Casmir Chinedu Luke: Etu aka si kpara nwamadi a maka ebubo igwu gọọmentị Amerịka chadum ijeri dọla asaa

Ebe foto si, Getty Images
Ndị nnyocha gọọmentị etiti mba Amerịka anwụchiela otu nwafọ Naijiria aha ya bụ Casmir Chinedu Luke maka igwu ngalaba na-ahụ maka ndị agha lara ezumike nka chadum ego dị ijeri dọla asaa ($7m).
A nwụchiri Chinedu gbara afọ 66, bụ onye nwe ụlọọrụ na-elekwa ndị kara nka nakwa ndị ahụ adịghị n'ụlọ ha a kpọrọ 'Four Corner Health LLC' dị na Fresno dị na California, n'ọdọụgbọelu 'San Francisco International Airport' dika ọ na-achọ ibanye ụgbọelu na-abịa Naijiria.
Ngalaba na-ahụ maka ikpe nke mba Amerịka gbara ama na websait ha na Luke napụrụ ngalaba na-ahụ maka ndị agha lara ezumike nka (Department of Veterans Affairs-DA) ijeri dola asaa ahụ dịka ụgwọ maka ilekọta ndị kara nka ọbụladị izu kwulu izu ndị ahụ ụlọọrụ ya na-elekọta nwụchara.
E boro ebubo na Luke ji akara ụlọọrụ 'Four Corners' zigara ngalaba DA akwụkwọ ma nara ego n'aha mmadụ 10,000 maka ụgwọ nlekọta o nyere, ụfọdụ bụ ihe a gwụbuorola ya ụgwo, ụfodụ nke ụbọchị ndị ọrụ ya agaghị leta onye ha kwesịrị ileta nakwa nke ndị ọ sị na ụlọrụ ya lekọtara bụ ndị nwụọrọlarị.
Ọ bụrụ na a maa ya ikpe, Osuagwu ka anọ na ụlọmkpọrọ afọ 10 maọbụ a daa ya nha Puku nari abụọ na iri ise( $250,000).

Ebe foto si, Getty Images
Nke a abụghị mbụ bụ Maazị Luke bụ onye na-aza aha dị iche iche gụnyere Casmir Chinedu Osuagwu na-adabanye na mmiri ọkụ.
N'afọ 2010, a tụrụ ya mkpọrọ afọ atọ (ọnwa iri abụọ na asaa) maka igbalị ịkpụ akwụkwọ njirimara onye adịgboroja abụọ.
Otu bụ nke aha nwa ya nwoke gbalie ịkpụ akwụkwọ njirimara(passort) , nke ọzọ bụ aha nakwa akara onye ọ na-elekọta nwụrụ anwụ.




























