You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Charles Soludo: Ka o si gaa dịka e duru Soludo iyi ọrụ agba nke abụọ
Ubọchị taa ka a na-edu aka na-achi Anambara steeti bụ Charles Soludo n'iyi ọrụ nke ugboro abụọ n'emume a na-eme n'ogige 'Alex Ekwueme Square' dị n'Ọka, isiobodo steeti ahụ.
A họpụtara Soludo ọzọ maka oge nke abụọ na ntuliaka Gọvanọ nke e mere na abalị asatọ nke ọnwa Nọvemba afọ 2025.
Soludo, onye ji pati 'All Progressives Grand Alliance (APGA) nwetara vootu narị puku anọ na iri abụọ na abụọ, narị isii na iri isii na anọ ji merie Nicholas Ukachukwu, pati 'All Progressives Congress' (APC) wetara vootu Puku iri itoolu na itoolu, narị anọ na iri anọ na ise.
Ndị a na-atụ anya ga-abịa emume a gunyere: osote onyeisiala Kashim Shettima onye a na-atụ anya ga-anọchite Onyeisiala Bola Tinubu, ndị bụbu onyeisiala Olusegun Obasanjo na Goodluck Jonathan.
Emume a nwereike ịdọta ndị ama ama, gụnyere ndị okenye dịka onye bụbu odeakwụkwọ ukwu nke 'Commonwealth', Emeka Anyaoku, ndị eze ọdịnala sitere na obodo 179 dị na steeti ahụ, tinyere ndị eze si n'akụkụ obodo ndị ọzọ dị na Naịjirịa.
Cheta na esemokwu dapụtara n'etiti nwunye aka chịburu Anambara steeti bụ Ebele Obiano na nwunye Emeka Ọdumegwu Ojukwu bụ Bianca Ojukwu bụ ihe chakporo emume idu iyi ọrụ Soludo n'agba nke mbụ ya.