Nigeria vs Algeria: Algeria efoola Super Eagles nku ka a na-efo ajị imi

Ebe foto si, Reuters

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ọljiria ga-ezute Sịnịgal n'agba ikpeazụ dịka Riyad Mahrez ji goolu zọpụta ndị otu ya.

Ebe Naịjirịa ga-ezute Tunishia ụbọchị 17 nke ọnwa Julaị, ebe ha ga-ama onye ga-agba onye nke atọ ma nweta ọlanchara.

Goolu Mahrez nyere si na 'free kick' ọ gbara dịka Wilfred Ndidi gbaturu Ismael Bennacer.

Ebe foto si, EPA

Nkọwa foto, Mahrez dọriri neetị na nkeji 90+4 tupu e gbuchie bọolụ ma mewaa ndị Naịjirịa obi.

Odion Ighalo ji penariti nye goolu ma napụta Naịjirịa n'aka ndị Ọljiria na nkeji 73, mana o zughi ịkpọba Naịjirịa n'agba ikpeazụ.

Goolu a bịara ka Aissa Mandi tinyere aka ya iji gbochie bọọlụ Oghenekaro Etebo gbara; e ji ihe nkiri Video Assistant Refree (VAR) nyochaa ya ma nye Naịjiria penariti ahụ.

Goolu a Ighalo nyere bụkwa naanị nke abụọ na-abanye n'ime poostu ndị Ọljiria kemgbe ha bịara asọmpi nke afọ a.

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Goolu a Ighalo nyere emeela ya goolu anọ ọ na-enye n'asọmpi a, ma mee ka ọ bụrụ onye kacha nye goolu ugbua.

Bọọlụ biri William Troost-Ekong n'ahụ ma banye na neetị na nkeji 40, iji mee ka Ọljiria jiri otu ọkpụ na-emeri Naịjiria.

Cheta na ọ bụ Troost-Ekong nyere goolu Naịjirịa ji nweta mmeri n'aka Saụt Afrịka ma banye agba ọkara-Ikpeazụ a.

Ebe foto si, AFP

Ụfọdụ ndị Naịjirịa na-ewe iwe na-ekwu na ọ bụ uwe ndị Super Eagles yi mere ha ji ghara ịgbata ọfụma n'egwuregwu a.

Ha gara na Twitter na-egosi iwe ha. Lee ihe ha kwuru:

@sp_okpara kwuru na uwe a anaghị eweta ihe ọma.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

@Quadriagboola gosikwara iwe ya.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

@ruudboie kpọkuru ndị na-eme uwe Naịjirịa sị ha gbanwee ya makana ọ na-ebute ọdachi.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Mana ajụjụ bụzị "ọ bụ Jersey na-agba"?

Lee ihe ndị mmadụ kwuru maka ya na Facebook anyị:

Ụfọdụ ndị ọzọ malitere ịchọ Vincent Enyeama chebuuru Naịjirịa goolu.

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

@akaninh kwukwara otu ihe ahụ.

Skip X post, 5
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 5

Kedụ etu obi dị gị ugbua?

Ebe foto si, AFP

Ndị Super Eagles ga-eji ihe niile ha nwere gbaa egwuregwu a, enweghi ihe ọzọ ga-ebute nke a, ọ bụrụ maka nkwa ndị ojiegoachụego kwere ha maka inye ha puku dọla iri ise maka goolu ọbụla ha ga-enye.

Skip X post, 6
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 6

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Amụbeghi Riyad Mahrez mgbe Ọljiria butere naanị otu Iko Mba Afrịka ha nwere; n'afọ 1990.