Zimbabwe election: Emmerson Mnangagwa ejirila obere ihe gafee

Ebe foto si, AFP/Getty
Onyeisisala Zimbabwe bụ Emmerson Mnangagwa meriri ntuliaka eji họpụta, ngalaba na-ahu maka ntuliaka na Zimbabwe kwuru.
A gụọla vootu mpaghara iri, nke gosiri na Mnangagwa nwetere pacenti 50 n'ime vootu atụrụ ka Nelson Chamisa nke pati na-anọghị n'ọchịchị bụ MDC nwetere percent 44..
Mana, ndị MDC ekweghị n'ihe ngalaba ntuliaka Zimbawe kwuru, nke mere ndị uweojii ji kpọpụ ha n'ebe a na-agụ vootụ ahụ.
Onyeisis MDC sị na vootu ahụ agụpụtara ezighi ezi.
Mnangagwa kele ndị nkwado ya na Twitter ma kwuo na mmeri ya bụ "mmalite ọhụrụ".
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Chamisa na-esi ọnwụ na ọ bụ ya meriri ntuliaka a, nke mere oji gwa ndị ntaakụkọ ụbọchị Tusde na ZANU-PF chọrọ "ịghọ aghụghọ", bụ ihe ha "agaghi ekwe ka ome".
Mana ngalaba Zimbabwe Electorial Commission (Zec) sị onweghi nrụrụ aka ọbula emere.

Ebe foto si, Getty Images
Mmadụ isi nwụrụ mgbe ndị na-akwado MDC mere ngaghari iwe n'ụbọchị Wenesde.
Ntuliaka bụ nke mbụ Zimbabwe na-eme kemgbe Robert Mugabe pụrụ n'ọchịchị n'ọnwa Novemba nke afọ 2019.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:






























