Aretha Franklin tiri "Respect" anwụọla n'afọ 76

Ebe foto si, Getty Images

Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na otiegwu a ma ama bụ Aretha Franklin anwụọla.

Franklin bụ onye a ma maka egwu ndị dịka "Respect" nakwa "Natural Woman" gbara afọ 76 tupu ọ nwụọ.

Ọ bụkwa nwaanyị mbụ e debanyere aha ya na ndị na-eti egwu 'Rock and Roll' a na-agaghị echefu echefu, nke Bekee kpọrọ 'Hall of Fame'.

Franklin bụ nwa ụkọchukwu ndị Baptist si obodo Detroit, ji ịgụ egwu ụka bido ma gaa n'ihu gụọ ọtụtụ egwu e ji mara ya.

Oge ọ dị ka kpakpando ya n'ịgụ egwu adịghị anwuke, o tigharịrị egwu Otis Redding bụ 'Respect', tinyekwuo ya egwu nke ya, mere ka kpakpando ya nwusie ike.

Franklin gụgharịrị egwu ahụ na-ekwu maka nwoke na-arịọ nwunye ya kwanyere ya ugwu ka o were ego kwụọ ya ụgwọ, gụọ nke ya ka ọ bụrụ nwaanyị na-anaghị arịọ biko; kama ọ na-ana naanị oke ruru ya.

Nkọwa foto, Egwu o tiri bụ 'R-E-S-P-E-C-T' abụghị njirimara ndị 'feminist' nakwa nke ndị chọrọ ka ndị mmadụ nweta ikike ruru ha na mba Amerịka, ruo mgbe Aretha Franklin mere ya ka ọ bụrụ njirimara ha

Akwụkwọ ozi Rolling Stone kpọrọ egwu ahụ otu n'ime egwu ise kacha mma kamgbe isi mbido ụwa.

Ha kwuru: "Enweghị ihe Franklin na-ana. Ọ gụrụ egwu ahụ site n'ebe dị elu; nwaanyị na-akpọ oku ka a kwụsị ikpaso ụmụnwaanyị oke maka na ha bụ nwaanyị."

Nwaanyị mkpụrụobi

Egwu ahụ ọ gụrụ metụtara ndị mba ahụ niile, oge ebe niile tachiri atachi ka ọtụtụ niime ha na-azọ ikike ruru ha ebe afọ 1960.

Ndị isi ojii Amerịka hụtara egwu ahụ ka nkwudo megide mkpagbu nakwa inye nwaanyị ikike.

Nkọwa foto, Aretha Franklin kwuru: "E cheghị m na egwu m ga-emecha bụrụ abụ nye ụmụnwaanyị. Mana ọ na-atọ m ụtọ"

"Respect" bụ otu n'ime egwu ndị Franklin gụrụ ga-adịgide ndụ.

Ndị ọzọ o tiri oge ahụ gụnyere "I Say a Little Prayer" ọ gụrụ n'afọ 1968 nakwa "(You Make Me Feel Like) A Natural Woman" ọ gụrụ n'afọ 1967.

'Ọrụ dị gara gara'

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Aretha Franklin mere ka anyammiri pụọ Barack Obama bụbu onyeisiala mba Amerịka n'anya oge ọ na-agụ egwu

Ọ gụrụ ọtụtụ egwu ruru isi mbido 20 n'ọgbọ 'ndị kacha agụ egwu' nke Amerịka, n'ime afọ 70.

O nwetara ihe nrite Grammy maka onye kacha egosipụta egwu R&B ugboro asatọ so ibe ya, site n'afọ 1968 ruo 1975.

Onyeisiala George W Bush nyere ya ọla nnwereonwe nke ndịisiala na-enye, n'afọ 2005.

Ọ lara ezumike nka n'afọ 2017, na-ekwu na ahụ na-eme ya "gara gara" maka ịkwụsị ịgụ egwụ.

N'ime ndụ ya, ọ rịara ọrịa ọtụtụ oge, site n'ụlọọgwụ fere n'ụlọọgwụ.