Ndị uweojii anwụchiela mmadụ atọ maka mwakpo emere na Zamfara
Ebe foto si, AFP
Akụkọ na-apụta site Zamfara steeti na-ekwu na ndị uweojii nke Naịjria awuchiela mmadụ atọ echere na ha sonyere na mwakpo gburu ndị mmadu na Zamfara steeti.
Enyere aha ha ka: Halilu Garba nke a na-etu 'Mabushi', Zubairu Marafa nke eji 'Wakili' mala na Nafiu' Badamosi nke bụ 'Zakiru'.
Moshood Jimoh nke na-ekwuchitere ndị uweojii na Naịjirịa kwuru na ndị a na-enye ndị uweojii aka na nyocha ha na-eme.
Nke a pụtara ka onyeisi ndị uweojii zipụrụ ngalaba ọhụrụ atọ maka inyere aka kwado udo na nchekwa n'ime obodo Birane.
Ebe foto si, AFP
Ndị uweojii sị na ha ga-aga ụlọịkpe ma nyocha ha na-eme ugbua gwụcha.
Isi akụkọ
Kọwaara m isi akụkọ
Akụkọ akachasị gụọ
Content is not available
{{rankTranslation}}