Khafi BBNaịja: Ndị uweojii mba Ingland akpọọla m ka m lọghachị

Ebe foto si, PA Media

Nkọwa foto, Khafi Kareem

Nwaada Khafi Kareem nke sonyere n'egwuregwu 'Big Brother Naija' nwere ike ịlaghachi n'ọrụ ya dịka onye uweojii na mba Ịngland.

Khafi gwara ndị ntaakụkọ oge ọ laghachiri UK na ya na ndịisi uweojii 'Scotland Yard' na-akpa nkata.

Ọtụtụ akwụkwọ akụkọ mba UK tinyere 'Mirror' na 'Daily Mail' depụtara nke a.

Khafi kwuru na ndịisi ụlọọrụ ha na-ajụ ya mgbe ọ ga-alaghachi n'ọrụ.

Ebe foto si, Twitter/officialBBNaija

Cheta na ndị uweojii 'Scotland Yard' gbarụrụ ihu oge a hụrụ Khafi n'egwuregwu BBNaija.

Ha kwuru na ha enyeghị ya ikike isonye na ihe omume ahụ.

Ha kwukwara na ha ga-eleba okwu ahụ anya ma Khafi lọta.

A chụpụrụ Khafi n'ụlọ 'BBNaija' ka egwuregwu ahụ gachara abalị iri asaa na asaa.

Ebe foto si, Instagram/Khafi Kareem

Nkọwa foto, Khafi oge ọ laghachiri UK

Na mkparịta ụka ya na ndị ntaakụkọ, Khafi si na ya amabeghị mgbe ọ ga-alaghachi.

"Mana ọ ga-abụ n'oge na-adịghị anya," dịka o si kwuo.

"A hụrụ m ọrụ ichekwa obodo London n'anya nke ukwuu."

Ebe foto si, Instagram/Khafi Kareem

Nkọwa foto, Khafi gbara afọ iri atọ n'abalị atọ nke ọnwa Nọvemba

Khafi nọ na Naịjirịa ugbua iji mee emume ncheta ọmụmụ ya.

Taa bụ abalị atọ nke ọnwa Nọvemba ka ọ gbara afọ iri atọ.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Nollywood: E gwuru m chandum mgbe m bidoro - Obi Emelonye