Ihe Obi Cubana kwuru maka ọchịchị Onyeisiala Tinubu

Aha onyonyo, Ihe Obi Cubana kwuru maka ọchịchị Onyeisiala Tinubu
Ihe Obi Cubana kwuru maka ọchịchị Onyeisiala Tinubu
    • Onye dere ya, Chinonso Ugorji
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
    • Onye dere ya, Donald Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist

Obinna Iyiegbu a maara nke ọma dịka Obi Cubana ekwuola okwu gbasara ọchịchị Onyeisiala Tinubu.

Obi Cubana mere ka a mata nke a na mkparịtaụka pụrụiche ya na BBC News Igbo nwere.

N'okwu ya, Maazị Iyiegbu kwuru na kemgbe a mụrụ ya ihe karịrị afọ iri ise gara aga, na o nwebeghị onye nọ n'ọchịchị, a na-asị na ọchịchị ya kachasị mma.

"Ihe mere bụ na adị m afọ 50 n'afọ a bụ 2026. Gị lee anya, o nwebeghị ọchịchị batara, ndị mmadụ kụrụ aka na ọ mara mma".

"Oge ndịagha na-achị anyị, anọ m n'ụlọakwụkwọ, anyị na-eti na anyị chọrọ ọchịchị onye kwuo uche ya. E mechara nye anyị ya n'afọ 1999, Obasanjo abanye dịka Onyeisiala, anyị etie na ọ na-emegbu anyị. Oge o nyefere Yar'Adua, anyị tikwara mkpu na ihe akala njọ. E nye ya Jonathan, anyị etie na ihe emeela anyị. E nye Buhari, agaghị m ekwu okwu na nke ahụ. E nyezie ya Tinubu. Ọ bụ etu ọ dị na mbaụwa niile".

Ọ sịrị na mgbe e ji amata ihe mmadụ mere n'ọchịchị bụ ma onye ahụ pụọ, ma kwuo na ndị ji ego achụ nta ego dịka ya onwe ya onwe ya ga-akọwa na ihe dị mma ugbua karịa oge gara aga.

"Gị hụ onye ji ego achụ ego jụọ ya, taa ka ụnyaahụ mma, ebe echi ga-akakwa taa mma. Ọ bụ ihe m na-ekwu," ka Obi Cubana kwuru.