara ọsọ si mba Saụt Afrịka lọta ka ndị mba ahụ wakporo ha. Kedụ onye zigara ụgbọelu e ji bulata ụfọdụ n'ime ha?
1. Innocent Chukwuma
2. Gọọmentị etiti Naịjiria
3. Allen Onyema
4. Nnamdi Kanu
Ego ole ka Mercy Eke ritere ka o meriri ‘Big Brother Nigeria Season 4'?
1. Nde naịra 60
2. Nde naịra 30
3. Nde naịra 40
4. Nde naịra 50
Ọkụ gbara ahịa Balogun dị na Legọs gbara ụbọchị ole tupu e menyụọ ya?
1. Otu
2. Abụọ
3. Atọ
4. Anọ
Kedụ aha otiegwu a ma dịka Cardi B sị ka a kpọwa ya mgbe ọ bịara Naịjirịa?
1. Chinyere
2. Chinwe
3. Chioma
4. Oluchi
Answers
Answer: Etu i si gbanwee n'ime afọ iri
#10yearschallenge wuru n'ọnwa Jenụwarị ebe ndị mmadụ na-etinye foto ha sere afọ 2009 na nke ha sere n'afọ 2019, iji gosi etu ha si gbanwee n'ime afọ iri gara aga.Answer: O kwesịrị ịbụ Febrụwarị 16 e buga ya Febrụwarị 23
Ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka bụ Independent National Electoral Commission (Inec) yigharịrị ntuliaka ọkwa onyeisiala site n'ụbọchị 16 nke ọnwa Febrụwarị buga ya ụbọchị 23 nke ọnwa ahụ.Answer: Uche Nwosu
Emeka Ihedioha nke pati PDP nwetara vootu 273,404 iji merie Uche Nwosu nke AA nwetara 190,364.Answer: Frans
Ọkụ gbara ụlọụka Notre-Dame dị afọ narị asatọ na iri ise (850) n'ụbọchị 15 nke ọnwa Epreelụ 2019. Ụlọụka a dị n'obodo Paris dị na mba Frans.Answer: Anọ
Liverpool nyere goolu anọ nke Barcelona asanwughi iji chụpụ ha n'agba ọkara-ikpeazụ ma garuo agba Ikpeazụ ebe ha meriri ma bulie iko.Answer: Ịgụ egwu
Timi Dakolo na-agụ egwu, mana ya na na nwunye ya bụ Busola wuru ewu n'ọnwa Juun mgbe ha kwuputara na Biodun Fatoyinbo dinara ya mgbe ọ na-erubeghiị afọ 18.Answer: Tunishia
Naịjirịa ji otu ọkpụ goolu nke Odion Ighalo nyere merie Tunishia iji gbaa onye nke atọ ma nweta ọlanchara.Answer: India
Ụlọikpe nyere iwu ka El-Zakzaky na nwunye ya gaa leta ahụike ha n'India ma lọghachite, mana ha lọtara na-eletaghị ahụike ha maka okwu dị n'etiti ha na ụlọogwụ ha.Answer: Allen Onyema
Ka ụfọdụ ndị Naịjiria bi na Saụt Afrịka kwenyere na ha ga-alọta Naịjirịa kama ịnọ ebe a na-awakpo ha, Allen Onyema nwe ụlọọrụ Air Peace zigara ụgbọelu bulatara ha n'efu.Answer: Nde naịra 30
N'ụbọchị isii nke ọnwa Ọktoba, Mercy Eke ritere nde naịra 30 n'ego ma nweta onyinye gụnyere ụgbọala na ihe ndị ọzọ ruru nde naịra 30.Answer: Abụọ
Ọkụ malitere ịgba n'ahịa Balogun dị na Legọs steeti n'elekere asatọ nke ụtụtụ n'ụbọchị ise nke ọnwa Nọvemba, e menyụọ ya n'ụbọchị isii nke ọnwa ahụ.Answer: Chioma
Mgbe Cardi B bịara Legọs ebe ọ nọrọ site n'abalị ise nke Disemba ruo ụbọchị asaa. A gụrụ ya Chioma B, nke o dere n'elu Instagram ya sị ka a kpọwa ya.
























