Ndị uweojii mere ngagharị iwe n'ụlọọrụ onye na-agụkọta ego Naịjiria

Nkọwa foto, Ụlọọrụ ebe ndị uweojii ahụ gara ngagharị ịwe

Ndị uweoji a gaala n'isi ụlọọrụ onye na-agụkọta ego Naịjirịa ị me ngagharị iwe maka ị mapụ ego na akwụghị ụgwọ ọnwa ha n'Abuja taa.

Ihe ha na-ekwu butere nsogbu a bụ usoro ọhụrụ etinyere iji kwụ ha ụgwọ a kpọrọ IPPS n'aha ịchafụ.

Ụfọdụ n'ime ha anatabeghị ụgwọ ọnwa cha cha kemgbe ọnwa anọ ebe amapụrụ ego n'ụgwọ ndị ọzọ.

IPPS bụ ụsoro ọhụrụ gọọmentị etiti bubatara kemgbe afọ 2017 iji kwụ ndị ọrụ gọọmentị niile ụgwọ ọnwa maka ị benata mpụ na ozuzu ego.

Otu onye uweojii achọghị ka-enye aha ya kwuru na ihe a metụtara ya na nwunye ya ruru ọkwa Sajentị n'ọrụ uweojii.

Ọ sị na nwụnye ya anatabeghị ụgwọ ọnwa zuru oke kemgbe ọnwa Febụrụwarị.

Gee ihe ọ gwara BBC Igbo n'uju ebe a:

Aha nkeananụānụ, Okwu ụgwọ ọnwa ndi ụweojii

Onye na-ekwuchitere ndị uweojii n'ihe gbasara mmekọ ha na ndị ọzọ bụ Jimoh Moshood kwuru na ha ga-ahazị nsogbu a n'oge adịghị anya.

N'ime akwụkwọ o depụtara, Moshood kwuru na ọ bụ nzọhie ngwa ọrụ ha kpatara nke a.

N'ọnụ ya "Ndị niile ihe a metụtara ga-enweta ego ha n'agafeghị ụbọchị asaa nke mee"

Nkọwa foto, Ụfọdụ ndị uweojii nọ n'ebe ha gara ngagharị iwe

Akụkọ ga-amasị gị