Prince Philip funeral: Foto etu Ezenwaanyị na ndị mba Briten si dulaa duke

Ezenwaanyị edurula ezinaụlọ ya - na mba Briten - n'ịkwa ozu di ya, Duke nke Edinburgh, na Windsor Castle.

Ebe foto si, PA Media

Ezenwaanyị nọ n'ihu oche, nke kacha nọ nso ọlta. Ọkparaeze nke Wales na Nwunye Ọkparaeze nke Cornwall nọ ya nso, ma nọsapụ anọsapụ.

Ebe foto si, PA Media

Ebe foto si, PA Media

Ebe foto si, Getty Images

Akpatiozu nke duke na-aga Ụlọụka St George malitere njem ya dịka ndị na-ebu ya bulitere ya ebe a dọbara ya n'ime ọnụụlọ ma na-aga n'ebe mpụta ezi.

Mmadụ itoolu ndị ezinaụlọ Eze gụnyere ụmụ ya bụ Ọkparaeze Charles, Adaeze Anne, Ọkparaeze Edward nakwa Ọkparaeze Andrew so na-aga n'azụ akpati ozu ya.

Ebe foto si, Getty Images

Duke nke Cambridge na Ọkparaeze Harry nọ n'ahịrị nke atọ dịka nwa nwanne nna ha bụ Peter Phillips nọ ha n'etiti.

Ebe foto si, Getty Images

Vice Admiral Sir Timothy Laurence na Earl nke Snowdon bụ ndị nọ n'ahịrị na-eso ha, dịka ndị na-arụ ọrụ n'ezinaụlọ duke so ha n'azụ.

Ebe foto si, PA Media

Tupu e mee mgbachi nkịtị nke otu nkeji maka duke, ụgbọala bu Ezenwaanyị rutere n'ụlọụka dịka a na-akpọ abụ ala. Ọ bara n'ime ebe Archbishọp nke Canterbury zutere ya.

Ebe foto si, PA Media

Ebe foto si, PA Media

Ebe foto si, Reuters

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Catherine, Nwunye Ọkparaeze nke Cambridge, erutela ebe a ga-anọ mee akwamozu tupu o bido

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Nwunye Ọkparaeze nke Cornwall erutela Ụlọụka St George

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, A hụrụ ndị otu Household Cavalry tupu akwamozu amalite

Ebe foto si, Getty Images

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị agha ji ụkwụ aga na-azọpụ ije n'ahịrị

Ebe foto si, Getty Images

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndịagha Eze, Royal Horse Artillery na-erute nso Windsor Castle tupu e mee akwamozu

Ebe foto si, REX / Shutterstock

Narị kwuru narị mmadụ na-ele ka ndị agha Eze a kpọrọ King's Troop Royal Horse Artillery na-aga Windsor Castle n'ehihie.

Ọtụtụ ndị na-anya ịnyịnya yi uwe na-eji oji, na-acha ọbara ọbara nakwa ọlaedo, ma bukwa egbe atọ nya na-aga na Cambridge Gate dị n'ụlọ.

Ebe foto si, REX / Shutterstock

Ebe foto si, Reuters

Ebe foto si, PA Media

Ndị agha ga-agbapụ egbe nkeji site na mpaghara ọwụwa-anyanwụ nke mbaraezi nke Windsor Castle dịka e bu akpatiozu nke Ọkparaeze Philip site n'ụlọ na-aga ụlọụka.

Ebe foto si, PA Media

Ụfọdụ ndụ ọhanaeze agaala Windsor ịkwanyere duke ugwu, mana mpaghara ahụ dara jụụ n'ihi mmachi ndị e tinyere.

Ebe foto si, Getty Images

Ebe foto si, Getty Images

Ebe foto si, Getty Images

Ebe foto si, Reuters

Duke nke Edinburgh ji aka ya họpụta ihe ya ndị a tụkwasịrị n'elu ọlta n'Ụlọụka St George na Windsor.

A tụkwasịrị ihe njirimara ya - ihe nrite nke mba Briten nakwa mba ndị dị n'okpuru Commonwealth nyere ya - n'elu akwa itoolu. O tinyekwuru ihe njirimara ya si na mba Denmark nakwa Gris iji kwanyere agbụrụ ebe o si ugwu dịka ọ bụ Ọkparaeze nke Gris na Denmark.

Ebe foto si, PA Media

Ebe foto si, Reuters

Ebe foto si, Getty Images

Foto niile a nwere ndị nwe ya.