Donald Trump sị na ya ga-eme iwu banyere soshal midia dịka ọ na-agbarụrụ Twitter ihu
Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump ga-ebinye aka n'iwu si ya n'aka ga-emetụta ụlọ ọrụ soshal midia, dịka ụlọ ọrụ ya siri kwuo.
Atụmatụ a na-abịa ka Trump dọrọ aka na ntị na ya ga-agbachi ụlọ ọrụ soshal midia ọ sị na-apichi ọnụ ndị kwenyere na okwukwe "conservative".
Ekwubeghi etu iwu ọhụrụ Trump a ga-adị.
Okwechaghị nghọta ụdịrị ihe Trump nwereike imenwu ma ya bụrụ na ndị Omeiwu ewpụteghi iwu ọhụrụ ga-enye ya ikike.
Ndị ụlọ ọrụ Trump enyeghi ozi ọzọ banyere atụmatụ a bụ nke a na-ele anya na o nwereike ịbinye aka na ya n'ụbọchị Tụzde.
Trump na-ebo Twitter ebubo mmegide ndị otu ya mana onweghi akaebe o nyere banyere nke a.
O mechiri otu ihe o dere na Twitter site na ikwu "Ugba a ha apụọla ezigbote ara. Na-elekwa!!!"
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Okwu na-ere Trump na ụlọ ọrụ soshal midia senyitere isi ọzọ n'ụbọchị Toozde dịka etinyere akara nyocha n'otu ihe o dere na Twitter.
Twitter dere na ihe Trump dere banyere mpụ na ntuliaka Amerịka "enweghi akaebe" ga-egosi na ọ bụ eziokwu
N'ụbọchị Wednesde Trump kwusiri ike na ya "ga-eji ike hazie" ma ọ bụ "gbachie" ogige soshal midia.
Ọ gwara mmadụ nde iri asatọ na-eso ya na Twitter na ndị na-akwado pati Repụblikan ndị chere na ogige soshal midia "na-akpichi ndị conzavative ọnụ kpam kpam", na ya agaghi ekwe ka nke a mee.
Oneyisi Twitter sara ihe Trump kwuru site n'isi: "Anyị ga na-egosi ozi akwụghị ọtọ banyere ntuliaka Amerịka n'ụwa dum."
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Maazị Trump dekwere otu ihe ahụ o dere na Twitter na Facebook mana onweghi akara nyocha etinyere na ya.
Na mkparịtaụka o mere na Fox News ụbọchị Wednesde, onyeisi Facebook bụ Mark Zukerberg sị na ịkpịchị ogige soshal midia ọnụ abụghị ihe o che gọọmentị na-eti mkpu mkpịchị ọnụ kwesiri ime.
Twitter jizi aka ike eso akụkọ ụwa ugbua maka nrụtụ aka ndị mmadụ mere banyere etu ha si eme maka ụdịrị akụkọ ahụ.
Isi akụkọ
Kọwaara m isi akụkọ
Akụkọ akachasị gụọ
Content is not available