Kwankwaso ga-abanye ADC n'ụbọchị Mọnde, dịka anyị ga-akwado ha na ntuliaka onyeisiala - NNPP

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Otu ndọrọndọrọ ọchịchị New Nigeria Peoples Party (NNPP) ekwuola na ha ga-agbakọrọ pati African Democratic Congress (ADC) aka n'oge ntuliaka onyeisiala.

Odeakwụkwọ mgbasaozi pati NNPP bụ Ladipo Johnson kpughere nke a n'ụbọchị Mọnde 30 Maachị 2025 oge ya na ndị ntaakụkọ nwere mkparịtaụka n'ụlọmgbasaozi Channels TV.

Ladipo kwuru na ndị NNPP ga-esonye na ntuliaka a ga-ahazi n'afọ 2027 n'agbanyeghị ọpụpụ onye jiri ọkọlọtọ ha zọọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2023 bụ Rabiu Kwankwaso.

Dịka o siri kwuo, NNPP ga-aga n'ihu zọọ ọkwa ndị ọzọ, mana ha ga-agbakọọrọ ADC aka na ntuliaka onyeisiala.

Ọnụ na-ekwuru NNPP sịrị na ha na ndị ndu pati na-agba gọọmenti ụkwụ nwere mkparịtaụka ọtụtụ oge tupu Kwankwaso ekpebie ịbanye ADC.

Ladipo mere ka o doo anya na ndị ndu pati ndị na-agba gọọmenti ụkwụ na-arụkọ ọrụ maka ọdịmma ndị Naịjirịa, ma kwuo na Kwankwaso ga-edebanye aha na pati ADC n'ụbọchị Mọnde 30 Maachị 2023.

Gịnị mere Kwankwaso jiri chọọ ịhapụ NNPP banye ADC?

Atụmatụ Rabiu Kwankwaso ịhapụ NNPP banye ADC bụ nke sochiri mkpọtụrụ kpụ ọkụ n'ọnụ n'etiti onye ahụ bụbu gọvanọ Kano Steeti, ndị ndu otu Kwankwasiyya Movement nakwa ndị a ma ama na pati ADC.

N'ime izuụka ole na ole ugbua, onye ahụ na-achọ ịzọ ọkwa onyeisiala na ndị isi kara aka enweela ọtụtụ nzukọ, nke gụnyere ndị ọnụ na-eru n'okwu na pati ndị na-agba gọọmenti ụkwụ.

Nke a bụ otu akụkụ mbọ ọ na-agba ịkwalite mbịakọ otu ndọrọndọrọ ọchịchị dị iche iche, nke nwereike ịma aka megide pati na-achị achị bụ All Progressives Congress (APC).

N'izuụka gara aga ka Kwankwaso zutere ndị ndu pati nakwa ndị ọnụ na-eru n'okwu na Kano Steeti, iji dọta nkwado maka atụmatụ o nwere ịgbanwe pati.

Ya na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị a ma ama nwere mkparịtaụka, nke gụnyere Nnukwu Odeakwụkwọ ADC bụ Rauf Aregbesola; onye jiri aha Labour Party zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023 bụ Peter Obi; aka na-achị Ọyọ Steeti bụ Seyi Makinde nakwa sịnetọ na-anọchiteanya Bayelsa West bụ Seriake Dickson.

Ọnọdụ a na-abịa dịka e nwere esemokwu ọjọọ n'etiti Kwankwaso na Abba Yusuf bụ "nwa ndọrọndọro ọchịchi ya" ma bụrụkwa aka na-achị Kano Steeti, maka ịhapụ NNPP banye APC.