Trump akagbuola mkparịtaụka ya na Kim

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Trump na Kim kwesiri ịkparịta ụka n'abalị iri na otu ọnwa Juun na mba Singapore
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump akagbuola mkparịtaụka ya na ogbo ya nke Nọt Korịa bụ Kim Jong-un kwesiri inwe.

Trump kwuru na "ụwa atụfuola oke ohere iji mee udo ga-adị ogologo oge".

O kwuru na ihe mere o jiri mee mkpebi a bụ maka "oke iwe na iro pụtara ihe" nke dị n'oke mba Nọt Korịa.

N'akwụkwọ ozi o degara Kim, o kwuru na ọ na-atụ anya izute ya "otu ụbọchị".

Nke a bịara n'elekere ole na ole mba Nọt Korịa kwuchara na o kposasịala ọwara dị n'ọdọ nrụpụta ogbunigwe nuklịa.

Ndị ntaakụkọ mba ndị ọzọ kwuru na ha nụrụ ụda ogbunigwe na mpaghara Punggye-ri.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Akụkọ ndị ga-amasị gị: