E nyela ụmụ Naịjirịa ndụmọdụ nchekwa maka ngagharịiwe banyere echichi "igwe Ndigbo" a na-eme na Saụt Afrịka

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ụlọọrụ nnọchịtaanya mba Naịjirịa dị na Pretoria ekesaala ozi ndụmọdụ nchekwa maka ọgbaaghara dapụtara na ngagharịiwe e mere na mpaghara Estern Cape dị na mba Saụt Afrịka.

Ụmụ amaala Saụt Afrịka na-eme ngagharịiwe megide echichi "Igwe ndị Igbo" e chiri na mpaghara ahụ.

Mana ndụmọdụ nchekwa ụlọọrụ nnọchịtaanya Naịjirịa bụ "High Commission of the Federal Republic of Nigeria" nyere ndị Naịjirịa bi na Saụt Afrịka gunyere:

  • Ka ha fie asaa n'anya maka nchekwa ha.
  • Ka ha kwụsịtụ ngagharị, beleta mkparịtaụka ha na ndị ha na-amaghị.
  • Nwetuo onwe ha ala mgbe niile
  • Kwụsị ọgbakọ maọbụ emmume ọdịnaala agbụrụ ha
  • Ekwula okwu na Soshal mịdịa maọbụ n'ụlọ ntaakụkọ ga-amụnye ọkụ n'ọgbaaghara dị ugbua.
  • Gwa ndị ọrụ nchekwa na ndị uweojii ma e nwe ndị nyiri gị egwu inwe ndụ gị.
  • Kwụsị igosi akụnụba.
  • E sokwala mee ngagharịiwe ọbụla, nke kwadoro ihe mere maọbụ nke na-akwadoghị ihe na-eme.

Mana onyeisi oche ụmụ Naịjirịa bi na mpaghara Gauteng bụ Olaniyi Abodedele gwara BBC Igbo n'ekwentị "a gbara ọtụtụ ụlọ ahịa ụmụ Naịjirịa ọkụ na mpaghara Eastern Cape Town.

O kwuru na a gbakwara ọtụtụ ụgbọala ọkụ, wakpo ma zuru ọtụtụ ihe n'ụlọ ahịa ụmụ Naịjirịa n'oge a na-eme ngaharịiwe ahụ.

Echichi 'Igwe Ndigbo' e chiri Solomon Ogbonna Eziko na Saụt Afrịka ebutela ngagharịiwe megide ndị mbịarambịa

Ọgbaghara na ngagharịiwe adapụtala na mpaghara East London dị na mba Saụt Afrịka megide echichi e chiri nwafọ Naịjirịa bụ Solomon Ogbonna Eziko dịka 'Igwe Ndigbo' na Saụt Afrịka.

Nke a na-abịa dịka ndị ndu ọdịnala na mba Saụt Afrịka were iwe ma katọọ echichi ahụ e chiri nwamadị a.

Ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia gosiri ka ọtụtụ ụmụafọ mba Saụt Afrịka na-eme ngagharịiwe na-awakpo ụfọdụ ụlọahịa ndị mbịarambịa na mba ha nwee.

Akụkụ kwuru na a gbaala ụgbọala ruru iri na atọ ọkụ, ọtụtụ ụlọahịa ndị mmadụ nakwa ihe ndị ọzọ ọkụ.

E chiri nwamadị a echichi ahụ na mpaghara KuGompo dị na mpaghara East Lọndọn mba Saụt Afrịka n'ụbọchị Satọde 14 Maachị 2026.

Ndị ndu ọdịnala mba ahụ a kpọrọ 'Eastern Cape House of Traditional and Khoi-San Leaders' kwuru na echichi ahụ megidere iwu na-achịkwa omenala ha.

"Agwa a bụ mkparị ma megide iwu na-achị mba Saụt Afrịka ma nwereike ọgbaghara n'etiti ndị ndu," ka ndị a kwuru ma sị na ọ bụ naanị ndị ndu ọdịnala ha nwere ikike ichi mmadụ echichi.

Ndị ndu a gara n'ihu kwuo na ụmụafọ Naịjirịa kpara agwa a ga-arịọ ha mgbaghara ma kposaa echichi ahụ e chiri nwamadị a.

Nkọwa otu Ohaneze Ndigbo na Saụt Afrịka yere

Ọhaneze Ndigbo bụ otu jikọtara ndị Igbo na mba Saụt Afrịka akọwaala ihe mere na East London, mba Saụt Afrịka ebe ọgbaaghara dapụtara ka e chichara echichi "Igwe Ndigbo" na mpaghara ahụ.

N'akwụkwọ ozi Odeakwụkwọ Ọhaneze Ndigbo bụ L.K Ashinze na Onyeisi ha bụ ABC Okokoh wepụtara ka ha kọwara ihe ha mere.

Ha kwuru na e nwere ihe dị iche n'echiche "ìgwè ndigbo' ahụ na-ese okwu na "echichi Igwe maọbụ "eze obodo".

N'okwu ha "echiche anyị chịrị abụghị eze obodo, kama ọ bụ onye nlekọta ndị Igbo bi na mpaghara ahụ na Saụt Afrịka.

"Enweghị oge anyị ji guzobe obodo, maọbụ wepụta ala ọbụla kpọọ ya nke anyị na mba Saụt Afrịka".

"Anyị bụ ndị ọbịa na Saụt Afrịka. Ala nna anyị bụ ala Igbo, na Naịjirịa".

"Ihe anyị mere bụ ịhọpụta onye ndu anyị ga-ahazi ma jikọta anyị ọnụ na na-ahụ maka ọdịnaala nakwa njirimara ndị Igbo".