Iwobi Nwafọ Naịjirịa abụrụla sinetọ mbụ na mba Itali
Ebe foto si, Toni Iwobi Facebook
Toni Iwobi bụ onye ma nke ekwe na-akụ n'ihe gbasara igwe technụzụ abụrụ sinetọ mbụ nItali bụ onyeisi ojii.
A họpụtara ya na ntuliaka e mere na obodo Breshia dị na mpaghara ugwu mba Itali.
N'okwu ya, "Ndị ọyị m, eji m ọṅụ agwa unu na ahọpụtala m dịka sinetọ na Ripọblik!
"Ọ karịala afọ iri abụọ na ise anyị na-alụ ọgụ a chọrọ ibido ihu ọhụrụ!"
O kelere ndị kwadoro ya inweta ọkwa ahụ.
Iwobi bụ onye otu pati Anti-Migrant League bụrụ onyendu akụkụ obodo ya n'afọ 1995.
Iwobi dị afọ 62 gara mba Itali ihe ruru afọ 40 gara aga dịka nwaakwụkwọ. Ọ lụrụ onye mba ahụ ma bido ụlọọrụ na-ahụ maka igwe mgbasaozi technụzụ.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:
Isi akụkọ
Kọwaara m isi akụkọ
Akụkọ akachasị gụọ
Content is not available
{{rankTranslation}}