A ga-elikọta ndị nwụrụ na mwakpo Benue steeti

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Eliri mmadụ 73 nwụrụ na mwakpo emere na Benue n'ọnwa Jenụwarị

Gọọmenti Benue Steeti ekwuola na ha ga-elikọta ndị nwụrụ na mwakpo ndị a na-eche na ha bụ ọchịehi wakporo obodo Omusu, nke dị n'Edumoga dị na gọọmentị obodo Okpokwu nke Steeti ahụ na mgbede Mọnde.

Ihe a na-eme ka Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari kwere nkwa ịga steeti ahụ na ebe ndị ọzọ ọgbaghara a na-ebo ndị Fulani na-achị ehi dị na Naịjirịa.

Nke a bụ otu n'ime ọtụtụ ogbugbu mmadụ na-eme na Benue Steeti.

Na mbido afọ a, mwakpo emere na gọọmentị obodo abụọ gburu mmadụ 73 ma bute mmebi ụlọ na akụnaụba. Igbu mmadụ bụzị ihe na-eme mgbe niile na Benue kamgbe ahụ.

Mwakpo nke Mọnde merụkwara ọtụtụ mmadụ ahụ ma mee ka a na-achọ ụfọdụ ma ruo ugbua. Ndị mere mwakpo a gbakwara ụlọ, ọba nri na akụnaụba ndị ọzọ ọku.

Otu onye hụrụ mgbe mwakpo a mere na-akọwa na ọ bụ n'elekere anọ nke mgbede ka ndị omekome a wakporo obodo ma bido ịgba ihe ọbụla ha hụrụ egbe.

Gọvanọ na-achị Benue Steeti bụ Samuel Ortom so na ndị mbụ gara mgbaru n'obodo ihe a metụtara. Gọvanọ Ortom duuru ndị ọchịchị ya ịga hụ ihe mere.

Ọ gwara ndị Omusu na ndị a na-akpa ike si mba ofesi bata, ma kwukwa na-agaghị anabata ogbugbu mmadụ a ndị ọchi ehi na-eme.

O kwukwara na ọ bụ mmadụ 24 ka ha ma nwụrụ n'otu ụbọchị na mwakpo a.

Ortom sị ka ndị nchekwa nwụchie ndị isi Miyetti Allah, bụ ndị o na-ebo ebubo na aka ha dị n'ihe na-eme na Benue.

Ọ gakwara n'ihu kwuo na a ga-elikọta ndi nwụrụ na mwakpo a.

Olofu Ogwuche, bụ onye na-achị gọọmenti obodo ebe ihe mere, sị na ọgbaghara a bidoro mgbe ndị ọchịehi bịara gwa ya na ehi ha na-efu. Ọ sị na ọ bụ ka ọ na-enyocha ihe mere ka awakporo obodo ahụ.

Nsogbu ndị ọchiehi na ndị na-akọ ugbo so n'ezigbote nsogbu Naịjirịa nwere ugbua.

Onyesiala Buhari ezipụla ndị agha na ndị uweojii ka ha gaa ọrụ nchekwa n'ebe ihe a kachasị eme.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: