Ahụ Ezenwaanyị Elizabeth esila Balmoral rute Edinburgh

Ebe foto si, PA Media

Ụgbọala bu ahụ Ezenwaanyị Elizabet nke atọ erutela ugbua n'Edinburgh.

Ahụ Ezenwaanyị hapụrụ Balmoral n'ụtụtụ ụbọchị Sọnde wee malite njem awaa isii iji rute Edinburgh.

Ọtụtụ mmadụ kwụ n'ahịrị n'okporoụzọ niile ebe ụgbọala ahụ bu ahụ Ezenwaanyị si gbafee.

Oge ọ na-erute n'Edinburgh, ndị mmadụ jupụtakwara n'uju iji kwanyere ya ugwu ikpeazụ.

Ọtụtụ n'ime ha na-akụ aka, ndị ọzọ na-atụpụrụ ya okoko flawa dị ọ na-agafe.

Aha onyonyo, Oge ikpeazụ Ezenwaanyị na-ahapụ Balmoral

Ahụ Ezenwaanyị ga-anọ n'obi eze a kpọrọ 'Palace of Holyroodhouse' ogologo abalị niile.

Ụmụ Ezenwaanyị, Adeze Anne, Ọkparaeze Andrew na Ọkparaeze Edward erutekwala n'Edinburgh, mana Eze Charles III ga-abịarute ebe ahụ echi bụ Mọnde.

N'ehihie ụbọchị Sọnde, Eze na onyeisi otu Commonwealth bụ Patricia Scotland nwere obere ọgbakọ n'obieze Buckingham.

Lee foto etu ndị mmadụ si akwanyere Ezenwaanyị Elizabet ugwu ikpeazụ

Nkọwa foto, Oge e buuru ahụ Ezenwaanyị na-ebuba ya na 'Holyroodhouse'

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị mmadụ tụkọtajuru ọtụtụ okoko flawa iji gosi ịhụnanya ha n'ebe Ezenwaanyị nọ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụgbọala bu ahụ Ezenwaanyị dịka ọ na-ahapụ Balmoral

Ebe foto si, Jonathan Brady/PA Wire

Nkọwa foto, Eserese na-egosi Ezenwaanyị Elizabeth dị n'etiti okoko flawa ndị mmadụ tụkọtara