Ndị Ireland ekpebiela na ụmụnwannyị nwere ikike ite ime

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Obi ndị mmadụ dị na ntụlịaka emere

Ndị mba Ireland mere ntuliaka taa iji kagbuo otu usoro iwu na-achi mba ahụ nke ehiwere n'afọ 1983 bụ nke tinyere nwaanyị na nwa o bu n'afọ n'otu ogogo.

Ndị mmadụ were usoro iwu ahụ ka ihe gbochiri nwannyị dị ime ite nwa o bu n'afọ.

Ọgụgụ nke enwetere ugbua na ntuliaka nke taa na-egosi na percentị 68 na mba ahụ chọrọ ka-akagbuo ya bụ iwu, percent 30 n'ọma chọrọ ka-ahapụ ya etu ahụ ọ dị.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Usoro tụgharị iwu ji obodo nke asato bụ ihe emere n'afọ 1983

Onye na-ekwụchitere ndi chọrọ ka ya bụ iwu nọọdụ bụ John McGuirk ekwenyerela na ndị chọrọ ka-akagbuo ya emeriela.

"Ndị be anyị entinyela ọnụ na ya bụ okwu, okwu wee danyere ndị ọzọ, agbanyeghi na m chọrọ ka ọ bụrụ etu ọzọ ka ọ pụtara," McGuirk kwuru.

Ebe foto si, Brian Lawless

Nkọwa foto, Ụmụaka na okenye pụtara ebe a na-eme ntulịaka

Taoiseach Leo Varadkar, so na ndị kwenyere ka-akagbuo iwu a kwuru na mmeri a ga-abụ ihe a ga-eji maa atụ site eche gawa n'ihu.

Echi ka a ga-akpọpụta aha ndị meriri n'ezie.

McQuirk gakwara n'ihu kwuo na iwu a akagburu pụtara na ndị omeiwu enwere ikike iji hiwe iwu ga-enye ohere ka a na-egbu ụmụaka n'ebe ha. "Anyi agaghị ikwe," o kwuru.