Mr Ibu: Ihe nwa ya kwuru maka ‘ọrịa ọjọọ' ọ na-arịa ugbua
Ebe foto si, Chioma Jasmine Okafor
Chioma Jasmine Okafor bụ nwa onye na-eme ihe nkiri bụ John Okafor e ji Mr Ibu maara akọwaala ọnọdụ ahụike nna ya.
O kwuru nke a mgbe BBC Igbo kpọtụụrụ ya ịjụ ya banyere ahụike nna nke Mr Ibu ji aka ya kwupụta na soshal midia.
Jasmine kwuru na ọ bụ eziokwu na nna ya nọ n’ute ọrịa n’ụlọọgwụ ugbua mana na ọ gaghị ekwunwu etu ọ dị ya ugbua maka na ọ nọghị nna ya nso.
“A mabeghi kpọmkwem ihe na-arịa nna m, ka na-eme nyocha ịchọpụta, tinyekwara na anọghị m ya nso ugbua.”
Jasmine kwuru ka anyị kpọghachị ya echi mgbe mpụtara nyocha ahụ ya ga-apụta.
Cheta na Mr. Ibu bụ onye gbara afọ iri isii na abụọ n’ụbọchị Tuzde nọ n’ụlọọgwụ mee ncheta ụbọchị ọmụmụ ya.
Mana ụbọchị Tuzde ka ihe onyonyo na-efegharị na sohal midia ebe o di na n’ute ọrịa na-arịọ ka ndị mmadụ kpeere ya ekpere mgbake.
Ibu kwuru na ọ nọ n’ụlọogwụ n’ihi ‘ọrịa ọjọọ a na-amabeghi ihe ọ bụ’.
Ọnọdụ ahụike Mr Ibu adịghị mma n’ime ihe onyonyo ahụ.
Onye bu Mr ibu?
Ezi aha ya bụ John Ikechukwu Okafor mana e ji 'Mr Ibu' bụ agwa o mere n'ihe onyonyo wuru ewu n'afọ 2004 a kpọrọ 'Mr Ibu' were mara ya.
Onye Eziokwu dị n'Okpuru Ọchịchị Nkanu-West n'Enugwu steeti, John Okafor bụ ọkpachi e ji ime iberibe mara.
Ejije o sonyerela gụnyere 'Hotel De Jordan', 'Agony', 'Rolling Stone', 'FourFourty' dgz.
Okafor bụkwa onye ọtụtụ ụlọ ahịa dịka Glo,Gotv jirila ihu ya ree ahịa
Okafor lụrụ nwaanyị ma jidekwa ụmụ
Isi akụkọ
Kọwaara m isi akụkọ
Akụkọ akachasị gụọ
Content is not available